Ebe Ha Biri
Otú Ndụ Dị n’Oge Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ
Ebe Ha Biri
‘Alaghị m azụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’—ỌRỤ 20:20.
KA E were ya na ị na-abanye n’otu n’ime obodo ndị e nwere na narị afọ mbụ, ị ga-esi n’otu nnukwu ọnụ ụzọ ámá gafere. Dị ka ọtụtụ obodo, ọ dị n’elu ugwu. I lelie anya elu, ị ga-ahụ ebe mgbago nke obodo ahụ. Ọtụtụ nnukwu ụlọ ndị oké ozu bụ́ ndị e tere agba ọcha na-egbukepụ ka anwụ na-acha, ọtụtụ n’ime ha nwekwara ubi ndị a gbara ogige. Ebe a bụ ebe ndị oké ozu bi. Ka ị na-aga n’ebe mgbada obodo ahụ, ị ga-ahụ ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ, ma ndị ukwu ma ndị nta, bụ́ ndị a rụrụ n’ụdị dị iche iche. Nnukwu ụlọ elu ndị a e ji nkume rụọ, bụ́ ebe ndị ahịa na-abachaghị ọgaranya na ndị nwe ala bi, kwụ n’ahịrị n’akụkụ abụọ nke okporo ámá e tere ete. Ka ị na-agbadakwu, ị ga-ahụzi ebe ndị ka daa ogbenye bi. Ụlọ ndị dị ebe a amaghị mma, ha pechakwara mpe, dịchaa ka mkpọ mkpaọkụ ma kwụrụ n’ahịrị n’okporo ámá ndị dị warara ma ọ bụ gbaa obere ime èzí dị iche iche gburugburu.
Ka ị na-aga n’okporo ámá ndị ụlọ juru, ụda na ísì ndị ị na-anụ na-atọ gị ụtọ. Ndị inyom na-esi nri, bụ́ nke mere ka ísì ụtọ jupụta ebe niile. Ị na-anụ ubé ụmụ anụmanụ na ụzụ ụmụaka na-egwuri egwu. Ndị nwoke na-arụsi ọrụ ike n’ụlọ ọrụ ndị na-esi ísì, bụ́ ndị ụzụ jukwara na ha.
Ọ bụ n’ụlọ ndị a ka ezinụlọ Ndị Kraịst na-ebi ndụ ha kwa ụbọchị. Ọ bụ n’ebe ndị dị otú a ka Ndị Kraịst na-eme ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị, na-amụ Okwu Chineke ma na-efe ofufe.
Ụlọ Ndị Ka Obere Dị ka ụlọ ndị e nwere taa, ụlọ ndị mmadụ n’oge ahụ na-adị iche iche dabere n’ebe e wuru ha na n’ego ole ezinụlọ nwere. Ụlọ ndị kacha obere (1) na-enwe naanị otu ọnụ ụlọ pere mpe ma gbaa ọchịchịrị, bụ́ ebe ndị niile nọ n’ezinụlọ na-ebi. Ihe e ji wuo ọtụtụ obere ụlọ bụ brik ụrọ ndị a gbara n’anwụ. Ndị ọzọ bụ ndị e ji nkume a wara awa ndị a na-akpụchaghị akpụcha rụọ ahụ́ ájá ha. A na-ewukwasị ụdị ụlọ abụọ ahụ n’elu ntọala okwute.
A na-ete ime ha na ala ha ete, bụ́ nke na-eme ka ọ dị mkpa itegharị ha etegharị site n’oge ruo n’oge. Ọ dịkarịa ala, a na-enwe otu oghere n’uko ụlọ ahụ ma ọ bụ n’ahụ́ ya, bụ́ ebe anwụrụ ọkụ si n’usekwu na-esi apụ. Naanị ihe ndị a na-eji achọ ụlọ ahụ mma bụ ihe ndị dị mkpa e ji ebi n’ụlọ.
A na-egwunye osisi ndị ga-ejide ụlọ ahụ, tụbichie ya osisi n’elu, tụọ ya ahịhịa amị ma tụzie ya ájá ụrọ n’elu. A na-etezi ájá ụrọ ahụ ete, bụ́ nke na-eme ka ụlọ ahụ ghara ihicha mmiri. A na-esikarị n’ubube dị n’èzí arịgo n’uko ụlọ ahụ.
Ọbụna n’ebe ndị ahụ a na-ewukọta ụlọ ọnụ, ụlọ Ndị Kraịst bụ ebe na-enye obi ụtọ, bụ́ ebe ezinụlọ dara ogbenye nwedịrị ike ịnọ baa ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ ma nwee obi ụtọ.
Ndị Na-abachaghị Ọgaranya Ụlọ elu ndị ahụ ka ukwuu e ji nkume wuo (2) bụ́ ebe ndị na-abachaghị ọgaranya bi na-enwe ọnụ ụlọ ndị ọbịa. (Mak 14:13-16; Ọrụ 1:13, 14) E nwere ike ịnọ ná nnukwu ọnụ ụlọ a dị n’elu nwee nzukọ, a na-anọkarịkwa na ya eme ememme. (Ọrụ 2:1-4) A na-eji blọk ụrọ laịm ewu ụlọ ndị a na ọbụna ụlọ ndị nke ka ha ukwuu, (3) bụ́ nke ndị ahịa na ndị nwe ala ma jiri ụrọ laịm jikọta blọk ha. A na-ete ala ha ndị a wụrụ okwute na ime ha ete; a na-eji ágbá ete mpụta ha.
A na-esi na steepụ arịgo n’ọnụ ụlọ ndị ahụ dị n’elu nakwa n’uko ha. A na-arụnye ihe nrụbichi gburugburu elu ụlọ ahụ dị larịị iji gbochie mmadụ isi n’elu ha adapụ ma ọ bụ ihe ọghọm ndị ọzọ. (Diuterọnọmi 22:8) Mgbe okpomọkụ na-eme n’ehihie, ọ na-akụ ahụ́ jụụ ịnọ n’ụlọ ndò ndị a rụrụ n’elu uko ụlọ ndị ahụ mụọ ihe, tụgharịa uche, kpee ekpere, ma ọ bụ zuru ike.—Ọrụ 10:9.
Ọ bụ ezie na a na-akpọbatakarị ndị ikwu iso biri n’ụlọ ndị a siri ike ma nwee ọnụ ụlọ ndị buru ibu, ụdị ụlọ ahụ na-eme ka e nwekwuo ebe ndị mmadụ nwere ike ibi, ka onye nke ọ bụla nwee ọnụ ụlọ ihi ụra nke ya, na-emekwa ka ndị bi na ya nwee usekwu na ebe iri nri ka buo ibu.
Ụlọ Ndị Oké Ozu Ụlọ ndị a rụrụ ka ụlọ ndị Rom (4) na-adịgasị nnọọ iche n’ibu ibu, n’otú ha na-adị n’anya, nakwa n’otú e si arụ ha. Nnukwu ọnụ ụlọ dị iche iche na-adị gburugburu ebe iri nri buru ibu, bụ́ ebe ezinụlọ na-anọkarị. Ụfọdụ n’ụlọ ndị a na-abụ ụlọ elu dị otu okpukpu ma ọ bụ dị okpukpu abụọ (5) ma ọ bụ nwee ubi ndị a gbara ogige.
Ụlọ ndị nke ka maa mma nwere ike inwe arịa ụlọ ndị buru ibu, bụ́ ndị e ji ọdụ́ ma ọ bụ ọlaedo chọọ mma. Ụlọ ndị a nwere ihe ndị e ji enyere Ọrụ 20:9, 10.
ndụ aka dị ka mmiri pọmpụ na ọkwa ịsa ahụ́. O nwere ike ịbụ na a na-eji osisi ma ọ bụ nkume mabụl ndị tụrụ àgwà dị iche iche eme ala ha, o nwekwara ike ịbụ na a na-eji osisi sida akụchi ahụ́ ụlọ ndị ahụ. A na-enwe ite ọkụ n’ụlọ ndị ahụ iji na-ekpo ha ọkụ. A na-enwe mpio, nke a na-ejikarị osisi eme nakwa windo, iji hụ na onye a na-achọghị abataghị n’ụlọ, ákwà mgbochi na-emekwa ka a ghara ịhụcha ihe onye nọ n’ime ụlọ na-eme. A na-awa oghere n’ahụ́ ájá iji nwee ebe windo ga-adị.—N’agbanyeghị otú ụlọ Ndị Kraịst oge gboo dị na otú ha hà, Ndị Kraịst ahụ na-ele ọbịa ma na-emesapụ aka. N’ihi ya, o sighịrị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ike ịchọta ezinụlọ nwere obi ụtọ, na-emesapụ aka ha ga-anọ na nke ha ruo mgbe ha jechara ozi ha n’obodo.—Matiu 10:11; Ọrụ 16:14, 15.
‘Ụlọ Saịmọn na Andru’ A nabatara nnọọ Jizọs nke ọma “n’ụlọ Saịmọn na Andru.” (Mak 1:29-31) Ụlọ ndị ọkụ azụ̀ a nwere ike iso n’ụlọ ndị na-amachaghị mma e wukọtara ọnụ (6) bụ́ ndị gbara otu ime èzí a wụrụ ala ya awụ gburugburu.
N’ụlọ ndị dị otú ahụ, ọnụ ụzọ na windo na-eche ihu n’ime èzí, bụ́ ebe a na-anọkarị eme ọtụtụ ihe n’ụbọchị, dị ka isi nri, ime achịcha, igwe mkpụrụ ákụ́kụ́, mmadụ na ndị ọzọ ịnọkọ na iri nri.
Ihe e ji rụọ ụlọ ala ndị dị na Kapaniọm bụ okwute ndị a na-ejighị aka waa. A na-esi na steepụ dị n’ime ụlọ ndị ahụ arịgo n’uko ha ndị dị larịị, ndị bụ́ ájá ụrọ ma ọ bụ mbadamba okwute a tụrụ n’elu osisi na ahịhịa amị e ji osisi jide. (Mak 2:1-5) A na-awụ ala ime ụlọ ndị ahụ awụ, ọtụtụ mgbe tọọkwa ha ute n’elu.
E nwere ọgbara ụlọ dị iche iche n’okporo ámá dị iche iche dị n’akụkụ Oké Osimiri Galili. Kapaniọm bụ nnọọ ebe na-adịrị ndị ọkụ azụ̀ mma ibi, bụ́ ndị na-esi n’oké osimiri enweta ihe ha na-eri.
“Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ” Isi ihe anyị na-ekwu bụ na ụlọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ dịgasị nnọọ iche—ma ndị bụ́ otu ọnụ ụlọ e ji brik ụrọ wuo ma ndị bụ́ nnukwu ụlọ ndị oké ozu e ji okwute wuo ma ụdị ụlọ ndị ọzọ.
Ụlọ ndị ahụ abụghị naanị ebe ezinụlọ na-ehi ụra. Ha bụ ebe ndị a na-anọ amụ banyere Chineke. Ezinụlọ Ndị Kraịst na-anọ na ha efekọ Chineke ọnụ. Ha na-ezukọ n’ụlọ ndị mmadụ iji mụọ Akwụkwọ Nsọ na iji soro ụmụnna ha nọkọọ. Ha na-eji ihe ndị ha mụtara n’ụlọ ha arụ ọrụ dị ezigbo mkpa ha na-arụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma na izi ihe “site n’ụlọ ruo n’ụlọ” n’ebe niile ndị Rom na-achị.—Ọrụ 20:20.