“Ruo Ole Mgbe Ka M Ga Na-eti Mkpu Enyemaka?”
“Ruo Ole Mgbe Ka M Ga Na-eti Mkpu Enyemaka?”
Jayne kwara ákwá, sị: “Ihe m chọrọ nnọọ bụ ka ihe mgbu a kwụsị!” Ọ na-arịa ọrịa kansa, ọrịa ahụ na-agbasakwa n’ahụ́ ya. Ọ dị nnọọ ndị ikwu na ibe ya ka ha wepụ ọrịa ahụ na ihe mgbu ọ na-enwe! Ha kpekuru Chineke ekpere ka o nyere ya aka. Ọ̀ ga-anụ ekpere ha? Ọnọdụ ahụ ò metụrụ ya n’obi?
CHINEKE maara ọnọdụ ụmụ mmadụ nọ n’ime ya. Okwu ya, bụ́ Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Chineke maara na e nwere ọtụtụ narị nde mmadụ na-enwe ihe mgbu kwa ụbọchị ka Jayne, ma nke anụ ahụ́ ma nke uche. Chineke na-ahụ narị nde mmadụ asatọ na-alaba agụụ kwa abalị, ọtụtụ nde ndị ọzọ a na-emeso ihe ike n’ezinụlọ ha, na ọtụtụ ndị nne na nna na-atụ ụjọ banyere ọdịnihu nke ụmụ ha nakwa ọdịmma ha. Ì chetụla ma Chineke ọ̀ ga-eme ihe banyere ọnọdụ ndị a? N’ezie, ebe ọ bụ na anyị na-achọ inyere ndị anyị hụrụ n’anya aka, Chineke ọ́ gaghị achọ inyere ụmụ mmadụ aka, bụ́ ndị o kere eke?
Ọ bụrụ na ị jụọla ajụjụ ndị ahụ, ọ bụghị naanị gị na-ajụ ha. Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị isii gara aga, ọ dị otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Habakọk, otú ọ dị ọtụtụ ndị taa, ya ajụọkwa Chineke, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka, ma ị dịghị anụ ya? Ruo ole mgbe ka m ga na-akpọku gị ka i nyere m aka napụta m n’ihe ike, ma ị dịghị azọpụta m? Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya? Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m, gịnị mere esemokwu ji na-adị, gịnịkwa mere e ji na-alụ ọgụ?” (Habakọk 1:2, 3) Habakọk, bụ́ onye amụma Hibru, hụrụ ime ihe ike na mmegbu na-enweghị isi na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’oge ya. Taa, a na-anụ ụdị ihe ndị ahụ kwa ụbọchị, ọ na-awụkwa ndị nwere obi ọmịiko akpata oyi n’ahụ́.
Chineke ò leghaara ihe ahụ na-enye Habakọk nsogbu n’obi anya? Mba. O gere ntị n’ajụjụ ndị ahụ Habakọk ji ezi obi jụọ, kasie ya obi ma gbaa nwoke a obi na-erughị ala ume. Jehova Chineke mere ka okwukwe Habakọk sie ike site n’ikwe ya nkwa na Ya ga-akwụsị ahụhụ. Okwu na-enye olileanya Chineke gwara Habakọk nwekwara ike ịgba gị ume, dị ka ọ gbara Jayne na ndị ezinụlọ ya. Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a: Olee otú anyị nwere ike isi jide n’aka na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi n’ezie? Olee ihe Chineke ga-eme iji kwụsị ahụhụ, oleekwa mgbe ọ ga-eme ya?