Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Chineke si ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya?

Olee Otú Chineke si ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya?

Olee Otú Chineke si ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya?

ONYE OKIKE anyị, bụ́ onye chọrọ ka ihe dịrị anyị nnọọ ná mma, agwaghị anyị ka anyị ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya otú kwesịrị ekwesị. * Kama nke ahụ, o nyere mmadụ “mmanya iji mee ya obi ụtọ, nye ya mmanụ oliv iji mee ka obi ya ṅụrịa, nyekwa ya nri iji nye ya ike.” (Abụ Ọma 104:15, Today’s English Version) N’otu oge, Jizọs Kraịst mere ka otu ememme agbamakwụkwọ tọkwuo ụtọ site n’ime mmiri ka ọ ghọọ “mmanya kacha mma.”—Jọn 2:3-10, New Jerusalem Bible.

O ziri ezi iche na Onye Okike anyị maara kpọmkwem otú mmanya na-aba n’anya si emetụta ahụ́ na ụbụrụ anyị. Nna anyị nke eluigwe ji ihe ndị e dere na Baịbụl ‘akụziri anyị otú anyị ga-esi baara onwe anyị uru,’ ọ dọsikwara anyị aka ná ntị ike ka anyị zere ịṅụbiga mmanya ndị na-aba n’anya ókè. (Aịzaya 48:17) Tụlee ịdọ aka ná ntị ndị a doro anya:

“Unu adịkwala na-aṅụbiga mmanya ókè, nke ndụ ịla n’iyi dị na ya.” (Ndị Efesọs 5:18) “Ndị aṅụrụma . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Okwu Chineke katọrọ “ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị otú a.”—Ndị Galeshia 5:19-21.

Ka anyị tụlezie nsogbu ụfọdụ ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata.

Nsogbu Ndị Ịṅụbiga Mmanya Ókè Na-akpata

Ọ bụ ezie na e nwere uru ụfọdụ mmanya bara, e nwere ihe ndị siri ike dị na ya na-eme ka ahụ́ na ụbụrụ ghara ịrụ ọrụ nke ọma. Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata nke ọ bụla n’ime nsogbu ndị na-esonụ:

Ịṅụ oké mmanya na-emetụta echiche mmadụ, mee ka onye ahụ ‘ghara iche echiche nke ọma.’ (Ilu 23:33, TEV) Alen, bụ́ onye na-aṅụ oké mmanya e kwuru okwu ya n’isiokwu bú nke a ụzọ, kwuru, sị: “Aṅụrụma abụghị naanị ọrịa na-emetụta ahụ́ mmadụ; ọ bụ ọrịa na-emetụta echiche na àgwà mmadụ. Ọ na-eme ka ị ghara ichetụdị banyere nsogbu ọ na-akpatara ndị ọzọ.”

Ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè nwekwara ike ime ka mmadụ mee ihe ọ na-agaraghị eme. Akwụkwọ Nsọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Mmanya ochie na mmanya ọhụrụ na-anapụ ezi uche.” (Hosia 4:11) N’ihi gịnị? Mgbe mmanya na-egbu anyị, echiche na ọchịchọ ndị anyị na-agbalị iwepụ n’obi anyị nwere ike iyiwe anyị ihe dị mma—ma ọ bụdị gụwa anyị agụụ. Mkpebi anyị mere ịnọgide na-eme ihe dị mma nwere ike ịnyụ ka ọkụ. Mmanya na-aba n’anya nwere ike ime ka anyị kpaa àgwà ọjọọ, mebie mmekọrịta anyị na Chineke.

Dị ka ihe atụ, Jọn na nwunye ya sere okwu, ya ejirikwa iwe gawa n’ebe a na-aṅụ mmanya. Ọ ṅụọla iko mmanya ole na ole mgbe otu nwaanyị bịakwutere ya. Mgbe Jọn ṅụtụkwuru iko ole na ole, o so nwaanyị ahụ pụọ, ya na ya akwaa iko. Mgbe e mesịrị, Jọn kwara nnọọ ụta na o mere ihe ọ na-agaraghị echetụ echiche ime ma a sị na mmanya emegharịghị ya anya.

Ịṅụ mmanya na-aba n’anya gabiga ókè nwere ike ime ka mmadụ kwuo okwu ma ọ bụ kpaa àgwà n’echeghị echiche. Baịbụl jụrụ, sị: “Ònye na-anọ ná nsogbu mgbe niile? Ònye na-ese okwu ma na-alụ ọgụ? Ọ bụ onye ọ bụla nke na-amụ anya ruo mgbe chi jiri, na-achọ ịṅụkwu naanị otu iko mmanya.” (Ilu 23:29, 30, Contemporary English Version) Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ime ka ị dị “ka onye dina ala n’etiti oke osimiri dịka onye dina n’ụgbọ ikuku na-ebugharị.” (Ilu 23:34, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Onye ṅụbigara mmanya ókè nwere ike iteta n’ụra wee dị ka “onye e merụsịchara ahụ́, n’echetatụghịdị otú o si mee.”—Ilu 23:35, CEV.

Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa. “N’ikpeazụ [mmanya na-aba n’anya] na-ata nnọọ dị ka agwọ, na-atanyekwa elò dị nnọọ ka ajụala.” (Ilu 23:32) Ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike achọpụtala na amamihe dị n’ihe ahụ ilu ochie ahụ kwuru. Mgbe mmanya na-aba n’anya buru oké ibu n’ahụ́, ọ na-aghọ nsí nke nwere ike ịkpata ụdị ọrịa kansa dị iche iche, ịba ọcha n’anya nke mmanya na-akpata, ọrịa imeju bụ́ cirrhosis, ọrịa anyịnya, obi nkụchi, nwaanyị dị ime ịmụ nwa nwere nkwarụ, ọrịa strok, ma ọ bụ na-eme ka shuga dị n’ahụ́ ndị ọrịa shuga belata—iji kpọtụ naanị ole na ole n’ime ihe ndị ọ na-akpata aha. Ịṅụbigakwa mmanya ókè naanị otu ugboro nwedịrị ike ime ka mmadụ tụbọọ ma ọ bụ nwụọ. Ma, ihe kacha njọ ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata abụghị ọrịa nkịtị.

Ihe kacha njọ ọ na-akpata. Ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ịṅụ mmanya, ma ọ gaghị egbu ya egbu, ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata nsogbu ime mmụọ.  Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịga chọọ mmanya na-egbu egbu, ndị na-anọ ruo mgbe chi jiri ka mmanya wee mee ka ahụ́ nwuru ha ọkụ!” N’ihi gịnị? Aịzaya kọwara nsogbu ime mmụọ ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata, sị: “Ha adịghị ele anya n’ihe Jehova na-eme, ha adịghịkwa ahụ ọrụ aka ya.”—Aịzaya 5:11, 12.

Okwu Chineke dụrụ anyị ọdụ ka anyị ghara ịnọ “n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya.” (Ilu 23:20) A dọrọ ndị agadi nwaanyị aka ná ntị ka ha bụrụ “ndị na-adịghị aṅụ oké mmanya.” (Taịtọs 2:3) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-etinyekwu ihe n’iko mmanya ole ha na-aṅụ ma na-aṅụkwa ya ugboro ugboro karị, mgbe mgbe, ha anaghịkwa ama na ha na-eme ya. Mgbe e mesịrị, onye ahụ na-aṅụ oké mmanya nwere ike “ịmụ anya na-ajụ, sị, ‘Olee mgbe chi ga-abọ, ka m nwee ike ịṅụkwu?’” (Ilu 23:35, CEV) Mgbe mmadụ malitere ịchọ mmanya ọ ga-eji saa anya n’isi ụtụtụ iji nwetaghachi onwe ya na nke ọ ṅụrụ n’abalị bọtara ụbọchị ahụ, ọ ghọọla nnọọ onye aṅụrụma.

Baịbụl dọrọ aka ná ntị na ndị na-etinye aka “n’ịṅụ oké mmanya, n’oriri oké mkpọtụ, n’ịma aka n’ịṅụ mmanya . . . ga-aza onye ahụ nke dị njikere ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe ajụjụ.” (1 Pita 4:3, 5) Jizọs dọkwara aka ná ntị banyere oge dị oké egwu nke anyị bi n’ime ya, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị [Jehova] ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.”—Luk 21:34, 35.

Ma, olee ihe ndị na-aṅụbiga mmanya ókè nwere ike ime iji zere ịbụ ndị ‘ịṅụ oké mmanya nyịgburu obi ha’?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 N’isiokwu a, “mmanya na-aba n’anya” na “mmanya” pụtara biya, mmanya nkwụ, mmanya ngwọ, na mmanya ọkụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]

Ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè nwere ike ịkpata ọtụtụ nsogbu