Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

E wezụga ihe ndị e kwuru na Baịbụl, olee ihe akaebe na-egosi na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa n’ezie?

Ọtụtụ ndị edemede dịrị ndụ afọ ole na ole Jizọs nwụchara kpọrọ ya aha. Otu n’ime ha bụ Kọniliọs Tasitọs, bụ́ onye dere akụkọ obodo Rom n’oge ndị eze ukwu na-achị ya. Mgbe Tasitọs na-akọ banyere ọkụ gbara Rom n’afọ 64 O.A. (Oge Anyị), o kwuru na a nụrụ kepu kepu na ọ bụ Eze Ukwu Niro sunyere ya. Tasitọs kwuru na Niro nwara ibo ya otu ìgwè ndị ọha na eze kpọrọ Ndị Kraịst. Tasitọs dere, sị: “Onye ọchịchị bụ́ Pọntiọs Paịlet gburu Kristọs, bụ́ onye e si n’aha ya nweta aha ha, n’oge ọchịchị Taịbiriọs.”—Annals, nke 15, 44.

Fleviọs Josifọs, onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, kpọkwara Jizọs aha. Mgbe Josifọs na-akọ banyere ihe ndị mere n’agbata oge Festọs, bụ́ onye Rom bụ́ gọvanọ Judia nwụrụ n’ihe dị ka afọ 62 O.A., na mgbe onye nọchiri ya, bụ́ Albinọs, rutere, o kwuru na Nnukwu Onye Nchụàjà Ananọs (Anas) “kpọkọrọ ndị ọkàikpe Sanhedrin ma kpọpụta onye a kpọrọ Jems, bụ́ nwanne Jizọs onye bụ́ Kraịst, na ụfọdụ ndị ọzọ, n’ihu ha.”—Jewish Antiquities, 20, 200 (9, 1).

Olee ihe mere e ji kpọọ Jizọs aha bụ́ Kraịst?

Oziọma ndị dị na Baịbụl kọrọ na mgbe mmụọ ozi bụ́ Gebriel bịakwutere Meri iji gwa ya na ọ ga-atụrụ ime, ọ gwara ya na ọ ga-agụ nwa ya nwoke Jizọs. (Luk 1:31) Jizọs bụ aha ọtụtụ ndị Juu na-aza n’oge Baịbụl. Josifọs, onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, dere banyere mmadụ iri na abụọ zara aha ahụ, ma e wezụga ndị a kpọrọ aha n’Akwụkwọ Nsọ zara ya. A kpọrọ nwa Meri “onye Nazaret,” bụ́ nke mere ka a mara na ọ bụ Jizọs nke si Nazaret. (Mak 10:47) A makwaara ya dị ka “Kraịst,” ma ọ bụ Jizọs Kraịst. (Matiu 16:16) Olee ihe aha a pụtara?

Okwu a sụgharịrị “Kraịst” si n’okwu Grik bụ́ Khri·stosʹ, nke ya na okwu Hibru bụ́ Ma·shiʹach (Mesaya) pụtara otu ihe. Okwu abụọ ahụ pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” E nwere ndị ọzọ a kpọrọ aha a tupu Jizọs abịa n’ụwa. Dị ka ihe atụ, e kwuru na Mozis, Erọn, na Eze Devid bụcha ndị e tere mmanụ, nke pụtara na Chineke họpụtara ha ma nye ha ọrụ na ikike. (Levitikọs 4:3; 8:12; 2 Samuel 22:51; Ndị Hibru 11:24-26) Jizọs, bụ́ Mesaya e buru n’amụma, bụ onye nnọchiteanya kachanụ Jehova nwere. Ka a sịkwa ihe mere e ji kpọọ Jizọs “Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:16; Daniel 9:25.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ebe e sere Fleviọs Josifọs