Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwoke Dị Umeala n’Obi Ma Nwee Obi Ike

Nwoke Dị Umeala n’Obi Ma Nwee Obi Ike

Maka Ndị Na-eto Eto

Nwoke Dị Umeala n’Obi Ma Nwee Obi Ike

Jona—Akụkụ Nke 1

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JONA 1:1-17; 2:10–3:5.

Olee ụdị mkpọtụ i chere oké ifufe ahụ na-eme, oleekwa otú i chere o si na-efe?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Jona na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ ahụ site n’ụda olu ha?

․․․․․

Kọwaa ihe i chere ga-abụ ihe Jona na-eche mgbe ọ na-emikpu n’oké osimiri ahụ nakwa mgbe nnukwu azụ̀ ahụ lochara ya. (Gụọ Jona 2:1-9.)

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ụdị ndị biri na Ninive, oleekwa ihe ọ ga-abụ ya mere Jona achọchaghị ịgakwuru ha ná mmalite? (Nehọm 3:1)

․․․․․

Olee otú i chere Ninive si bụrụ “obodo dị nnọọ ukwuu n’anya Chineke”? (Jona 3:3; 2 Pita 3:9)

․․․․․

Otú Jona si kwuo ihe niile merenụ mgbe ọ na-ekwu banyere mmejọ ya nakwa banyere Chineke ya na-egosi gịnị banyere ya? (Gụghachi Jona 1:9, 10.)

․․․․․

Olee otú Jona si nwee ike ịmata ihe mere n’ụgbọ ahụ mgbe a tụbachara ya n’oké osimiri? (Gụghachi Jona 1:15, 16.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Ụjọ.

․․․․․

Ịdị umeala n’obi.

․․․․․

Obi ike.

․․․․․

Otú Jehova si ele ndị mmadụ anya, ọbụna ndị yiri ka hà na-eme anyị ihe ọjọọ.

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na ị chọrọ imekwu nnyocha, gụọ Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2009, peeji nke 25-28.