Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Mere Chineke ji Lụso ndị Kenan Agha?

Olee Ihe Mere Chineke ji Lụso ndị Kenan Agha?

Olee Ihe Mere Chineke ji Lụso ndị Kenan Agha?

“Ị ga-ahụ na i bibiri ha, ya bụ, ndị Het na ndị Amọraịt, ndị Kenan na ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu.”—DIUTERỌNỌMI 20:17.

“Unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—NDỊ ROM 12:18.

Ọ̀ DỊ gị ka amaokwu Baịbụl ndị ahụ hà na-emegide onwe ha? Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịghọta ihe mere Chineke ji nye iwu ka e bibie ndị Kenan, Baịbụl enyekwa ndụmọdụ ka anyị na ndị mmadụ dịrị n’udo. * (Aịzaya 2:4; 2 Ndị Kọrịnt 13:11) Nye ha, iwu ndị ahụ ekwekọghị ekwekọ.

A sị na gị na Chineke nwere ike ikwurịta isiokwu a, olee ihe ị ga-ajụ ya? Ka anyị tụlee ajụjụ ise ndị mmadụ na-ajụkarị na otú Baịbụl si zaa ha.

1. Olee ihe mere e ji chụpụ ndị Kenan? E nwere ike ikwu na ndị Kenan bi n’ala na-abụghị nke ha. N’ihi gịnị? Ihe dị ka narị afọ anọ tupu mgbe ahụ, Chineke kwere nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Ebreham, nkwa na ụmụ ya ga-ebi n’ala Kenan. (Jenesis 15:18) Chineke mezuru nkwa ahụ mgbe o mere ka mba Izrel, bụ́ ụmụ ụmụ Ebreham, biri n’ógbè ahụ. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ndị Kenan bibu ebe ahụ ebi, n’ihi nke ahụkwa, na ala ahụ bụ nke ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ebe ọ bụ Chineke bụ Eze eluigwe na ala, ọ bụ ya kacha nwee ikike ikpebi onye ga-ebi ebe ọ ga-ebi.—Ọrụ 17:26; 1 Ndị Kọrịnt 10:26.

2. Olee ihe mere Chineke ekweghị ka ndị Kenan na ndị Izrel bikọta? Chineke dọrọ ndị Izrel aka ná ntị banyere ndị Kenan, sị: “Ha ekwesịghị ibi n’ala gị, ka ha ghara ime ka i mehie m. Ọ bụrụ na i fee chi ha, ọ ga-aghọrọ gị ọnyà.” (Ọpụpụ 23:33) Onye amụma bụ́ Mozis mechara gwa ndị Izrel, sị: “Ọ bụ n’ihi ajọ omume nke mba ndị a ka Jehova bụ́ Chineke gị ji achụpụ ha n’ihu gị.” (Diuterọnọmi 9:5) Olee nnọọ otú mba ndị ahụ jọruru ná njọ?

Omume rụrụ arụ, ife arụsị, na iji ụmụaka achụ àjà juru ebe niile n’ala Kenan. Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Baịbụl, bụ́ Henri H. Hali, kwuru na ndị ọkà mmụta ihe ochie na-egwu ala n’ebe ahụ “chọtara ọtụtụ ite ájá ndị ozu ụmụaka a chụụrụ Bel [chi ndị Kenan a ma ama] n’àjà dị n’ime ha.” O kwukwara, sị: “Ebe ahụ niile bụ nnọọ ebe a na-eli ozu ụmụ ọhụrụ. . . . Ndị Kenan fere ofufe, site n’ime omume rụrụ arụ aghara aghara n’ihu chi ha dị iche iche, dị ka ememme okpukpe ha; na-egbukwa ụmụ ha ndị e bu ụzọ mụọ, dị ka àjà ha na-achụrụ chi ndị a. O yiri ka ala Kenan niile ọ̀ ghọrọ obodo Sọdọm na Gọmọra. . . . Ọ tụrụ ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie, bụ́ ndị gwuru ihe ná mkpọmkpọ ebe nke obodo ndị dịbu na Kenan n’anya na Chineke ebibighị ha ngwa ngwa karịa ka o mere.”

3. É nweghị ndị ọzọ bụ́ ndị ajọ omume n’ụwa n’oge ahụ? Olee ihe mere o ji bụrụ naanị ndị Kenan ka Chineke bibiri? E nweela ọtụtụ oge Chineke bibiri ndị ajọ omume ụfọdụ ma hapụ ndị ọzọ. Mgbe ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike’ n’oge Noa, Chineke mere ka e nwee iju mmiri nke bibiri mmadụ niile ma e wezụga otu ezinụlọ, ya bụ, ezinụlọ Noa. (Jenesis 6:11; 2 Pita 2:5) Chineke bibiri obodo Sọdọm na Gọmọra mgbe mmehie nke ndị bi na ha bịara dị “oké njọ.” (Jenesis 18:20; 2 Pita 2:6) Ọ makwara Ninive bụ́ isi obodo Asiria, “obodo na-awụfu ọbara,” ikpe n’agbanyeghị na o bibighị ya mgbe ndị bi na ya si n’ụzọ ọjọọ ha chegharịa. (Nehọm 3:1; Jona 1:1, 2; 3:2, 5-10) Chineke bibikwaranụ ndị Kenan iji chebe ndị Izrel, bụ́ mba Mesaya ahụ ga-emecha si na ya pụta.—Abụ Ọma 132:11, 12.

4. Mbibi Chineke bibiri ndị Kenan ó megideghị ịhụnanya ya? E lee ya anya elu elu, mkpochapụ Chineke kpochapụrụ ndị Kenan nwere ike iyi ka ò megidere ịhụnanya ya. (1 Jọn 4:8) Ma, anyị leruo ya anya, anyị ga-ahụ na o gosiri nnọọ ịhụnanya ya.

Chineke maara kemgbe na ụzọ ndị Kenan na-agbaso adịghị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, kama ibibi ha ozugbo, o ji ndidi chere ruo narị afọ anọ bụ́ mgbe njehie ha ‘zuru.’—Jenesis 15:16.

Mgbe ndị Kenan meruru mmehie ebe olileanya na-adịkwaghị na ha ga-echegharị, Jehova bibiri ha. N’agbanyeghị nke ahụ, o bibighị ndị Kenan niile n’eleghị anya n’azụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụghị ha niile bụ ndị mmehie na-enweghị mmekwata. O meere ndị dị njikere ịgbanwe, dị ka Rehab na ndị Gibiọn, ebere.—Jọshụa 9:3-11, 16-27; Ndị Hibru 11:31.

5. Olee otú Chineke nke ịhụnanya ga-esi bibie mmadụ ọ bụla? Ajụjụ a adịghị njọ, n’ihi na igbu mmadụ anaghị atọ ụtọ ná ntị. Ma, n’ezie, ọ bụ ịhụnanya Chineke mere o ji bibie ndị ajọ omume. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na mmadụ enwee ajọ ọrịa nke mere ka aka ma ọ bụ ụkwụ ya rekasịwa, ọtụtụ mgbe o nweghị ihe ọzọ ndị dọkịta ga-eme ma ọ́ bụghị igbupụ aka ma ọ bụ ụkwụ ahụ. Ọ na-esi ike ịhụ dọkịta obi ga-atọ ụtọ ime nke ahụ, ma ezigbo dọkịta maara na ọ ka njọ ịhapụ onye ahụ ka ahụ́ ya niile rekasịa. Ebe ọ bụ na ọnọdụ onye ahụ na-emetụ ya n’obi, ọ na-arụ ọrụ ahụ na-anaghị atọ ụtọ n’ihi ọdịmma nke onye ọrịa ahụ.

N’otu aka ahụ, ọ tọghị Jehova ụtọ ibibi ndị Kenan. Ya onwe ya kwuru, sị: “Ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ m ụtọ.” (Ezikiel 33:11) O zubekwara ka Mesaya ahụ si ná mba Izrel pụta, bụ́ onye ga-emepere ndị niile nwere okwukwe ụzọ inweta nzọpụta. (Jọn 3:16) N’ihi ya, ọ dịghị otú Chineke ga-esi kwere ka ndị Kenan jiri omume ha rụrụ arụ metọọ ndị Izrel. Ọ bụ ya mere o ji nye iwu ka e gbuchapụ ndị Kenan, ma ọ bụ chụpụ ha, n’ala ahụ. Ihe ahụ Chineke mere gosiri nnọọ ịhụnanya—ịhụnanya nke mere ka ọ rụọ ọrụ na-anaghị atọ ụtọ maka ọdịmma nke ndị na-efe ya n’ikwesị ntụkwasị obi.

Uru Ọ Baara Anyị

Ọ̀ dị uru mbibi e bibiri ndị Kenan baara anyị taa? Ee, n’ihi na Ndị Rom 15:4 kwuru, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” Olee otú ihe mere na Kenan si enye anyị ntụziaka na olileanya?

Ọ dị ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ahụ. Dị ka ihe atụ, Chineke meere Rehab na ndị Gibiọn ebere ma chebe ha mgbe ha gosiri okwukwe n’ebe ọ nọ. Nke a na-echetara anyị na onye ọ bụla chọrọ nnọọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ nwere ike ime ya, n’agbanyeghị ebe a zụlitere ya ma ọ bụ mmehie ndị o mere n’oge gara aga.—Ọrụ 17:30.

Akụkọ mbibi e bibiri ndị Kenan na-emekwa ka anyị nwee olileanya n’ihi na ọ na-eme ka anyị mata ihe Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya. Akụkọ ndị ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke agaghị ekwe ka ihe ọjọọ kpagbuo ihe ọma kpamkpam. Kama nke ahụ, Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ọ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji bibie ndị ajọ omume niile ma duba ndị hụrụ ya n’anya n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume. (2 Pita 2:9; Mkpughe 21:3, 4) N’oge ahụ, okwu ndị a na-akasi obi ga-emezu: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa. Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.”—Abụ Ọma 37:34.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 N’isiokwu a, okwu bụ́ “ndị Kenan” pụtara mba niile Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha chụpụ.

[Igbe dị na peeji nke 14]

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Agha Ụmụ Mmadụ?

Iwu Chineke nyere ndị Izrel ka ha bibie ndị Kenan ò mere ka agha ụmụ mmadụ na-alụ taa zie ezie? Azịza ya bụ ee e, n’ihi ụzọ ihe atọ ma ọ dịkarịa ala:

O nweghị mba dị n’ụwa taa nke Chineke hụrụ n’anya karịa ibe ya. Mgbe ndị Izrel jụrụ ịnabata Jizọs dị ka Mesaya, ha kwụsịrị ịbụ mba na-anọchi anya Chineke n’ụzọ ọ bụla, tinyere ịnọchi anya ya n’ibibi ndị ọjọọ. (Matiu 21:42, 43) N’ihi ya, Jehova weziiri ndị Izrel otú o si were mba ndị ọzọ. (Levitikọs 18:24-28) Site n’oge ahụ gaa n’ihu, o nweghị mba dị n’ụwa nwere nnọọ ike ikwu na Chineke na-akwado ya n’agha.

O nweghịzi otu ebe Jehova na-enye ndị na-efe ya ka ha biri. Kama nke ahụ, ndị ohu ya si “ná mba niile na ebo niile” nke ụwa.—Mkpughe 7:9; Ọrụ 10:34, 35.

Jizọs mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya agaghị alụ agha. Mgbe ọ na-adọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere mwakpo a na-aga ịwakpo Jeruselem, ọ gbaghị ha ume ịnọ lụọ agha, kama nke ahụ, ọ gbara ha ume ịgbalaga, bụ́kwanụ ihe ha mere. (Matiu 24:15, 16) Kama iburu ngwá agha, ezi Ndị Kraịst na-atụkwasị nnọọ Alaeze Chineke obi, bụ́ nke ga-ewepụ ajọ omume niile n’ụwa anyị a n’oge na-adịghị anya.—Daniel 2:44; Jọn 18:36.

[Foto dị na peeji nke 15]

Akụkọ Rehab na-egosi na onye ọ bụla chọrọ nnọọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ nwere ike ime otú ahụ