Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ọma Niile Hà Ga-aga Eluigwe?

Ndị Ọma Niile Hà Ga-aga Eluigwe?

Ndị Ọma Niile Hà Ga-aga Eluigwe?

MGBE Jizọs na ndịozi ya richara nri ikpeazụ n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya, o kwere ha nkwa na ha ga-ebi n’eluigwe. O kwuru, sị: “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị. Ma ọ́ bụghị otú ahụ, m gaara agwa unu, n’ihi na m na-aga ịkwadebere unu ebe.” (Jọn 14:2) Olee ihe mere Jizọs ga-eji nye ha ụlọ n’eluigwe? Olee ihe ha ga na-eme ebe ahụ?

Jizọs nwere ọrụ pụrụ iche ọ ga-enye ndị na-eso ụzọ ya. N’otu abalị ahụ, o kwuru, sị: “Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ.” (Luk 22:28, 29) Chineke kwere Jizọs nkwa na ọ ga-abụ Eze nke ga-enye ụmụ mmadụ otu n’ime ihe kacha ha mkpa, ya bụ, ezi ọchịchị. Jizọs ga-anapụta ndị na-ata ahụhụ ma bibie ndị na-erigbu ha. Ọ bụ ezie na ndị Jizọs ga-achị ga-ebi n’ebe niile “ruo na nsọtụ ụwa,” ocheeze ya ga-adị n’eluigwe.—Abụ Ọma 72:4, 8; Daniel 7:13, 14.

Ma, Jizọs agaghị achị naanị ya. N’ihi ya, o kwere ndịozi ya nkwa na ha ga-ebi n’eluigwe. Ha bụ ndị mbụ a họọrọ ‘ịchị ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:10.

Mmadụ ole ga-aga eluigwe? Dị ka ọ na-adị n’ọchịchị ọ bụla, ndị ọchịchị Alaeze eluigwe nke Chineke dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere ndị ha ga-achị. Jizọs gwara ndị ga-eso ya achị, sị: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” (Luk 12:32) “Ìgwè atụrụ nta” ahụ ga-emecha dịrị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpughe 14:1) Ọnụ ọgụgụ ahụ dị obere ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ nde ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi Alaeze ahụ ga-achị.—Mkpughe 21:4.

N’ihi ya, ọ bụghị ndị ọma niile ga-aga eluigwe. Pita onyeozi kwuru hoo haa banyere Eze Devid, sị: “Devid arịgoghị n’eluigwe.” (Ọrụ 2:34) Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ ezigbo mmadụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru ihe gosiri na a gaghị ebuli ya elu ịghọ eze n’eluigwe. Jizọs kwuru, sị: “N’etiti ndị ụmụ nwaanyị mụrụ, ọ dịbeghị onye e mere ka o bilie nke ka Jọn Onye Na-eme Baptizim ukwuu; ma onye ka nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwuu.”—Matiu 11:11.

Ị̀ Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ A Ga-akwụ Ndị Ọma?

Iji nweta ụgwọ ọrụ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, olee ihe mmadụ na-aghaghị ime? Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ị̀ hụrụ na Chineke hụrụ nnọọ ụwa n’anya nke na o mere ka o kwe mmadụ niile omume inweta ndụ ebighị ebi, ma, ọ bụ naanị ndị “nwere okwukwe” ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ.

Ọ dị mkpa ka okwukwe anyị dabere n’ezi ihe ọmụma. (Jọn 17:3) I nwere ike igosi na ị bụ ezi mmadụ site n’ịmụkwu banyere ihe Jehova zubeere ụmụ mmadụ. Jiri okwukwe mee ihe ndị ị mụtara. Obi siekwa gị ike na ị ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ajụjụ:

Olee ihe na-eme ndị ọma mgbe ha nwụrụ?

Azịza:

“Ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”EKLIZIASTIS 9:5.

Ajụjụ:

Olee olileanya ndị ezi mmadụ nwere maka ọdịnihu?

Azịza:

“Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.”JỌN 5:28, 29.

Ajụjụ:

Olee ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị ezi mmadụ ga-ebi?

Azịza:

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”ABỤ ỌMA 37:29.