Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke?

Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke?

Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke?

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—2 TIMOTI 3:16, 17.

IHE A Pọl onyeozi kwuru gosiri nnọọ na Baịbụl bara ezigbo uru! N’ezie, ọ na-ekwu kpọmkwem banyere akwụkwọ Baịbụl ndị e nwere n’oge ya, bụ́ ihe odide ndị mmadụ na-akpọ Agba Ochie mgbe ụfọdụ. Ma, ihe o kwuru metụtakwara nnọọ akwụkwọ iri isii na isii niile dị na Baịbụl, tinyere ndị nke ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi dere na narị afọ mbụ Oge Anyị.

Ì ji Baịbụl kpọrọ ihe otú ahụ Pọl ji ya kpọrọ? Ì chere na ndị dere Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee ya n’ezie? Ndị Kraịst narị afọ mbụ kweere otú ahụ. Ha akwụsịghị ikwere ya n’ọtụtụ narị afọ sochirinụ. Dị ka ihe atụ, ụkọchukwu bụ́ onye Ịngland nke dịrị ndụ na narị afọ nke iri na anọ, bụ́ Jọn Wiklif, weere Baịbụl dị ka “ụkpụrụ eziokwu nke e kwesịrị ịtụkwasị obi.” Mgbe akwụkwọ bụ́ The New Bible Dictionary na-ekwu banyere okwu Pọl e dere n’elu, o kwuru na “ebe ọ bụ na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ [Chineke], ihe niile o kwuru bụ eziokwu.”

Otú E Si Ele Baịbụl Anya Agbanweela

Ma n’oge ndị na-adịbeghị anya, ndị mmadụ akwụsịwala iwere Baịbụl dị ka o kwuchaa o bie. Akwụkwọ bụ́ The World’s Religions kwuru, sị: “Ndị Kraịst niile [ka] na-ekwu na ha weere Baịbụl dị ka o kwuchaa o bie n’ihe banyere àgwà na ozizi ha.” Ma, a bịa n’omume, nke ahụ abụkwaghị nnọọ eziokwu. Ọtụtụ ndị na-elezi Baịbụl anya naanị dị ka “ọdịnala ụmụ mmadụ nke a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi.” Ọ bụ ezie na ha kweere na ndị dere Baịbụl bụ nnọọ ndị na-atụ egwu Chineke, ha weere ha naanị dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị nwara ịkọwa eziokwu ndị dị omimi banyere Chineke, ma bụrụ ndị na-emepeghị anya otú anyị mepere taa.

N’eziokwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole taa na-ekwe ka Baịbụl duzie echiche ha na omume ha. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ na ị nụbeghị ọtụtụ ugboro ebe ndị mmadụ na-ekwu na iwu Baịbụl banyere omume emeela ochie nakwa na ha abakwaghị uru? Ọ naghị enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi ịgwagbu iwu na ụkpụrụ Baịbụl—ma ọ bụ ọbụna ileghara ha anya kpamkpam mgbe ha chere na ọ ga-eme ka ha nweta ihe ha chọrọ. Ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-eleghara nnọọ ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwa iko, emeghị ihe n’eziokwu, na ịṅụbiga mmanya ókè, anya.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

Olee ihe mere o ji dị otú a? Ná mmalite narị afọ nke iri abụọ, otu onye na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie bụ́ Saa Chals Mastịn kọwara otu ihe kpatara ya n’akwụkwọ ya bụ́ The Bible Is True. O kwuru na ndị mmadụ mere nnọọ ngwa ngwa “ikwere n’ajụghị ase ọtụtụ nkọ ndị edemede ọgbara ọhụrụ kọrọ,” bụ́ ndị gbara ihe ndị Baịbụl kwuru ụkwụ. Nke ahụ ò nwere ike ịbụ ihe ka na-eme taa? Olee otú i kwesịrị isi lee echiche na ozizi ndị ọkà mmụta na-ekwugide Baịbụl anya? Gụọ ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu banyere nke a.