Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ Eziokwu Banyere Eluigwe

Ịchọ Eziokwu Banyere Eluigwe

Ịchọ Eziokwu Banyere Eluigwe

ICHE echiche ịga eluigwe nwere nnọọ ike ime mmadụ obi ụtọ! Ndị Alakụba, ndị Hindu, ndị Buda, ndị chọọchị Krisendọm, na ọtụtụ ndị na-enwedịghị mmasị n’okpukpe kwechaara na mmadụ na-adị ndụ mgbe ọ nwụchara. A na-elekarị eluigwe anya dị ka ebe mara mma na ebe a na-ekpori ndụ, bụ́ ebe ndị mmadụ na-agaghị ata ahụhụ nakwa ebe ha na “ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-ahụ ọzọ.” N’agbanyeghịkwa nke ahụ, n’ebe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nọ, ilu ochie a bụ eziokwu: Onye ọ bụla chọrọ ịga eluigwe, ma o nweghị onye chọrọ ịnwụ iji gaa ebe ahụ. Olee ihe mere o ji dị otú ahụ?

A sị na e kere anyị ịnwụ ma gawa eluigwe, ọ́ gaghị na-agụkwu ọtụtụ ndị agụụ otú ahụ o si agụ nwatakịrị agụụ ito eto na otú o si agụ nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Ma, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ achọghị ịnwụ anwụ.

N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ụkọchukwu na-ekwu na eluigwe bụ ebe e kere anyị ibi ma anyị nọtụchaa obere oge n’ụwa. Dị ka ihe atụ, a sịrị na Tiodọ Edga Kadinal MakKarik, bụ́ achịbishọp nke Wọshịntịn Diisi nke larala ezumike nká, kwuru, sị: “Ụdị ndụ anyị dị ugbu a abụghị ihe mere e ji kee anyị. E kere anyị ibi n’eluigwe.” N’otu aka ahụ, onye bụ́bu president nke Òtù Ndị Ụka Mgbasa Ozi Ọma nke Mba Amerịka, kwuru, sị: “Ihe mere anyị ji dịrị ndụ bụ inye Chineke otuto na ịga eluigwe . . . n’ihi na eluigwe bụ ụlọ anyị.”

Ndị kweere na mmadụ na-aga eluigwe mgbe ọ nwụchara na-ekwerekarị ya n’ihi na ha amachaghị ihe banyere eluigwe. Jọọjị Bana, bụ́ president nke otu ụlọ ọrụ na-enyocha nkụzi okpukpe, chọpụtara na ihe ọtụtụ mmadụ kweere banyere “ndụ a na-adị ugbu a na mgbe a nwụchara” si n’ebe dị iche iche, dị ka na fim, egwú na akwụkwọ ọgụgụ. E kwuru na otu pastọ chọọchị Episkopal na Flọrịda, kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe anyị maara banyere eluigwe ma ọ́ bụghị na eluigwe bụ ebe Chineke bi.”

Ma, eluigwe bụ ebe dị mkpa e kwuru okwu ya na Baịbụl. Olee otú Okwu Chineke kwuru na eluigwe dị? È kere mmadụ ibi n’eluigwe? Ọ bụrụ na ọ dị ndị ga-aga eluigwe, olee ihe ha na-aga ime?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Olee ihe mere ọtụtụ mmadụ ji achọ ịga eluigwe, ma ya abụrụ naanị mmadụ ole na ole chọrọ ịnwụ iji gaa ebe ahụ?