Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu

Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu

Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu

Olee ebe echiche ụgha a si? “A malitere inye nne nke Chukwu oké nsọpụrụ mgbe . . . ndị ọgọ mmụọ nubatara na chọọchị. . . . Ime nsọ nsọ ha na otú ha si ele okpukpere chi anya [ya bụ, ndị ọgọ mmụọ ghọrọ Ndị Kraịst] malitere kemgbe ọtụtụ puku afọ site n’ofufe chi nwaanyị a na-akpọ ‘nne ukwu’ na ‘chi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.’”—The New Encyclopædia Britannica (1988), Nke 16, peeji nke 326 na 327.

Gịnị ka Baịbụl kwuru? ‘Ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, onye aha ị ga-agụ ya bụ Jisọs. Nwa nwoke a ga-abụ onye ukwu, onye a ga-akpọkwa Ọkpara Chineke kachasị elu. Mgbe ahụ, nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.’Luk 1:31-35, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe ndị e kwuru n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ahụ gosiri nke ọma na Meri bụ nne “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị nne Chineke n’onwe ya. Meri ọ̀ ga-ebulinụ Onye ahụ ‘eluigwe nke eluigwe na-apụghị ịba’ n’afọ ya? (1 Ndị Eze 8:27) O nwetụghị mgbe o kwuru ụdị ihe ahụ. Ọ bụ ozizi Atọ n’Ime Otu kpatara nghọtahie e nwere banyere onye Meri bụ. Ọkpụkpọ Nzukọ Efesọs, nke e nwere n’afọ 431 Oge Anyị, kpọrọ Meri Theotokos (okwu Grik pụtara “onye mụrụ Chukwu”), ma ọ bụ “Nne nke Chukwu,” mere ka a malite ife Meri ofufe. Obodo Efesọs bụ́ ebe ndị chọọchị nọ nwee nzukọ ahụ bụ obodo e ji ife arụsị mara kemgbe ọtụtụ narị afọ, bụ́ ebe a na-efe chi nwaanyị ọmụmụ bụ́ Atemis.

Ọ bụ ya mere e ji webata ọtụtụ ihe a na-eme n’ofufe ihe oyiyi Atemis nke “si n’eluigwe daa,” dị ka ịga n’ahịrị, n’ofufe a na-efe Meri. (Ọrụ 19:35) Ihe ọzọ e ji nwayọọ nwayọọ webata n’ozizi Ndị Kraịst bụ iji ihe oyiyi Meri na ndị ọzọ efe ofufe.

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Matiu 13:53-56; Mak 3:31-35; Luk 11:27, 28

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Meri bụ nne Ọkpara Chineke, ọ bụghị nne Chineke n’onwe ya. Atọ n’Ime Otu bụ echiche ụgha nke mere ka e fewe Meri ofufe dị ka Nne nke Chukwu