Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Inyere Ndị Dị Ndụ Aka?

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Inyere Ndị Dị Ndụ Aka?

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Inyere Ndị Dị Ndụ Aka?

TAMBA, bụ́ nwa okorobịa bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, na-achọ ile ule n’ụlọ akwụkwọ. * Nne ya gwasiri ya ike na ọ dị ya mkpa inweta enyemaka nke ndị ikwu ha nwụrụ anwụ iji mee nke ọma. Na Palemo, Sisili, ndị njem na-aga elere ebe olili ozu dị n’okpuru ala, bụ́ ebe a na-egosi ha ọtụtụ narị ozu ndị a kpachapụrụ anya chekwaa. Ụfọdụ ndị chere na ozu ndị a e chekwara echekwa na-echebe ndị dị ndụ. Kwa afọ, ndị mmadụ na-aga Lili Del, bụ́ obodo dị n’ebe ọdịda anyanwụ Nuu Yọk Steeti, U.S.A., bụ́ ebe e ji ọtụtụ ndị dibịa afa bi na ya mara. Ndị na-aga ebe ahụ na-ebu n’obi ịkpọtụrụ ndị ikwu na ibe ha nwụrụ anwụ maka enyemaka.

Gbaa gburugburu ụwa, ndị mmadụ ka kweere na ndị nwụrụ anwụ nwere ike inyere ndị dị ndụ aka. Olee ihe i chere? Ikekwe, a kụzierela gị ụdị ihe ahụ ma ọ bụ ya abụrụ na ụfọdụ ndị enyi gị kwenyesiri ike n’ụdị ozizi ahụ. Ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịchọ ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ndị dibịa afa na-ekwe nkwa na ha ga-eme ka anyị hụ ha. Magazin bụ́ Time kwuru na otu dibịa afa kwuru na ndị nọ n’ógbè ndị mmụọ “nwere nnọọ ike inyere mmadụ aka mgbe ọ bụla ma onye ahụ kpọtụrụ ha.” Ọ̀ bụ eziokwu? Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike inyere ndị dị ndụ aka n’ezie? Ihe doro anya Baịbụl zara nwere ike iju gị anya.

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Dị Ndụ n’Ebe Ọzọ?

Baịbụl kọwara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ otú ọ ga-edo ewu na ọkụkọ anya. Legodị ihe Ekliziastis 9:5 kwuru: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike ịhụ ndị dị ndụ n’anya? Amaokwu nke 6 zara, sị: “Ịhụnanya ha na ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi, ọ dịkwaghị òkè ha nwere ruo mgbe ebighị ebi n’ihe ọ bụla a ga-eme n’okpuru anyanwụ.” Ị ga-ahụkwa na amaokwu nke 10 kwuru na “ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.” Okwu Hibru bụ́ “Shiol” e dere ebe a pụtara “ili nke ihe niile bụ́ mmadụ.” Obi ga-adịkwa gị ụtọ ịmata na Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ebe Jizọs Kraịst gara mgbe ọ nwụrụ “Hedis,” nke bụ́ okwu Grik ya na Shiol bụ otu ihe.—Ọrụ 2:31.

Jizọs nyeere ọtụtụ ndị aka mgbe ọ dị ndụ, ma ọ maara na ya aghaghị ịnwụ. Ọ̀ tụrụ anya na ya ka ga-enwe ike inyere ndị mmadụ aka mgbe ọ nọ n’ili? Ee e. O ji ọnwụ ya na-eru nso tụnyere abalị mgbe mmadụ na-enweghị ike ịrụ ọrụ. (Jọn 9:4) Jizọs maara nke ọma na mgbe ụmụ mmadụ nwụrụ, ha na-aghọ “ndị na-adịghị ndụ.”—Aịzaya 26:14.

Jizọs mekwara ihe atụ yiri nke ahụ banyere ọnwụ. Mgbe enyi ya Lazarọs nwụrụ, Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra. (Jọn 11:11-13) Anyị anaghị atụ anya na onye nọ n’ụra ga-enyere anyị aka, ka ànyị na-atụ? Onye nọ n’ụra amaghị ihe na-emenụ, ọ gaghị enyeliri onye ọ bụla aka.

Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịrị Ndụ Gawa Mgbe Mmadụ Nwụrụ?

A kụzierela ọtụtụ ndị na mkpụrụ obi bụ ihe dị inyoghị inyoghị na-adịrị ndụ gawa mgbe mmadụ nwụchara. Ihe Baịbụl na-akụzi dị iche na nke ahụ. Akwụkwọ mbụ nke Baịbụl, bụ́ Jenesis, kọwaara anyị mkpụrụ obi. Jenesis 2:7 kwuru na mgbe e kere mmadụ mbụ, ọ ‘ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ Mmadụ, site n’isi ya ruo n’ụkwụ ya, bụ mkpụrụ obi; ụmụ anụmanụ bụkwa mkpụrụ obi. (Jenesis 1:20-25) N’ihi ya, anyị nwere nnọọ ike ikwu na mgbe mmadụ ma ọ bụ anụmanụ nwụrụ, mkpụrụ obi anwụọla. Baịbụl kwadoro nke a.—Ezikiel 18:4.

Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, ‘Oleekwanụ banyere ọtụtụ akụkọ a kọrọla banyere ndị kpọtụụrụ ndị nwụrụ anwụ, nụ olu ha, ma ọ bụdị hụ ha anya?’ A na-anụ ọtụtụ akụkọ dị otú ahụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ha na-eme nnọọ ka ndị ikwu na ibe ndị nwụrụ anwụ nwee olileanya, na-eme ka ụfọdụ ndị na-aga na nke ndị dibịa afa, bụ́ ndị na-asị na ha nwere ike ịkpọtụrụ ndị nwụrụ anwụ.

Akụkọ ndị ahụ hà mere eme? Ya bụrụ na ha mere eme, ọ́ gaghị emegide ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru, bụ́ ndị dị n’elu? Kraịst Jizọs kwuru na Okwu Chineke bụ eziokwu. (Jọn 17:17) Eziokwu anaghị emegide onwe ya. N’ezie, Baịbụl mere nnọọ ka anyị mara otú anyị kwesịrị isi lee akụkọ ndị na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ nwere ike inyere ndị dị ndụ aka anya. Baịbụl kọọrọ anyị banyere onye nwara inweta enyemaka nke onye nwụrụ anwụ. Iji nlezianya gụọ akụkọ ahụ ga-eme ka anyị mata nke bụ́ eziokwu.

Eze nke Chọrọ Enyemaka Onye Nwụrụ Anwụ

Ebe ihe a anyị na-aga ịkọ nọ mee bụ n’ọgbọ agha dị n’ebe ugwu Izrel. Eze Sọl na ndị agha ya chere ndị agha Filistia bụ́ agada gbachiri ụzọ ihu. Mgbe Sọl hụrụ ọmụma ụlọikwuu nke ndị Filistia, “obi wee malite ịma ya jijiji nke ukwuu.” N’oge a n’ọchịchị Sọl, ọ hapụla ezi ofufe. N’ihi ya, Jehova azaghị ya arịrịọ ọ rịọrọ ya maka enyemaka. Olee ebe Sọl ga-esi nweta enyemaka? Onye amụma Chineke bụ́ Samuel anwụọla.—1 Samuel 28:3, 5, 6.

Sọl gara ka onye mgbaasị bi n’En-dọọ nyere ya aka. Ọ rịọrọ onye mgbaasị ahụ ka o si ná ndị nwụrụ anwụ “kpọpụtara [ya] Samuel.” Onye mgbaasị ahụ kpọpụtaara ya onyinyo ụgha. Onye a a sịrị na ọ bụ Samuel gwara Sọl na ndị Filistia ga-emeri ha, nakwa na ya na ụmụ ya ndị ikom ga-anwụ n’agha ahụ. (1 Samuel 28:7-19) Onye ahụ ọ̀ bụ Samuel ahụ nwụrụla anwụ n’ezie?

Chegodị echiche banyere ya. Baịbụl kwuru na mgbe mmadụ nwụrụ, onye ahụ ‘na-alaghachi n’ala’ nakwa na “echiche ya na-ala n’iyi.” (Abụ Ọma 146:4) Ma Sọl ma Samuel maara na Chineke katọrọ ịgakwuru ndị mgbaasị. Tupu mgbe ahụ, Sọl emeedịla ka a chụpụ ndị mgbaasị niile n’ala ahụ!—Levitikọs 19:31.

Chebagodịrị okwu a echiche. A sị na Samuel ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka nọ ndụ dị ka mmụọ, ọ̀ gaara emebi iwu Chineke ma kwere isi n’aka onye mgbaasị pụta ịhụ Sọl? Jehova jụrụ ịgwa Sọl okwu. Ma, onye mgbaasị ọ̀ ga-amanyeli Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile isi n’ọnụ Samuel nwụrụ anwụ gwa Sọl okwu? Ee e. O doro anya na onye a a sịrị na ọ bụ Samuel abụtụghị onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke. Ọ bụ mmụọ—mmụọ ọjọọ nke mere ka ọ̀ bụ Samuel nwụrụ anwụ.

Ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi obere oge e kesịrị mmadụ. (Jenesis 6:1-4; Jud 6) Ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ileru mmadụ anya mgbe ọ dị ndụ; ha maara otú onye nke ọ bụla si ekwu okwu, ọdịdị onye nke ọ bụla, na omume ya. Ọ na-agụ ha agụụ ime ka ndị mmadụ chee na ihe Baịbụl kwuru abụghị eziokwu. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji dọọ anyị aka ná ntị izere ịgakwuru ndị mmụọ dị otú ahụ! (Diuterọnọmi 18:10-12) Ndị mmụọ ọjọọ a ka na-akpa ike taa.

Ugbu a, anyị ahụla ihe mere ụfọdụ ndị ji akọ na ha “nụrụ okwu” ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ma ọ bụ “hụ” ha. Ọ bụ ezie na onyinyo ụgha ndị ahụ nwere ike iyi ndị dị obiọma, nzube ndị mmụọ ọjọọ bụ ịghọgbu ụmụ mmadụ. * (Ndị Efesọs 6:12) E wezụga nke ahụ, chebara nke a echiche: Jehova bụ Chineke nke hụrụ anyị n’anya ma na-eche banyere anyị. A sị na e nwere ebe ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, ya abụrụkwa na ha nwere ike inyere ndị ikwu na ibe ha aka, Onye Okike anyị hụrụ anyị n’anya ọ̀ gaara asị anyị akpọtụrụla ha ma kwuo na ọ bụ “ihe arụ”? Mbanụ! (1 Pita 5:7) È nwezirinụ ebe ziri ezi anyị nwere ike isi nweta enyemaka?

Ihe Ga-enyere Ma Ndị Dị Ndụ Ma Ndị Nwụrụ Anwụ Ezigbo Aka

Ihe ndị anyị tụlerela emeela ka anyị ghọta na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike inyere ndị dị ndụ aka. E wezụga nke ahụ, ọ bụghị naanị na ịchọ enyemaka ndị nwụrụ anwụ enweghị isi; ọ dị nnọọ ize ndụ, n’ihi na o megidere iwu Chineke ma nwee ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ nyewe anyị nsogbu.

Baịbụl gwara anyị Onye ga-akacha enyere anyị aka—bụ́ Onye Okike anyị, bụ́ Jehova. O nwere ike ịnapụta anyị n’aka ọnwụ. (Abụ Ọma 33:19, 20) Taa, ọ dị njikere inyere anyị aka. Ya mere, ọ na-eme ka anyị nwee ezi olileanya, nke dị nnọọ iche n’olileanya ụgha ndị dibịa afa na-enye ndị mmadụ.

Tamba, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, ji ihe mere ya chọpụta ọdịiche dị n’ụgha ndị dibịa afa na-agha na eziokwu nke Jehova na-agwa anyị. Ndị dibịa afa kwuru na ọ bụrụ na ọ chụghịrị ndị nna nna ya nwụrụ anwụ àjà, ọ ga-ada n’ule. Tamba na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl ọhụrụ. Ọ ghọtala nnọọ ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ghọtakwa ndị bụ́ ndị ọjọọ na-eme ka hà bụ ndị nna nna nwụrụ anwụ. N’agbanyeghị oké nsogbu nne Tamba nọ na-enye ya ka ọ gaa ka dibịa afa nyere ya aka, ọ jụrụ ma gwa nne ya, sị: “Ọ bụrụ na m daa, m ga-agbasikwu mbọ ike n’afọ ọzọ.”

Olee ihe merenụ? Ọ gbara onye mbụ n’ule ahụ! Ọ tụrụ nnọọ nne ya n’anya, ya akwụsị ikwere ná ndị dibịa afa, o kwutụkwaghị banyere ịchụ ụdị àjà ahụ ọzọ. Tamba mụtara na Jehova na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị zere “ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ.” (Aịzaya 8:19) Ịmụ Baịbụl mere ka obi sie Tamba ike na ọ bụrụ na iwu Chineke na-atọ ya ụtọ, ihe ga-agara ya nke ọma.—Abụ Ọma 1:1-3.

Oleekwanụ banyere ndị anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị? É nweghị olileanya maka ha? E wezụga inyere anyị bụ́ ndị dị ndụ aka, Jehova kwere nkwa inyere ndị nọ n’ili aka. Mgbe Aịzaya onye amụma kọwachara na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ime ihe ọ bụla, lee ihe o kwuru n’isi 26, amaokwu nke 19: “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. . . . Tetanụ tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá!” Amụma ahụ kwukwara na “ndị na-adịghị ndụ” ga-adị ndụ ọzọ.

Chegodị echiche! A ga-akpọlite ọtụtụ ijeri ndị nọ n’ili, bụ́ ndị na-amaghị ebe ha nọ, n’ọnwụ! N’ezie, Baịbụl kọọrọ anyị na ‘agụụ inye ndị nwụrụ anwụ ndụ na-agụsi Jehova ike.’ (Job 14:14, 15) Nkwa ndị ahụ hà na-ada gị ka akụkọ ifo? Jizọs Kraịst ji nnọọ olileanya a n’aka nke na o kwuru na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’anya Jehova.—Luk 20:37, 38.

Ị̀ ga-achọ inwe olileanya a? * Nọgide na-enweta amamihe ziri ezi dị na Baịbụl. Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-ejide n’aka na Jehova nwere ike inyere ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ aka nakwa na nkwa ya “kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:4, 5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha ahụ a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ par. 18 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu isiokwu a, gụọ broshuọ bụ́ Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 26 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa Baịbụl kwere na a ga-enwe mbilite n’ọnụ, gụọ isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịchọ ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Onye amụma bụ́ Samuel ò si n’ili pụta iji gwa Eze Sọl okwu?