Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Afrịka

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Afrịka

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Afrịka

MBA OLE DỊ NA YA: 57

MMADỤ OLE BI NA YA: 878,000,158

NDỊÀMÀ JEHOVA OLE NỌ NA YA: 1,171,674

MMADỤ OLE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL NA YA: 2,382,709

JEHOVA na-enye ndị nọ n’ebe niile onyinye magburu onwe ya, ya bụ, ozi ọma banyere Alaeze ya. Anyị bụ́ ndị nabatarala onyinye ahụ na ndị hụrụ Jehova n’anya nwere ihe ùgwù nke ịkọrọ ya ndị ọzọ. Ka anyị na-eme nke ahụ, anyị na-enwe ọṅụ n’ihi na anyị na-eme ma Onye nyere onyinye ahụ ma ndị nabatara ya obi ụtọ. N’ezie, ikwusa ozi ọma bụ ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Matiu 22:37-40) Na peeji a na nke na-eso ya, ị ga-ahụ otú ndị Jehova si na-egosi ịhụnanya ahụ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile n’Afrịka.

Binin Klọd na nwunye ya, bụ́ Marị-Kle, ejirila ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ala ọzọ afọ iri abụọ na asaa. Na Febụwarị, Marị-Kle dara ada ma gbajie ụkwụ. Ka izu abụọ gasịrị, mgbe Klọd na-arụ ọrụ n’ebe obibi ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, ọ dara ma gbajie ụkwụ. E kere ha abụọ ihe n’ụkwụ, Marị-Kle n’ụkwụ aka nri ya, Klọd n’ụkwụ aka ekpe ya. Klọd ji ihe ahụ mere ha mee ihe ọchị, sị: “Ọ na-amasị anyị mgbe niile imekọ ihe ọnụ!”

Ihe e kere Klọd n’ụkwụ na-ekwetụ ya ịga ije, ma nke Marị-Kle ekweghị ya pụọ èzí ruo ọtụtụ izu. Ọ bụ ezie na o mere ndokwa ịnọ n’ebe obibi ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-eduzi ọmụmụ Baịbụl anọ n’ime iri na abụọ ọ na-eduzi, ụzọ ndị ọzọ anyị si ezisa ozi ọma nọ na-agụkwa ya agụụ. N’ihi ya, o kpebiri iburu oche nọrọ na tebụl akwụkwọ juru n’elu ya n’ihu ebe obibi ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ ma na-agwa ndị na-agafe agafe okwu. Na Mach, oge niile ọ nọrọ na tebụl ahụ kwusaa ozi ọma dị iri awa asatọ na atọ. Jehova ọ̀ gọziri mgbalị ahụ o mere? N’ọnwa ahụ, o nyere ndị mmadụ akwụkwọ iri na anọ, narị broshuọ anọ na iri ise na abụọ, narị magazin abụọ na iri itoolu, nyekwa ihe karịrị narị traktị ise.

Itiopia Arega, bụ́ onye bi n’otu ime obodo dịpụrụ adịpụ, kpebiri iji akwụkwọ nyachie ahụ́ ụlọ ya. Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ ndị na-eji eme ya n’obodo ya bụ akwụkwọ akụkọ, ọ chọrọ iji akwụkwọ nwere àgwà dị iche iche mee nke ya. N’ahịa, ọ hụrụ ebe otu nwoke na-enye ndị mmadụ broshuọ bụ́ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! Arega natara ya akwụkwọ ahụ, dọpụtasịa peeji ya ozugbo ọ laruru ma nyaa ha n’ahụ́ ụlọ ya. Ka afọ abụọ gasịrị, ọ hụrụ okwu ndị a “n’akwụkwọ ahụ ọ nyara n’ahụ́ ụlọ ya”: “Jisus bụ Ọkpara Chineke.” Nke a dị iche n’ozizi Atọ n’Ime Otu dị omimi a kụziiri ya. Ebe ihe ahụ Arega gụtara kpaliri mmasị ya, o ji ụkwụ gaa awa itoolu iji ruo n’obodo ha na ha gba ma chọta ndị na-asị na Chineke nwere Ọkpara. Ọ hụghị ha na nke mbụ ọ gara, o jikwa obi ọjọọ lọta. Mgbe e mechara, ọ gara ọzọ, ma na nke ugbu a ndị mmadụ gosiri ya ụlọ nwanna ahụ nyere ya broshuọ ahụ. E lekwara Arega ule ma ọ̀ ga-anọgide ná mkpebi o mere ịhụ nwanna ahụ n’ihi na o chere ọtụtụ awa tupu nwanna ahụ alọta ebe ọ gara. Ya na ya malitere ịmụ Baịbụl. N’ọnwa ndị sochirinụ, Arega gakwara ebe ahụ ugboro ugboro iji mụtakwuo banyere Chineke. Mgbe ọ kọọrọ ndị ọzọ nọ n’obodo ya ihe ndị ọ na-amụta, ọtụtụ ndị megidewere ya, ọtụtụ ndị malitekwara ize ya eze. Ma, ike agwụghị ya, ndị ọzọ bịakwara nwewe mmasị. Mgbe ọnụ ọgụgụ ndị nwere mmasị ruru iri na atọ, e zigara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ, ma ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma oge niile, n’ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ha malitere iduzi ọmụmụ Baịbụl iri anọ, ihe dịkwa ka mmadụ iri anọ na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. E nweziri mmadụ asatọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’obodo ahụ. Ihe osise ndị ahụ nwanna ọhụrụ anyị ahụ mapawara n’ahụ́ ụlọ ya abụkwaghị naanị ihe ịchọ mma.

Gana N’ihi otú ekwe ntị si na-agbasa ebe niile n’Afrịka, ndị mmadụ na-ekwu na e nwewela “nnukwu mgbanwe n’ihe banyere nzirịta ozi.” Iji gbaa ndị nwere ekwe ntị ume ịzụ kaadị nzirịta ozi ha, ọtụtụ ụlọ ọrụ ekwe ntị na-enye ndị nwere ekwe ntị ohere ịkpọ fon n’oge ụfọdụ n’abalị n’efu. Otu nwanna anyị nwaanyị aha ya bụ Gres ji ohere a mee ihe nke ọma. O siiri ya ike iduziri Mọnika, bụ́ onye ọ na-amụrụ Baịbụl, ihe n’ihi na Mọnịka na-eji ihe ndị ọzọ n’aka mgbe niile. Gres mere ihe niile o nwere ike ime iji hụ na ọmụmụ ihe ahụ gara n’ihu, ọbụna mee ndokwa ịga na nke Mọnịka n’elekere ise nke ụtụtụ. Ma, ọrụ Mọnịka gbanwere, oge a adịkwadịghịrị ya mma maka ọmụmụ ihe. Gres cheziri echiche banyere ịmụrụ ya ihe n’oge ahụ a na-akpọ fon n’efu n’abalị. Mọnịka kwetara, ha emeekwa ndokwa iji ekwe ntị amụ ihe n’elekere anọ nke ụtụtụ. Ike gwụrụ ha mgbe ha chọpụtara na ọtụtụ ndị na-amalitela ịkpọ fon n’oge ahụ nakwa na ọ na-esiri ha ike inweta onwe ha na fon n’oge ahụ. N’ihi ya, ha kpebiri ibilitekwu n’oge iji nwee ike ịmụ ihe n’elekere atọ nke ụtụtụ, n’agbanyeghị na nke a siiri ha abụọ, bụ́ ụmụ nwaanyị ji ụmụ ma na-arụ ọrụ, ike. Gres kwuru, sị: “M kpekuru Jehova ekpere ma rịọ ya ka o nye m ike na ọchịchọ ịnọgide na-enyere onye ahụ m na-amụrụ Baịbụl aka ka mmasị ya ghara ịjụ oyi. M mere ka mgbịrịmgba ekwe ntị m na-akpọte m ma na-agbalịsi ike ibili mgbe ahụ. Ọ bụ ezie na ike na-agwụcha m, anaghị m ekwe ka nke ahụ kụda m aka.” Obi dị ya nnọọ ụtọ ná mgbalị ahụ o mere, n’ihi na o ji anya ya hụ mgbe a na-eme Mọnịka baptizim ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu” nke Ndịàmà Jehova nke afọ 2008! Na nso nso a, Gres ejirikwala oge ahụ a na-akpọ fon n’efu n’abalị duziere otu nwaanyị ọmụmụ Baịbụl, bụ́ onye maliterela ịbịa ọmụmụ ihe.

Mozambik N’Ọgọst 2008, otu kootu si n’ụgbọala na-agbafe agbafe dapụ ma daba n’apịtị dịdebere ụlọ otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye. Nwanna nwaanyị ahụ tụtụliri kootu ahụ ma chọpụta na akwụkwọ dị iche iche, obere akpa atọ ọla ịchọ mma dị iche iche dara oké ọnụ dị n’ime ha, na ego fọrọ obere ka o ruo otu narị puku naịra na puku naịra iri ise dị n’ime akpa kootu ahụ. O siri ọnwụ ka otu onye nọ n’obodo ahụ kpọọ nọmba fon ndị dị n’akwụkwọ ndị ahụ ma gwa onye zaranụ na ọ dị ihe ya furunụ. Ná mgbede ahụ, mmadụ anọ ji otu obere ụgbọala bịa. N’ihu ndị isi obodo ahụ, nwanna anyị nwaanyị nyeghachiri onye nwe kootu ahụ kootu ahụ, ọkọ akọkwaghị ihe ọ bụla dị n’ime ya. Nwoke ahụ malitere ibe ákwá ma kwuo na a sị na ọ dabara n’aka onye ọzọ na-abụghị Onyeàmà Jehova, na ya echeghị na ya ga-ahụ ya ọzọ. N’agbanyeghị na nwanna anyị nwaanyị a kwesịrị ntụkwasị obi dara ogbenye, ọ gbara àmà n’obodo ya bụ́ nke wetaara aha Chineke ya, bụ́ Jehova, ezigbo otuto.