Njem Ụgbọ Mmiri Ndị Oge Ochie Mere Gafee Oké Osimiri Mediterenian
Njem Ụgbọ Mmiri Ndị Oge Ochie Mere Gafee Oké Osimiri Mediterenian
Taa, o nweghị oké ihe ọ bụụrụ ndị mmadụ ịbanye ụgbọelu si n’otu kọntinent gaa n’ọzọ. Ọ̀ ga-eju gị anya ịnụ na ọbụna n’oge Baịbụl, ndị mmadụ mere njem gaa ebe ndị dị anya?
IHE dị ka otu puku afọ tupu oge Kraịst, Eze Sọlọmọn rụrụ ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị ha na ndị nke eze Taya na-eso esi ebe dị anya ebute ihe ndị dị oké ọnụ ahịa n’Izrel. (1 Ndị Eze 9:26-28; 10:22) Na narị afọ nke itoolu T.O.A. (Tupu Oge Anyị), n’ọdụ ụgbọ mmiri oké osimiri Mediterenian dị na Jọpa n’Izrel, Jona onye amụma banyere ụgbọ mmiri na-aga Tashish. * (Jona 1:3) Na narị afọ mbụ O.A. (Oge Anyị), Pọl onyeozi ji ụgbọ mmiri mee ogologo njem site na Sesaria dị n’Izrel gaa Putiolaị, bụ́zi Pọtswọli, nke dị n’Ọnụ Mmiri Nepụls, Ịtali.—Ọrụ 27:1; 28:13.
Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme maara na n’oge Pọl, ndị ahịa si n’ógbè Mediterenian na-eme njem ugboro ugboro site n’Oké Osimiri Uhie gaa India, nakwa na ụfọdụ n’ime ha rudịrị Chaịna ka ọ na-erule n’etiti * Ma, olee ihe anyị maara banyere njem ụgbọ mmiri ndị e mere n’oge gboo gafee Oké Osimiri Mediterenian gawa n’ebe ọdịda anyanwụ? Olee ebe ndị ọkwọ ụgbọ mmiri oge ochie garuru n’ebe ọdịda anyanwụ?
narị afọ nke abụọ.Njem Ndị Finishia Ji Ụgbọ Mmiri Mee n’Oge Gboo
Ọtụtụ narị afọ tupu oge Pọl, ndị na-eme njem ụgbọ mmiri ewuola ógbè azụmahịa dị iche iche n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. E kweere na ndị Finishia, bụ́ ndị ala nna ha bụ obodo Lebanọn oge a, ruru Oké Osimiri Atlantik ka ọ na-erule afọ 1200 T.O.A. N’ihe dị ka 1100 T.O.A., ha wuru obodo Geda, nke bụ́zi obodo ndị Spen nwere ọdụ ụgbọ mmiri a na-akpọ Kediz, ma a gafetụ osimiri dị warara nke Jibrọlta. Ọlaọcha ndị e gwutere n’ebe ahụ na ihe ndị e ji emepụta gbamgbam, nke ndị ahịa na-agba n’Oké Osimiri Atlantik na-ebubata, so ná ngwá ahịa ndị a na-enwe n’ebe ahụ.
Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Hirọdọtọs dere na na narị afọ nke asaa T.O.A., Fero Niko nke Ijipt rụrụ ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị Finishia, bụ́ ndị ndị Finishia na-akwọrọ ya, n’elu elu Oké Osimiri Uhie. Nzube ya bụ ịhụ na ha gbara Afrịka gburugburu malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ.
Ka ọ na-erule n’oge ahụ, ndị Finishia agbaala n’osimiri ndị dị n’Afrịka ọtụtụ narị afọ. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ihi ajọ ifufe na ebili mmiri, ọ ga-esiri ọkwọ ụgbọ mmiri ọ bụla gawara ebe ndịda nke Ụsọ Oké Osimiri Atlantik nke Afrịka ike ịgate aka. Hirọdọtọs kwuru na na njem ọhụrụ a, ndị Finishia malitere n’Oké Osimiri Uhie ma si n’ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ Afrịka gawa n’ebe ndịda iji banye n’Oké Osimiri India. Ka ọ na-erule ihe dị ka etiti afọ ahụ, ha kwụsịrị, kụọ mkpụrụ, nọruo mgbe ha ghọọrọ ihe ndị ha kụrụ, ma kwọrọkwa ụgbọ ha gawa. Hirọdọtọs kwuru na n’afọ nke atọ, ha gara Afrịka gburugburu, banye na Mediterenian, lọghachikwa Ijipt.
Hirọdọtọs pịachiri akụkọ ya site n’ikwu na ndị Finishia kọrọ ihe ndị ya na-ekwetalighị, ndị otu n’ime ha bụ na ha hụrụ anyanwụ n’aka nri ha mgbe ha na-aga Afrịka gburugburu. Ọ ga-esiri nnọọ onye Gris oge ochie ike ikweta nke a. Ọ maara onye ọ bụla biri ndụ ya niile n’ebe ugwu nke akara kere ụwa abụọ ahụ́ ịhụ anyanwụ n’ebe ndịda. N’ihi ya, mgbe ọ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ, anyanwụ na-adị n’aka ekpe ya. Ma n’obodo Kep ọf Gud Hop, bụ́ nke dị n’ebe ndịda nke akara kere ụwa abụọ, ebe anyanwụ na-anọ n’etiti ehihie bụ n’ebe ugwu, n’aka nri nke onye ọ bụla na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ.
Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme arụrịtaala ụka banyere ihe Hirọdọtọs kọrọ. O nwere ike isiri ọtụtụ ndị ike ikwere na ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ejirila ụgbọ mmiri gbaa Afrịka gburugburu n’oge dị anya gara aga. Ma, ndị ọkà mmụta kweere na Fero Niko nyere iwu ka e mee njem dị otú ahụ nakwa na e nwere ike ime njem dị otú ahụ n’ihi nkà na amamihe e nwere n’oge ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Layọnel Kasịn kwuru, sị: “Ha ga-ejili nnọọ ụgbọ mmiri mee ụdị njem ahụ. O nweghị otú ndị Finishia na-akwọ ụgbọ mmiri na-agaghị eji melie njem ahụ n’oge ahụ Hirọdọtọs kwuru na ha mere ya nakwa n’otú o kwuru ha si mee ya.” Anyị ejighị n’aka ma ihe niile Hirọdọtọs kọrọ hà mere eme. Ka o sina dị, o mere ka anyị hụpere oké mbọ ndị mmadụ gbara n’oge gboo ahụ iji ụgbọ mmiri gaa ebe ndị ha na-agatụbeghị.
Pitias Akwọrọ Ụgbọ Mmiri Gaa n’Ebe Ugwu
Ọ bụghị naanị ndị Finishia bụ ndị oge gboo biri n’ógbè Mediterenian ji ụgbọ mmiri gaa n’ebe ọdịda anyanwụ iji ruo n’Oké Osimiri Atlantik. Otu n’ime obodo ndị ọkwọ ụgbọ mmiri Gris wuru gburugburu Mediterenian bụ Masalia, bụ́zi obodo Masel nke dị na Frans. Obodo ahụ bara ọgaranya n’ihi azụmahịa ndị a na-azụ n’oké osimiri nakwa n’elu ala. Ndị ahịa na-esi na Masalia ebuga mmanya, mmanụ na arịa ọla nchara Mediterenian n’ebe ugwu, sikwa n’ebe ugwu zụrụ ihe ndị e ji arụpụta ígwè na ihe ndị
e ji arụpụta ihe ndị dị ka ọla ntị. O doro anya na ndị Masalia nwere mmasị ịmata ebe e si enweta ngwá ahịa ndị ahụ. N’ihi ya, n’ihe dị ka afọ 320 T.O.A., Pitias bụ́ onye Masalia kwọọrọ ụgbọ mmiri gaa n’obodo ndị ahụ dị anya dị n’ebe ugwu.Mgbe Pitias lọtara, o dere akụkọ njem ya n’akwụkwọ ọ kpọrọ On the Ocean. Ọ bụ ezie na nke ahụ o ji aka ya dee n’asụsụ Grik adịkwaghị ugbu a, ọ dịkarịa ala ndị edemede oge ochie iri na asatọ kwuru ihe o dere. Ihe ndị a ha si n’akwụkwọ Pitias weta gosiri na Pitias ji nlezianya kọọ banyere osimiri, ebili mmiri, ọdịdị ala, na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ebe ndị ọ gara. O jikwa osisi e ji eme sọfịa tụọ ebe onyinyo anyanwụ ruru n’etiti ehihie n’otu ụbọchị, sikwa n’ihe ọ tụtara mara ebe ọ garuru n’ebe ugwu.
Ihe ndị masịrị Pitias bụ ihe metụtara nkà mmụta sayensị. Ma, ihe ndị metụtara nkà mmụta sayensị enweghị ike ịbụ isi ihe mere o ji mee njem ahụ. Kama nke ahụ, ndị ọkà mmụta ekwuola na ọ bụ ndị ahịa Masalia gwara ya ka o mee njem ahụ ma kwụọ ụgwọ ihe ndị o mefuru, bụ́ ndị dunyere ya ka ọ gaa chọta ụzọ ụgbọ mmiri ga-esi na-aga n’ụsọ oké osimiri ebe ndị ahụ ha maara e nwere ike inweta ọla ndị e ji eme ihe ndị dị ka ihe ntị na gbamgbam. Oleezi ebe Pitias gara?
Ọ Gara Britani, Briten, na Ebe Ndị Ọzọ
O yiri ka Pitias ò ji ụgbọ mmiri gaa Aịberia gburugburu ma gaa n’ụsọ oké osimiri Gọl ruo Britani, bụ́ ebe ọ pụtara n’ụgbọ. Otú anyị si mara nke a bụ na otu n’ime ihe ndị ọ tụtara banyere ebe anyanwụ nọ, bụ́ nke ọ ga-abụ na ọ nọ n’elu ala tụọ, bụ ihe a tụtara n’otu obodo dị n’ebe ugwu Britani. *
Ndị bi na Britani bụ aka ochie n’ịrụ ụgbọ mmiri na n’ịkwọ ụgbọ mmiri, ha na ndị Briten zụkọkwara ahịa. E nwejuru nnọọ ihe e ji emepụta gbamgbam, bụ́ ihe dị mkpa a na-enweta n’ọla nchara, na Kọnwọl nke dị n’ebe ngwụcha ngwụcha ndịda ebe ọdịda anyanwụ Briten, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka Pitias gawaziri. Akụkọ ya kwuru otú Briten dị na otú ọ hà, bụ́ nke na-egosi na ọ ga-abụrịrị na o ji ụgbọ mmiri gaa agwaetiti ahụ gburugburu.
Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye maara kpọmkwem ụzọ Pitias si gaa, o nwere ike ịbụ na o si n’agbata Briten na Ayaland gafee, kwụsị na Aịl ọf Man, bụ́ ebe dabara n’ihe nke abụọ ọ tụtara banyere ebe anyanwụ nọ. O nwere ike ịbụ na Luis, dị na Aụta Hebrediz, nke dị ná ngwụcha ngwụcha ebe ọdịda anyanwụ Skọtland ka ọ nọ tụọ ihe nke atọ ọ tụrụ. Ọ dị ka ò si ebe ahụ gawa ebe ugwu ruo Ọkni Aịlands, nke dị n’ebe ugwu Skọtland dị n’ala akọrọ, n’ihi na ihe o dere bụ́ nke Plini nke
Okenye kọrọ banyere ya, gosiri na e nwere iri agwaetiti anọ n’ebe ahụ.Pitias dere na ọ bụrụ na mmadụ esi ebe ahụ jiri ụgbọ mmiri gbaa abalị isii n’ebe ugwu Briten, ọ ga-ahụ obodo a na-akpọ Tuli. Ndị dị iche iche dere akwụkwọ n’oge ochie kwuru na Pitias kpọrọ Tuli obodo anyanwụ na-acha n’etiti abalị. O dere na ọ bụrụ na e si ebe ahụ gbaa otu ụbọchị ọzọ, a ga-erute n’ebe oké osimiri “na-akpụkọ akpụkọ.” Ma, a ka na-arụ ụka banyere kpọmkwem ebe obodo Tuli ahụ Pitias kọrọ akụkọ ya dị—ụfọdụ na-asị na ọ dị na Fero Aịlands, ndị ọzọ asị na ọ dị na Nọọwee, ndị ọzọ asịkwa na ọ dị n’Aịsland. N’agbanyeghị ebe Tuli dị, ndị edemede oge ochie kweere na ọ bụ “ebe kacha anya n’ebe ndị a kpọrọ aha dị n’ebe ugwu.”
O yiri ka Pitias ò sikwa otu ụzọ ahụ o si gaa laghachi Briten, si otú ahụ gbachazie agwaetiti ahụ gburugburu. Ma, anyị amaghị ma ọ̀ gakwuru ebe ndị ọzọ n’ụsọ oké osimiri ebe ugwu Yurop tupu laghachiwe Mediterenian. Ma ọ̀ gara ma ọ bụ na ọ gaghị, Plini nke Okenye weere ihe Pitias kwuru banyere ebe ndị a na-emepụta ihe e ji eme ihe ndị dị ka ọla ntị dị ka ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi. N’oge ochie, ebe e si enweta ihe a dị oké ọnụ ahịa bụ Jọtland, bụ́ nke dị na Denmak ugbu a, dịrịkwa n’ebe ndịda ụsọ Oké Osimiri Bọltik. N’ezie, o nwere ike ịbụ na Pitias matara banyere ebe ndị ahụ mgbe ọ na-aga na nke ọ bụla n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Briten, ọ dịghịkwa ebe anyị maara o kwuru na ya gara ebe ndị ahụ n’onwe ya.
Onye ọzọ a maara mere njem na Mediterenian nke dere na ya gara Briten bụ Juliọs Siza, bụ́ onye ji ụgbọ mmiri rute n’agwaetiti a n’afọ 55 T.O.A. Ka ọ na-erule afọ 6 O.A., ndị Rom ndị ọzọ rudịrị n’ebe ugwu Jọtland.
Ịgakwu Ebe Ndị Ọzọ
Njem ndị Finishia na ndị Gris ji ụgbọ mmiri mee mere ka a matakwuo, ọ bụghị naanị obodo ndị dị n’Oké Osimiri Mediterenian na Oké Osimiri Atlantik, kamakwa, obodo ndị dị n’ebe ndịda ndịda Afrịka, ọbụna ruo n’obodo ndị dị n’Oké Osimiri Aktik nke dị nnọọ n’ebe ugwu. Ihe ndị e ji kpọrọ ihe n’ụwa n’oge ahụ bụ ime nchọpụta, ịzụ ahịa, ịga ebe ndị ọhụrụ, ịga ebe ndị dị ezigbo anya, nakwa inwetakwu amamihe bụ́ nke gbasara ebe niile n’ihi ihe ndị a.
Ọ ghaghị ịbụ na ihe ndekọ ndị fọrọnụ e dere banyere nchọpụta ndị e mere n’oge ochie kọrọ naanị banyere njem ụgbọ mmiri ole na ole ndị obi kara mechara n’oge ochie. Ndị ọkwọ ụgbọ mmiri oge ochie ole mere njem lọta n’edeghị ihe ọ bụla banyere ebe ndị ha gara? Olekwa si n’obodo ha gaa ebe ndị dị anya n’alọtaghị? Ọ dịghị onye matarala azịza ajụjụ ndị a. Ma, anyị nwere ike ịmata ihe ụfọdụ banyere otú Iso Ụzọ Kraịst si gbasaa n’oge ochie.—Gụọ igbe dị n’elu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A na-echekarị na ebe a bụ ógbè dị n’ebe ndịda Spen nke ndị Gris na Rom na-ede akwụkwọ kpọrọ Tatisọs.
^ par. 4 Iji matakwuo banyere njem ụgbọ mmiri ndị e mere gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ebe Ndị Kraịst Oge Gboo Kwusaruru Ozi Ọma n’Eshia?” nke dị n’Ụlọ Nche, January 1, 2009.
^ par. 16 N’oge anyị a, otú e si ede ihe ahụ ọ tụrụ bụ 48° 42’ N.
[Foto dị na peeji nke 29]
Otú E Si ‘Kwusaa Ozi Ọma n’Etiti Ihe Niile E Kere Eke’
N’ihe dị ka afọ 60-61 O.A., Pọl onyeozi dere na ‘e kwusaala ozi ọma n’etiti ihe niile e kere eke.’ (Ndị Kọlọsi 1:23) Ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na Ndị Kraịst ekwusaala ozi ọma mgbe ahụ n’India, Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Afrịka, Spen, Gọl, Briten, ógbè Bọltik, nakwa na Tuli ahụ Pitias dere maka ya? O yighị ka ọ̀ bụ ihe o bu n’obi, ma anyị ejighị nke ahụ n’aka.
Ma, o doro nnọọ anya na ozi ọma ahụ eruola ebe dị anya n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst na Pentikọst 33 O.A., ji okpukpe ọhụrụ ha gaa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ n’ebe ndị dị anya ka Patia, Ilam, Midia, Mesopotemia, Arebia, Eshia Maịnọ, nakwa akụkụ Libia dị nso na Saịrini, na Rom—bụ́ ụwa nke ndị na-agụ akwụkwọ ozi Pọl maara.—Ọrụ 2:5-11.
[Ihe Osise/Map dị na peeji nke 26, 27]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Hirọdọtọs kwuru na mgbe ndị ọkwọ ụgbọ mmiri kwọ ụgbọ mmiri na-agba Afrịka gburugburu, ha hụrụ anyanwụ n’aka nri ha
[Map]
AFRỊKA
OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN
OKÉ OSIMIRI INDIA
OKÉ OSIMIRI ATLANTIK
[Foto/Map dị na peeji nke 28, 29]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Njem dị anya onye Gris na-akwọ ụgbọ mmiri bụ́ Pitias mere
[Map]
AYALAND
AỊSLAND
NỌỌWEE
Oké Osimiri Ebe Ugwu
BRITEN
BRITANI
ALA BANYERE NA MMIRI BỤ́ AỊBERIA
ỤSỌ OKÉ OSIMIRI EBE UGWU AFRỊKA
OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN
Masel