Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ụgha nke 3: Ndị Ọma Niile Ga-aga Eluigwe

Echiche Ụgha nke 3: Ndị Ọma Niile Ga-aga Eluigwe

Echiche Ụgha nke 3: Ndị Ọma Niile Ga-aga Eluigwe

Olee ebe echiche ụgha a si? Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ná mbido narị afọ nke abụọ Oge Anyị, Ndị Nna Chọọchị oge gboo ghọrọ ndị a ma ama. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia (2003), Nke 6, peeji nke 687, kwuru banyere ozizi ha, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ime ha kụziri na ozugbo e mechara ka mkpụrụ obi onye nwụrụ anwụ dị ọcha otú o kwesịrị, a na-enye ya ohere ịga kporie ndụ n’eluigwe.”

Gịnị ka Baịbụl kwuru? “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.”Matiu 5:5.

Ọ bụ ezie na Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ya ‘ga-akwadebere ha ebe’ n’eluigwe, Jizọs gosiri na ọ bụghị ndị ezi omume niile ga-aga ebe ahụ. (Jọn 3:13; 14:2, 3) Ọ̀ bụ na o kpeghị ekpere ka uche Chineke “meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe”? (Matiu 6:9, 10) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere olileanya abụọ onye ezi omume ọ bụla ga-enwe otu n’ime ha. Ole na ole n’ime ha ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 5:10.

Ka oge na-aga, chọọchị oge gboo gbanwere otú o si ele ihe bụ́ ọrụ ya n’ụwa anya. Gịnị si na ya pụta? Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Chọọchị ji nwayọọ nwayọọ nọchie anya Alaeze Chineke ahụ a na-atụ anya ya.” Chọọchị malitere inwetakwu ikike site n’itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, leghara ihe doro anya Jizọs kwuru anya, nke bụ́ na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19; 17:14-16; 18:36) Eze Ukwu Constantine nke Rom mere ka chọọchị gbanwee ụfọdụ n’ime ihe ha kweere, nke otu n’ime ha bụ banyere onye Chineke bụ.

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Jọn 17:3; 2 Timoti 2:11, 12

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Ihe ka ọtụtụ ná ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi—ọ bụghị n’eluigwe

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 6]

Art Resource, NY