Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Na-emezu Nkwa Ya

Onye Na-emezu Nkwa Ya

Bịaruo Chineke Nso

Onye Na-emezu Nkwa Ya

JỌSHỤA 23:14

Ọ̀ NA-ESIRI gị ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi? Ọ dị mwute na anyị bi n’ụwa ebe ndị mmadụ na-agba ndị tụkwasịrị ha obi mgba okpuru mgbe niile. Ọ bụrụ na onye ị tụkwasịrị obi mere ihe gbawara gị obi, ikekwe, ya abụrụ na ọ ghaara gị ụgha ma ọ bụ ghara imezu nkwa o kwere gị, o nwere ike ị gaghị atụkwasịlikwa ya obi. Ma, e nwere onye i nwere ike ịtụkwasị obi n’akwaghị ụta. Ilu 3:5 gbara anyị ume, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi.” Olee ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee ihe Jọshụa kwuru—bụ́ nwoke ji obi ya niile tụkwasị Jehova obi—nke e dere na Jọshụa 23:14.

Ka anyị tụlee mgbe o kwuru okwu ahụ. Jọshụa, bụ́ onye nọchiri Mozis dị ka onye ndú Izrel, fọrọ obere ka o ruo otu narị afọ na iri. N’ogologo oge niile ahụ ọ dịrị ndụ, o jirila anya ya hụ ọtụtụ ọrụ ebube Jehova rụụrụ ndị Izrel, bụ́ ndị gụnyere ọrụ ebube ọ rụrụ ihe dị ka iri afọ isii tupu mgbe ahụ, nke bụ́ ime ka ha gafere Oké Osimiri Uhie. Ugbu a, Jọshụa tụgharịrị uche n’ihe ndị ahụ merenụ ma kpọkọọ “ndị okenye [Izrel], na ndị isi ha na ndị ikpe ha na ndị ndú ha.” (Jọshụa 23:2) Okwu ndị ọ na-aga ịgwa ha ugbu a abụghị naanị okwu gosiri amamihe o nwere n’ihi ọtụtụ afọ ọ dịrịla ndụ, kama, ọ bụ okwu na-egosi okwukwe siri ike o nwere n’ihi ihe ndị ọ tụgharịrị n’uche.

Jọshụa kọwaara ha, sị: “Ọ bụ ọnwụ na-echezi m ihu taa.” E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Jọshụa na-ekwu, sị, “M ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.” Ebe Jọshụa maara na oge ọnwụ ya eruwela, ọ ga-abụ nnọọ na o wepụtara ọtụtụ awa chebara ndụ ya echiche. Olee okwu ikpeazụ o nwere ịgwa ndị ya na ha na-efekọ Jehova?

Jọshụa gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.” Ihe ahụ bụ okwu nwoke tụkwasịrị nnọọ Chineke obi. Olee ihe mere o ji kwuo ya? Mgbe Jọshụa chere echiche banyere ihe niile ọ hụrụla, ọ ghọtara na Jehova na-emezu nkwa Ya mgbe niile. * Ihe okwu Jọshụa pụtara doro anya: Jọshụa chọrọ ka ndị Izrel ibe ya kwenyesie ike na nkwa niile Jehova kwere ha maka ọdịnihu ga-emezukwa.

Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na Baịbụl kwuru banyere Jọshụa 23:14, sị: “Wepụta nkwa niile dị na Baịbụl; chọzie n’akwụkwọ akụkọ ihe mere eme ndị e nwere n’ụwa; jụọkwa ihe niile e kere eke nọ n’ime ya, iji hụ ma ị̀ ga-achọta otu nkwa Chineke kwere nke ọ na-emezughị ma ọ bụ nke o chefuru.” A sị na anyị ga-emeli ụdị nnyocha ahụ, anyị ga-achọpụta otu ihe ahụ Jọshụa chọpụtara, ya bụ, Nkwa Jehova na-emezurịrị.—1 Ndị Eze 8:56; Aịzaya 55:10, 11.

Baịbụl kọrọ banyere nkwa ndị Chineke kwere bụ́ ndị mezurulanụ, tinyere ụfọdụ ndị na-emezu n’ihu anyị taa. Ọ kọkwara banyere nkwa ndị magburu onwe ha Jehova kwere anyị maka ọdịnihu. * Ọ́ gaghị adị mma ka i nyochaa ha n’onwe gị? Ịmụ Baịbụl ga-eme ka i kwenyesie ike na anyị kwesịrị ịtụkwasị Onye Na-emezu Nkwa obi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lekwa ụfọdụ n’ime nkwa ndị Jọshụa hụrụ mgbe ha mezuru. Jehova ga-enye ndị Izrel ala nke ha. (Jiri Jenesis 12:7 tụnyere Jọshụa 11:23.) Jehova ga-anapụta ndị Izrel n’Ijipt. (Jiri Ọpụpụ 3:8 tụnyere Ọpụpụ 12:29-32.) Jehova ga-elekọta ndị ya.—Jiri Ọpụpụ 16:4, 13-15 tụnyere Diuterọnọmi 8:3, 4.

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọọ ịmatakwu banyere nkwa ndị Chineke kwere maka ọdịnihu, gụọ isi nke 3, 7, na nke 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.