Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa ọ̀ ga na-emepụta nri ga-ezuru ndị bi na ya mgbe niile?

Ụwa ọ̀ ga na-emepụta nri ga-ezuru ndị bi na ya mgbe niile?

NDị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ụwa ọ̀ ga na-emepụta nri ga-ezuru ndị bi na ya mgbe niile?

▪ Ụwa anyị mara mma nwere nnọọ ike imepụta ihe oriri ga-ezuru mmadụ niile bi na ya. Ma, n’ihi otú ndị mmadụ si na-amụba n’ike n’ike na otú e si na-erikpọ nnukwu akụ̀ ndị dị n’ụwa ọkụ ọkụ, i nwere ike ịnọ na-ajụ, sị: ‘Ihe ahụ a na-atụ ụjọ ya ọ̀ ga-emecha mee? Nri ụwa na-emepụta na akụ̀ ndị dị na ya hà ga na-ezuru anyị mgbe niile?’

Mgbe anyị na-eche banyere ajụjụ a, nkwa a Chineke kwere ụmụ mmadụ ihe karịrị puku afọ anọ gara aga nwere ike ime ka obi sie anyị ike: “Ruo ụbọchị niile ụwa ga-adịgide, ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi, na oyi na okpomọkụ, na ọkọchị na udu mmiri, na ehihie na abalị, agaghị akwụsị akwụsị ma ọlị.” (Jenesis 8:22) N’ihi ya, dị nnọọ ka anyị ji n’aka na anyanwụ ga-awa kwa ụbọchị, anyị nwekwara ike iji n’aka na ụwa agaghị akwụsị imepụta ihe dị mkpa iji nyejuo ndị bi na ya afọ.

N’otu akụkọ e dere n’afọ 2004, nke isiokwu ya bụ “Mbara Ụwa Anyị Ọ̀ Ga-enyeli Anyị Nri?” Aleks Kebi, bụ́ onye nta akụkọ na-akọ banyere mbara ụwa, kwuru, sị: “Ụwa na-emepụta nri ga-ezuru onye ọ bụla. Ma, nri ahụ na-agakarị n’ebe na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ ya adị ezigbo oké ọnụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nweghị ike ichekwaru ya otú o kwesịrị. Ya mere, ịhụ na onye ọ bụla nwere nri ga-ezuru ya dị n’aka ndị ọchịchị karịa ka ọ dị n’aka ndị ọkà mmụta sayensị.” Ọ bụrụ na e lekọta ụwa anya nke ọma ma jiri ihe ndị ọ na-emepụta mee ihe nke ọma, o nweghị ihe ga-eme ka anyị tụwa ụjọ na ihe ọ na-emepụta agaghị ezu. Dị ka ihe atụ, n’oge ụmụ Izrel oge ochie, Chineke nyere ntụziaka doro anya banyere otú ha kwesịrị isi jiri ala na-eme ihe. Dị ka e dere na Levitikọs 25:4, Chineke gwara ndị Izrel, sị: “N’afọ nke asaa, ala ga-ezu nnọọ ike . . . Unu agaghị agha mkpụrụ n’ubi unu.” Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel agaghị agha mkpụrụ n’ubi ha kwa afọ asaa, Chineke kwere nkwa na ya ga-ahụ na ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ọtụtụ ezi ihe ha ga-enwe nakwa na ụjọ agaghị atụ ha na ha ga-aba n’ụkọ.—Levitikọs 26:3-5.

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ji ezi obi na-agbalị imezi ụwa na ihe ndị dị na ya e mebiri emebi, ọtụtụ ndị chere na mgbalị ndị dị otú ahụ bịara n’azụ oge. E kwuru naanị ihe ga-agwọta nsogbu ahụ kpamkpam ná Mkpughe 11:18. N’ebe ahụ Baịbụl kwuru na Jehova gaje “ibibi ndị na-ebibi ụwa.” Ọ bụghị naanị na Jehova ga-akwụsị mmebi a na-emebi ụwa na ihe ndị dị na ya, kamakwa, ọ ga-ahụ na ụwa ga na-emepụtara ndị niile bi na ya nri n’ụba. A ga-ewepụ ndị niile na-agba nzube Chineke ụkwụ na ndị niile na-emebi ụwa maka ọdịmma nke onwe ha. N’aka nke ọzọ, ndị ji obi ha niile na-akwado ọchịchị Jehova ga-ahụ mgbe a ga-emezu ihe a e dere n’Abụ Ọma 72:16: “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”

N’ihi ịhụnanya na amamihe miri emi Jehova nwere, o zubere na ụmụ mmadụ ga-ebi n’ebe obibi ha, bụ́ ụwa paradaịs, ma lekọta ya anya. (Jenesis 1:28) Mgbe ọchịchị ya ga-amalite, ụmụ mmadụ na-erube isi ga-amụta iji ihe ndị ụwa na-emepụta eme ihe nke ọma, n’emebighị akụ̀ ndị dị n’ụwa. Anyị na-ekele nnọọ Onye a hụrụ anyị n’anya bụ́ Onye ga-ewere ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ!—Abụ Ọma 145:16.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

“Ịhụ na onye ọ bụla nwere nri ga-ezuru ya dị n’aka ndị ọchịchị karịa ka ọ dị n’aka ndị ọkà mmụta sayensị”