Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe mere Jizọs ji kwuo na ‘ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya mere ochie’?

A na-agbanyekarị mmanya na karama akpụkpọ anụ n’oge Baịbụl. (Jọshụa 9:13) A na-eji akpụkpọ zuru ezu nke anụ ụlọ ndị dị ka nwa atụrụ ma ọ bụ ewu eme karama akpụkpọ mmanya. Iji mee karama akpụkpọ mmanya, a na-egbupụ isi na ụkwụ nke anụmanụ nwụrụ anwụ ma jiri nwayọọ wepụtasịa anụ na ihe ndị ọzọ dị n’ime ya n’abọghị ya abọ. A na-eme akpụkpọ anụ ahụ ka ọ kwọọ mụrụmụrụ ma dụchie ebe niile ghere oghe ma e wezụga olu ya ma ọ bụ otu ụkwụ ya, bụ́ nke a na-ahapụ ka ọ bụrụ ọnụ ya. E nwere ike ime okwuchi a ga-eji na-emechi ọnụ ya ahụ ma ọ bụ jiri eriri kee ya.

Ka oge na-aga, akpụkpọ anụ ahụ ga-abịa sie ike ma kwụsị ịdọ adọ. N’ihi ya, a naghị agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ochie, ebe ọ bụ na mmanya ahụ ka na-eko eko. Okuko ahụ ọ na-eko nwere ike ịgbawa karama akpụkpọ mmanya ochie ahụ. Ma, karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ na-adọ adọ karị, mmanya ọhụrụ na-eko eko agaghịkwa agbawa ya. N’ihi ya, ihe ahụ Jizọs kwuru bụ ihe a maara nke ọma n’oge ya. O kwuru ihe ga-emenụ ma ọ bụrụ na mmadụ etinye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ochie: “Mmanya ọhụrụ ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ mmanya ahụ, ọ ga-awụfusikwa, karama akpụkpọ mmanya ahụ ga-alakwa n’iyi. Kama a ghaghị ịgbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ.”—Luk 5:37, 38.

Olee ndị bụ́ “ndị ji mma daga” a kpọtụrụ aha mgbe a na-ekwu banyere njide ndị Rom jidere Pọl?

Ọrụ Ndịozi kọrọ na otu mgbe e nwere ọgba aghara n’ụlọ nsọ Jeruselem, otu ọchịagha ndị Rom nwụchiri Pọl onyeozi n’ihi na o chere na ọ bụ onyeisi nke “puku ndị ikom anọ ndị ji mma daga,” bụ́ ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru. (Ọrụ 21:30-38) Olee ihe anyị maara banyere ndị a ji mma daga?

Okwu Grik a sụgharịrị “ndị ji mma daga” si n’okwu Latin bụ́ sicarii, nke pụtara “ndị na-eji sica,” ma ọ bụ daga. Fleviọs Josifọs, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ kọwara ndị Sikari dị ka ìgwè ndị Juu hụrụ mba ha n’anya, ajọ ndị iro ndị Rom, bụ́ ndị na-eji akọ egbu ndị mmadụ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Josifọs kọrọ na ndị Sikari “na-egbu ndị mmadụ n’ehihie ọcha, nakwa n’ime obodo; ha na-emekarị nke a n’oge ememme, bụ́ mgbe ha na-abata n’etiti ìgwè mmadụ ma zoo daga ha n’ime uwe ha, bụ́ nke ha na-eji ama ndị iro ha.” Mgbe ndị ha mara daga dara nwụọ, ndị Sikari na-eme ka ndị iwe ji n’ihi ndị ahụ e gburu, ọ dịghịkwa onye ga-ama na ọ bụ ha gburu onye ahụ. Josifọs kwukwara na mgbe e mechara, ndị Sikari bu isi ahụ ndị Juu nupụụrụ ndị Rom n’afọ 66-70 O.A. n’isi. N’ihi ya, ọchịagha Rom ahụ ga-achọ nnọọ ịkpọchi onye a sịrị na ọ bụ onyeisi òtù dị otú ahụ.

[Foto dị na peeji nke 15]

Karama akpụkpọ mmanya ochie

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe osise nke onye ji mma daga