Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Guzosiri Ike Mgbe E Lere Ya Ule

O Guzosiri Ike Mgbe E Lere Ya Ule

Ṅomie Okwukwe Ha

O Guzosiri Ike Mgbe E Lere Ya Ule

PITA legidere nnọọ ndị na-ege Jizọs ntị anya n’ihu. Ha nọ n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Kapaniọm. Ọ bụ n’obodo a ka ụlọ Pita dị; ọ bụ n’ebe a ka ọ na-akụ azụ̀, n’ikpere Oké Osimiri Galili; ọtụtụ n’ime ndị enyi ya, ndị ikwu ya, na ndị ya na ha chụkọrọ nta ego bi ebe a. O doro anya na Pita chọsiri ike ka ndị obodo ya hụ Jizọs otú ọ hụrụ ya, ka ha nweekwa obi ụtọ ịmụta banyere Alaeze Chineke n’ọnụ onye ozizi a kacha ukwuu. O yighị ka ụdị ihe ahụ ọ̀ ga-eme taa.

Ọtụtụ ndị akwụsịla ige Jizọs ntị. Ụfọdụ nọ na-atamu nnọọ ntamu, na-agba ihe Jizọs na-akụziri ha ụkwụ. Ma, ihe kacha na-enye Pita nsogbu n’obi bụ ihe ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs mere. Ihu anaghịzi atọ ha ọchị ka ndị mụtara ihe ndị dị mkpa, obi adịghịzi ha ụtọ ka ndị chọtara ihe ọhụrụ, ha enweghịzikwa ọṅụ ka ndị mụtara eziokwu. Iwe jizi ha, obi na-eludị ha ilu. Ụfọdụ n’ime ha kwuru otú obi dị ha, kwuo na ozizi Jizọs na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ha kwụsịrị ige ntị, si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ—kwụsịkwa iso Jizọs.

Oge ahụ siiri Pita na ndịozi ibe ya ike. Pita aghọtachaghị ihe Jizọs kwuru n’ụbọchị ahụ. O doro anya na ọ ghọtara ihe mere okwu Jizọs nwere ike iji kpasuo mmadụ iwe ma onye ahụ lee ya anya elu elu. Ma, olee ihe Pita ga-eme? Nke ahụ abụghị nke mbụ a na-ele Pita ule ma ọ̀ ga-eguzosi ike n’ebe Nna ya Ukwu nọ, ọ gaghịkwanụ abụ nke ikpeazụ. Ka anyị hụ otú okwukwe Pita si nyere ya aka imeri ule ndị ahụ ma guzosie ike.

O Guzosiri Ike Mgbe Ndị Ọzọ Na-eguzosighị

Ihe Jizọs na-eme na-atụkarị Pita n’anya. Ugboro ugboro, Nna ya Ukwu mere ihe ndị mmadụ na-atụghị anya na Ọ ga-eme ma ọ bụ kwuo ihe ndị mmadụ na-atụghị anya na Ọ ga-ekwu. Naanị ụnyaahụ ya, Jizọs rụrụ ọrụ ebube iji nye ìgwè dị ọtụtụ puku mmadụ nri. N’ihi ya, ìgwè mmadụ ahụ nwara ime ya eze. Ma, o mere ihe tụrụ ọtụtụ ndị n’anya mgbe ọ gara n’ugwu ma manye ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye n’ụgbọ ma gafee Kapaniọm. Ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwọ ụgbọ ha na-agafe n’ofe nke ọzọ n’abalị ahụ, o mere ihe ọzọ tụrụ ha n’anya mgbe ọ gara ije n’elu Oké Osimiri Galili ahụ ebili mmiri na-enugharị, bụ́ nke mere ka Pita mụta otu ihe dị mkpa banyere okwukwe. *

N’ụtụtụ, ha chọpụtara na ìgwè mmadụ ahụ achọrọkwala ha bịa n’ofe nke ọzọ nke mmiri ahụ. Ma, o doro anya na ihe mere ndị ahụ ji esogharị ha bụ ka Jizọs rụọ ọrụ ebube ọzọ iji nye ha nri, ọ bụghị na ha chọrọ ịnụ okwu Chineke. Jizọs baara ha mba maka ịchọ naanị ihe anụ ahụ́. Jizọs gara n’ihu n’okwu ahụ n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm, bụ́ ebe ọ nọ mee ihe ọzọ ndị mmadụ na-atụghị anya ya iji kụzie otu eziokwu dị mkpa nke siri ike nghọta.

Jizọs chọrọ ka ndị ahụ mata na ya abụghị naanị onye na-enye ihe oriri nkịtị, kama na ya bụ onye Chineke nyere iji napụta ha, bụ́ onye ndụ na ọnwụ ya dị ka mmadụ ga-eme ka o kwe ndị ọzọ omume inweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, o mere otu ihe atụ, jiri onwe ya tụnyere mana, bụ́ achịcha nke Chineke si n’eluigwe nye ndị Izrel n’oge Mozis. Mgbe ụfọdụ na-ekwenyeghị n’ihe o kwuru, o meere ha otu ihe atụ doro anya, kọwaara ha na ọ dị ha mkpa iri anụ ahụ́ ya na ịṅụ ọbara ya iji nweta ndụ. Ọ bụ n’oge a ka ndị mmadụ gbasiwere ihe ọ na-ekwu ụkwụ ike. Ụfọdụ kwuru, sị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ ige ntị na ya?” Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kpebidịrị ịkwụsị iso ya. *Jọn 6:48-60, 66.

Olee ihe Pita ga-eme? Ọ ghaghị ịbụ na ihe a Jizọs kwuru jukwara ya anya. Ọ ghọtabeghị na Jizọs ga-anwụrịrị iji mezuo uche Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita ò chere echiche ịhapụ Nna ya Ukwu otú ahụ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs n’elu ọnụ mere n’ụbọchị ahụ? Ee e; ọ dị ihe dị mkpa mere Pita ji dị iche n’ebe ha nọ. Olee ihe ọ bụ?

Jizọs lekwasịrị ndịozi ya anya ma sị ha: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” (Jọn 6:67) Ọ bụ ndịozi iri na abụọ ya ka ọ gwara okwu ahụ, ma ọ bụ Pita kwuru okwu. Ọ na-abụkarị ya na-ebu ụzọ ekwu okwu. O nwere ike ịbụ Pita tọchara ha. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ bụ ya kacha nwee nkwuwa okwu ná ndịozi ahụ; o yiri ka ọ̀ na-esiri Pita ike ịhapụ ikwu ihe dị ya n’obi. Na nke ugbu a, ihe dị ya n’obi bụ okwu a magburu onwe ya nke a na-anaghị echefu echefu: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:68.

Okwu ndị ahụ ọ́ naghị emetụ gị n’obi? Okwukwe Pita nwere na Jizọs enyerela ya aka inwe otu àgwà magburu onwe ya, bụ́ iguzosi ike n’ihe. Pita ghọtara nnọọ na e nweghị Onye Nzọpụta ọzọ ma e wezụga Jizọs nakwa na Jizọs na-azọpụta ndị mmadụ site n’okwu ọnụ ya, ya bụ, ihe ọ na-akụzi banyere Alaeze Chineke. Pita maara na a sịgodị na e nwere ihe ụfọdụ gbagwojuru ya anya, na ọ dịghị ebe ọzọ ya ga-aga ma ọ bụrụ na ya chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na inweta ngọzi nke ndụ ebighị ebi.

Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si lee ya anya? Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-ekwu na ha hụrụ Jizọs n’anya, ma, ha anaghị eguzosi ike n’ebe ọ nọ. Iji guzosie nnọọ ike n’ebe Kraịst nọ, anyị aghaghị ile ozizi ya anya otú ahụ Pita si lee ya. Ọ dị anyị mkpa ịmụta ya, ịghọta ihe ọ pụtara, na ime ya eme—ya bụrụgodị na ọ na-agbagwoju anyị anya n’ihi na ọ dị iche n’ihe anyị tụrụ anya ya na ihe anyị chọrọ. Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi ahụ Jizọs chọrọ ka anyị nweta bụ iguzosi ike.

O Guzosiri Ike Mgbe A Gbaziri Ya

Mgbe oge ahụ Jizọs ji ọrụ n’aka gafetụrụ, ọ kpọ ndịozi na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya gaa ogologo njem n’ebe ugwu. Mgbe ụfọdụ, a na-anọ n’Oké Osimiri Galili na-acha anụnụ anụnụ ahụ Ugwu Hemọn snoo na-ekpuchi elu ya, bụ́ nke dị n’ime ime ebe ugwu nke Ala Nkwa ahụ. Nwayọọ nwayọọ, ugwu ahụ nọ na-ebukwu ibu n’anya ìgwè mmadụ ahụ ka ha na-abịaru ya nso, ka ha si n’ụzọ ugwu na-aga n’obodo nta ndị dị nso na Sesaria Filipaị. * Ọ bụ n’ebe a mara mma, bụ́ ebe e nwere ike ịnọ na-ahụ ihe ka ukwuu n’ebe ndịda Ala Nkwa ahụ, ka Jizọs nọ jụọ ndị na-eso ụzọ ya otu ajụjụ dị mkpa.

Ọ jụrụ ha, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” Anyị nwere nnọọ ike iji anya nke uche anyị hụ ka Pita legidere Nna ya Ukwu anya ka ọ na-eche ka ha zaa ya ajụjụ ahụ ọ jụrụ ha, hụ ọzọ na ọ dị obiọma ma nwee ezigbo ọgụgụ isi. Jizọs nwere mmasị ịnụ ihe ndị na-ege ya ntị chere banyere ya n’ihi ihe ndị ha hụrụ ma nụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs zara ya ajụjụ ahụ, gwa ya ihe ụfọdụ na-ezighị ezi ọtụtụ ndị na-ekwu banyere onye Jizọs bụ. Ma, ọ bụghị naanị nke ahụ ka Jizọs chọrọ ịma. Ọ chọrọ ịma ma ndị na-eso ụzọ ya kasị nọrọ ya nso hà na-echekwa ihe ndị ahụ na-ezighị ezi banyere ya. N’ihi ya, ọ jụrụ ha, sị: “Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?”—Luk 9:18-22.

Pita mekwara ngwa ngwa ọzọ ịza ya. O ji nkwuwa okwu kwuo okwu ndị magburu onwe ha dị ọtụtụ ndị n’obi. O kwuru, sị: “Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.” Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ka Jizọs mụmụrụ ọnụ ọchị mgbe ọ na-aja Pita mma. Jizọs chetaara Pita na ọ bụ Jehova Chineke—ọ bụghị mmadụ ọ bụla—mere ka ndị nwere ezi okwukwe ghọta eziokwu a dị mkpa. E nyerela Pita aka ịghọta otu n’ime eziokwu ndị kacha gbaa ọkpụrụkpụ Jehova kpughetụụrụla ụmụ mmadụ mgbe ahụ, ya bụ, Onye Mesaya, ma ọ bụ Kraịst ahụ, e kwere ná nkwa kemgbe bụ!—Matiu 16:16, 17.

Ọ bụ Kraịst a ka amụma oge ochie kpọrọ nkume ndị na-ewu ụlọ ga-ajụ. (Abụ Ọma 118:22; Luk 20:17) Jizọs bu amụma ndị dị otú ahụ n’obi gwa ndị na-eso ụzọ ya na Jehova ga-ewukwasị ọgbakọ Kraịst n’elu nkume a, ma ọ bụ oké nkume a, bụ́ nke Pita ka kọwachara. * O nyeziri Pita ọrụ ndị dị nnọọ mkpa n’ọgbakọ ahụ. O meghị Pita onyeisi nke ndịozi ndị ọzọ, dị ka ụfọdụ chere, kama o nyere ya ọrụ ndị dị mkpa. O nyere Pita “mkpịsị ugodi nke alaeze.” (Matiu 16:19) Ọ ga-abụ ọrụ dịịrị Pita imeghere ụdị ụmụ mmadụ atọ ohere nke ịbanye n’Alaeze Chineke—ndị nke mbụ bụ ndị Juu, ndị nke abụọ abụrụ ndị Sameria, ndị ikpeazụ abụrụkwa ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị Juu.

Ma, Jizọs mechara kwuo na ndị e nyere ihe dị ukwuu ga-enwe ajụjụ ka ukwuu ịza, ihe mere Pita gosikwara na nke ahụ bụ eziokwu. (Luk 12:48) Jizọs nọgidere na-ekpughe eziokwu ndị dị mkpa banyere Mesaya ahụ, bụ́ nke gụnyere ahụhụ ọ ga-atarịrị n’oge na-adịghị anya ma nwụọ na Jeruselem. O wutere Pita ịnụ ụdị ihe ahụ. Ọ kpọpụrụ Jizọs iche ma malite ịbara ya mba, sị, “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.”—Matiu 16:21, 22.

O doro anya na ọ dịghị ihe ọjọọ Pita bu n’obi kwuo ihe o kwuru, n’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ihe Jizọs zara juru ya anya. Ọ gbakụtara Pita azụ, lee ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ anya—bụ́ ndị ọ ga-abụkwa na ha na-eche ihe yiri nke ahụ—ma kwuo, sị: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.” (Matiu 16:23; Mak 8:32, 33) Ihe a Jizọs kwuru bụụrụ anyị ezigbo ndụmọdụ. Ọ dị nnọọ mfe ikwe ka echiche mmadụ bute echiche Chineke ụzọ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke ahụ mee anyị, ya bụrụgodị na anyị bu ezigbo ihe n’obi, anyị nwere ike ịghọ ndị na-akwado uche Setan n’amaghị ama kama ịbụ ndị na-akwado uche Chineke. Ma, olee ihe Pita mere?

Ọ maara nnọọ na Jizọs anaghị akpọ ya Setan bụ́ Ekwensu n’ụzọ nkịtị. A sị ka e kwuwe, Jizọs agwaghị Pita okwu otú ọ gwara Setan. Mgbe Jizọs na-agwa Setan okwu, ọ sịrị: “Si ebe a pụọ”; mgbe ọ na-agwa Pita, ọ sịrị: “Gaa m n’azụ.” (Matiu 4:10) Jizọs ajụghị onyeozi ya ọ hụrụ ọtụtụ ezi ihe n’ime ya, naanị ihe o mere bụ ịgbazi echiche na-ezighị ezi o nwere n’okwu a. O doro anya na ọ dị mkpa ka Pita kwụsị ịkwuchi Nna ya Ukwu ihu, na-aghọrọ ya ihe ịsụ ngọngọ, ma gafee ya n’azụ dị ka onye na-eso ụzọ ya nke na-akwado ya.

Pita ọ̀ rụrụ Jizọs ụka, wee iwe ma ọ bụkwanụ kowe ọnụma? Ee e; o ji obi umeala nabata mgbazi a a gbaziri ya. O gosikwara ọzọ na ya na-eguzosi ike. Ọ ga-adị mkpa ịgbazi ndị niile na-eso Kraịst mgbe ụfọdụ. Naanị ihe ga-eme ka anyị nọgide na-abịarukwu Jizọs Kraịst na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, nso bụ anyị iji obi umeala nabata ịdọ aka ná ntị ma mụrụ ihe na ya.—Ilu 4:13.

A Kwụrụ Ya Ụgwọ Ọrụ Maka Iguzosi Ike

N’oge na-adịghị anya, Jizọs kwuru ihe ọzọ na-atụ n’anya: “N’ezie, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” (Matiu 16:28) O doro anya na ọ gụsiri Pita agụụ ike ịmata ihe okwu ndị ahụ pụtara. Olee ihe Jizọs ga-ebu n’obi kwuo ụdị okwu ahụ? Ikekwe, Pita nọ na-eche ma mgbazi ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ a ka gbaziri ya ọ̀ ga-eme ka ọ ghara iru eru inweta ohere ọma dị otú ahụ.

Ma, mgbe ihe dị ka otu izu gasịrị, Jizọs kpọ Jems, Jọn, na Pita gbagoro “n’ugwu dị oké elu”—ikekwe Ugwu Hemọn, bụ́ nke dị naanị kilomita ole na ole site n’ebe ha nọ. Ọ dị ka ọ̀ bụ n’abalị, ebe ọ bụ na mmadụ atọ ahụ na ụra nọ na-alụ. Ma, mgbe Jizọs nọ na-ekpe ekpere, otu ihe mere nke mere ka ụra pụọ ha n’anya.—Matiu 17:1; Luk 9:28, 29, 32.

Jizọs malitere ịgbanwe n’anya ha. Ihu ya malitere igbukepụ egbukepụ, na-enwu gbaa ruo mgbe ọ chawara ka anyanwụ. Uwe ya nọkwa na-enwu ọcha. Ihe yiri mmadụ abụọ pụtaziri n’akụkụ Jizọs, otu nọchiri anya Mozis, nke ọzọ anọchiekwa anya Ịlaịja. Ha nọ na-ekwurịta banyere “ọlịla ya nke a kara aka na ọ ga-emezu na Jeruselem”—ikekwe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya. Ọ bịara doo nnọọ anya na Pita hiere ụzọ mgbe o kwuru na Jizọs agajeghị ịta ụdị ahụhụ ahụ!—Luk 9:30, 31.

Ọ dị nnọọ Pita ọkụ n’ahụ́ iso n’ọhụụ a pụrụ iche. O yiri ka Mozis na Ịlaịja hà na-achọ ịhapụ Jizọs. N’ihi ya, Pita kwuru okwu, sị: “Onye Ozizi, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a, ya mere, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja.” N’ezie, ụlọikwuu adịghị ndị a ha hụrụ n’ọhụụ mkpa, bụ́ ndị nọchiri anya ndị ohu Jehova abụọ nwụrụla kemgbe. Nke bụ́ eziokwu bụ na Pita amaghị ihe ọ na-ekwu. Ma, ihe nwoke a na-anụ ọkụ n’obi ọ́ masịghị gị?—Luk 9:33.

Ya na Jems na Jọn nwetara ụgwọ ọrụ ọzọ n’abalị ahụ. Ígwé ojii gbachiri ma malite ikpuchi ha n’ugwu ahụ. Otu olu si na ya dapụta, ya bụ, olu Jehova Chineke! O kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara. Geenụ ya ntị.” Ọhụụ ahụ gwụziri, ya afọzie naanị ha na Jizọs n’elu ugwu ahụ.—Luk 9:34-36.

Ọhụụ ahụ bụụrụ nnọọ Pita onyinye magburu onwe ya, bụkwaara anyị! Iri afọ ole na ole nke ahụ mechara, o dere banyere ohere ọma o nwere n’abalị ahụ iso ná “ndị ji anya ha hụ ịdị ebube ya,” hụpere nnọọ otú Jizọs ga-esi dị ebube mgbe ọ ghọrọ Eze n’eluigwe. Ọhụụ ahụ gosiri na ọtụtụ amụma e buru n’Okwu Chineke bụ eziokwu, wusiekwa okwukwe Pita ike maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ya n’ọdịnihu. (2 Pita 1:16-19) O nwekwara ike imere anyị otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị eguzosie ike n’ebe Nna anyị Ukwu nọ, bụ́ onye Jehova mere onyeisi anyị, mụta ihe n’aka ya, nabata ịdọ aka ná ntị na mgbazi ya, jirikwa obi umeala na-eso ya kwa ụbọchị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Anyị ga-ahụ na ìgwè mmadụ ahụ anaghị akwụ otu ebe ma anyị jiri ihe a ha na-ekwu banyere ozizi Jizọs tụnyere ihe ha mere ụnyaahụ ya, bụ́ mgbe ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa na ọ bụ onye amụma nke Chineke.—Jọn 6:14.

^ par. 15 Site n’ikpere Oké Osimiri Galili, ìgwè mmadụ ahụ si na ndagwurugwu dị narị mita abụọ na iri n’omimi gbagoruo n’ebe dị narị mita atọ na iri ise n’elu, gafere ógbè mara ezigbo mma, ka ha na-eme njem ahụ dị ihe dị ka kilomita iri anọ na asatọ.

^ par. 18 Gụọ igbe bụ́  “Ònye Bụ Oké Nkume Ahụ?” nke dị na peeji nke 28.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

 Ònye Bụ Oké Nkume Ahụ?

“Ana m asịkwa gị, Ị bụ Pita, ọ bụkwa n’oké nkume a ka m ga-ewukwasị ọgbakọ m.” (Matiu 16:18) Ọtụtụ ndị echeela na okwu ahụ Jizọs gwara onyeozi ya bụ́ Pita pụtara na a ga-ewukwasị ọgbakọ Ndị Kraịst na Pita. Chọọchị Katọlik na-akụzi na Jizọs mere Pita onyeisi ndịozi ndị ọzọ, nke pụtara na o mere ya poopu mbụ. N’ihi ya, n’Ụlọ Chọọchị Basilika Senti Pita dị na Rom, e ji okwu Jizọs ndị a chọọ otu ebe elu ya gbara gburugburu mma, n’aka akwụkwọ Latịn toro ogologo karịa mmadụ.

Ihe Jizọs bu n’uche ọ̀ bụ na Pita bụ oké nkume ahụ nke Jizọs ga-ewukwasị ọgbakọ ya n’elu ya? Ee e. Ka anyị tụlee ihe atọ mere anyị ji jide nke a n’aka. Nke mbụ, ndịozi ndị ọzọ nọ ya mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ, ha esighịkwa otú ahụ ghọta okwu ya. A sị na Jizọs mere Pita onyeisi ha n’ihu ha niile, oleezi ihe mere ha ji mechaa rụọ ụka ugboro ugboro banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu? (Mak 9:33-35; Luk 22:24-26) Nke abụọ, Pọl onyeozi mechara gosi na oké nkume ahụ bụ Jizọs Kraịst, ọ bụghị Pita. (1 Ndị Kọrịnt 3:11; 10:4) Nke atọ, iri afọ ole na ole ka nke ahụ mechara, Pita n’onwe ya gosiri na ya echeghị na ọ bụ ya bụ oké nkume ahụ. Kama nke ahụ, o dere na Jizọs bụ “nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala,” nke e buru n’amụma kemgbe, bụ́ onye Chineke ji aka ya họpụta.—1 Pita 2:4-8.

N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ na-ekwusi ike na ebe ọ bụ na aha Pita pụtara “Nkume,” Jizọs na-ekwu na ọ bụ ya bụ oké nkume ahụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na aha Pita na oké nkume, bụ́ nke e kwuru banyere ya n’otu amaokwu ahụ, abụghị otu ihe. Aha Pita pụtara “Iberibe Nkume,” a na-ejikwa ya akọwa nwoke; a na-eji okwu a sụgharịrị “oké nkume” akọwa nwaanyị. Oleezi otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu Jizọs? E nwere ike ikwu na ihe ọ na-agwa Pita bụ: “Gị, onye m na-akpọ Pita, ma ọ bụ Nkume, aghọtala onye bụ́ ‘oké nkume’ ahụ, bụ́ Kraịst, bụ́ onye ga-abụ ntọala nke ọgbakọ Ndị Kraịst.” Pita nwere nnọọ ohere ọma n’ihi na o nyere aka mee ka a ghọta eziokwu ahụ dị mkpa!

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Pita guzosiri ike ọbụna mgbe a gbaziri ya

[Foto dị na peeji nke 26]

E ziri Pita otu ọhụụ magburu onwe ya iji kwụọ ya ụgwọ maka iguzosi ike