Olee ihe mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ onyinye ndụ ebighị ebi?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Olee ihe mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ onyinye ndụ ebighị ebi?
▪ Baịbụl kwuru na Chineke nyere anyị ohere inweta “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:40) Ma, gịnị kpaliri ya inye anyị olileanya a? Ọ̀ bụ naanị n’ihi ikpe ziri ezi ya?
Ikpe ziri ezi bụ imeso mmadụ ihe otú e kwesịrị isi mesoo ya. Ànyị kwesịrị nnọọ ịdị ndụ? Mba. Baịbụl kwuru, sị: “E nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.” (Ekliziastis 7:20) Mmehie nwere ụgwọ ọrụ. Chineke dọrọ nwoke mbụ, bụ́ Adam, aka ná ntị na n’ụbọchị o mehiere na ọ ga-anwụrịrị. (Jenesis 2:17) Pọl onyeozi mechara si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ya mere, ọ bụrụ na ụmụ Adam niile kwesịrị ịnwụ anwụ n’ezie, olee ihe mere Chineke ji nye ha ohere ịdụ ndụ ebighị ebi?
Ohere ịdị ndụ ebighị ebi bụ “onyinye e nyere [ụmụ mmadụ] n’efu.” Ọ na-egosi otú ịhụnanya Chineke na obiọma ya na-erughịrị mmadụ dịruru ukwuu ma na-eru onye ọ bụla chọrọ ya aka. Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke, a na-akpọkwa ha ndị ezi omume, nke bụ́ onyinye e nyere n’efu, site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.”—Ndị Rom 3:23, 24.
Ọ bụ ezie na anyị niile kwesịrị ọnwụ, Chineke họọrọ inye ndị hụrụ ya n’anya ndụ ebighị ebi. Nke ahụ ọ̀ bụ ikpe na-ezighị ezi? Baịbụl kwuru, sị: “Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Tụfịakwa! N’ihi na ọ gwara Mozis, sị: ‘Onye ọ bụla m kpebiri imere ebere ka m ga-emere ebere, onye ọ bụla m kpebikwara igosi ọmịiko ka m ga-egosi ọmịiko.’ . . . Ònye n’ezie, ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu?”—Ndị Rom 9:14-20.
N’ebe ụfọdụ n’ụwa, onye ọrụ gọọmenti ma ọ bụ ọkàikpe nwere ike ịgbaghara onye omekome nke a tụrụ mkpọrọ ọrụ ahụhụ. Ọ bụrụ na onye omekome ahụ erube isi n’iwu ndị e nyere ya ma kpawa ezi àgwà, ọkàikpe ma ọ bụ onyeisi ala nwere ike ịgbaghara ya site n’ibelata afọ ole ọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụkwanụ gbaghara ya kpamkpam. Mgbaghara a nwere nnọọ ike ịbụ amara na-erughịrị onye ahụ.
N’otu aka ahụ, Jehova nwere ike ikpebi ịghara inye ndị mmehie niile ntaramahụhụ kwesịrị ha. Kama nke ahụ, n’ihi ịhụnanya ya, o nwere ike inye ndị hụrụ ya n’anya ma na-erube isi n’iwu ya ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Ịhụnanya kachanụ Jehova gosiri anyị bụ izite Ọkpara ya ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Jizọs kwuru banyere Nna ya, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
Jehova na-anabatakwa ndị niile hụrụ ya n’anya ma na-eme uche ya, n’agbanyeghị ụdị ndị ha bụ́bu. N’ihi ya, olileanya ndụ ebighị ebi bụ nnọọ obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke gosiri anyị, bụ́ ịhụnanya ya na-enweghị atụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
Ọ bụ nnọọ obiọma na-erughịrị mmadụ, bụ́ ịhụnanya ya na-enweghị atụ