Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu

Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu

PITA emekataghị chefuo otú obi si jọọ ya njọ mgbe ahụ anya ha abụọ kụkọtara. Mgbe ahụ Jizọs lere ya anya, ihu Jizọs ò gosiri na ọ na-ewere ya iwe ma ọ bụ na ihe ya adịkwaghị ya mma? Anyị amaghị azịza ya; naanị ihe akụkọ ahụ e si n’ike mmụọ nsọ dee kwuru bụ na ‘Onyenwe anyị tụgharịrị legide Pita anya.’ (Luk 22:61) Ma, naanị anya ahụ o lere Pita mere ka Pita ghọta otú ihe o mere jọruru ná njọ. Ọ ghọtara na ya emeela nnọọ ihe ahụ Jizọs gwara ya na ọ ga-eme, bụ́kwanụ ihe Pita siri ọnwụ na ya emekataghị mee—ọ gọnahụla Nna ya Ukwu ọ hụrụ n’anya. Obi jọrọ nnọọ Pita njọ n’ụbọchị ahụ, ikekwe, ọ bụ ụbọchị obi kacha jọọ ya njọ ná ndụ.

Ma, olileanya ka dị. Ebe ọ bụ na Pita nwere okwukwe dị ukwuu, ọ ka nwere ohere imezi ihe o mejọrọ na ịmụta otu n’ime ihe ndị kacha mkpa Jizọs kụziri. Ihe ahụ metụtara mgbaghara. Ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ịmụtakwa ihe ahụ, n’ihi ya, ka anyị hụ ihe mere Pita n’oge a tara akpụ ná ndụ ya.

Onye Ka Nwere Ọtụtụ Ihe Ọ Ga-amụta

N’ihe dị ka ọnwa isii tupu mgbe ahụ, n’obodo Pita bụ́ Kapaniọm, Pita bịakwutere Jizọs ma jụọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?” O nwere ike ịbụ na Pita chere na ya dị obiọma. A sị ka e kwuwe, ndị ndú okpukpe oge ahụ na-akụzi na ihe iwu ji mmadụ ịgbaghara ibe ya bụ naanị ugboro atọ! Jizọs zara, sị: “Ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.”—Matiu 18:21, 22.

Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ ka Pita gụkọwa ihe ọjọọ mmadụ mere ya? Mba; kama nke ahụ, mgbe ahụ ọ sịrị na asaa ahụ Pita kwuru kwesịrị ịbụ iri asaa na asaa, ihe ọ na-ekwu bụ na o nweghị ugboro ole ọ ga-abụ mmadụ mehie anyị anyị agakwaghị agbaghara ya. Jizọs gosiri na ihe megharịrị Pita anya bụ obi ịkpọ nkụ na mmụọ enweghị mgbaghara juru ebe niile n’oge ahụ bụ́ mgbe ndị mmadụ na-agụkọkarị ugboro ole ha gbaghaara mmadụ. Ma, Chineke chọrọ ka anyị na-agbaghara ndị mmadụ n’agụkọghị ugboro ole ha mehiere anyị.

Pita arụghị Jizọs ụka. Ma, ihe ahụ Jizọs kụziri ò ruru ya n’obi? Mgbe ụfọdụ, anyị na-akacha amụta banyere mgbaghara mgbe anyị ghọtara otú o si dị anyị oké mkpa ka a gbaghara anyịnwa. Ya mere, ka anyị gaghachi n’ihe ndị mere tupu Jizọs anwụọ. N’awa ndị ahụ ihe tara akpụ, Pita mere ọtụtụ ihe mere ka ọ dị ya mkpa ka Nna ya Ukwu gbaghara ya.

Onye Nwere Ọtụtụ Ihe A Ka Ga-agbaghara Ya

Ọ bụ abalị dị oké mkpa, bụ́ nke ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Jizọs ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-akụziri ndịozi ya, dị ka ihe atụ, ịkụziri ha banyere ịdị umeala n’obi. Jizọs setịpụụrụ ha ihe nlereanya site n’ịsa ụkwụ ha, nke bụ́ ọrụ a na-ekenyekarị ndị odibo kacha ala. Pita bu ụzọ gosi na ya echeghị na Jizọs kwesịrị ịsa ya ụkwụ. O kwuziri na ọ gaghị asa ya ụkwụ. Mechazie sị na Jizọs ga-asa ya ma ụkwụ ma aka ma isi! Jizọs ewereghị ya iwe, kama o ji nwayọọ kọwaara ha ihe ihe ọ na-eme pụtara na mkpa ọ dị.—Jọn 13:1-17.

Ma, obere oge nke ahụ gachara, ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ise okwu banyere onye kacha ukwuu n’etiti ha. O doro anya na Pita so kpaa àgwà mpako iberiibe ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs ji obiọma gbazie ha ma jaadị ha mma maka ebe ha mere nke ọma, nke bụ́ ịnọgidesi ike na-eso Nna ha Ukwu. Ma, o buru amụma na ha niile ga-ahapụ ya. Pita gwara Jizọs na ya ga-esogide ya ọbụna ruo ọnwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs buru amụma na tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, Pita ga-agọnahụ Nna ya Ukwu ugboro atọ n’abalị ahụ. Ọ bụghị naanị na Pita gbaghara ihe Jizọs kwuru, kamakwa ọ nyara isi na ya ga-ekwesị ntụkwasị obi karịa ndịozi ndị ọzọ niile!—Matiu 26:31-35; Mak 14:27-31; Luk 22:24-28.

Ike Pita ọ̀ gwụwala Jizọs? Mbanụ, n’oge a niile ihe tara akpụ, Jizọs nọgidere na-achọ ebe ndịozi ya na-ezughị okè na-emezi emezi. Jizọs maara na Pita ga-agọnahụ ya, n’agbanyeghị nke ahụ, o kwuru, sị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32) Jizọs si otú ahụ gosi na obi siri ya ike na Pita ga-emezi ihe o mejọrọ ma maliteghachi ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Nke ahụ gosiri nnọọ na Jizọs nwere obiọma ma na-agbaghara mmehie!

Mgbe e mechara, n’ogige Getsemeni, ọ dị mkpa ka a gbazie Pita ihe karịrị otu ugboro. Jizọs gwara ya na Jems na Jọn ka ha na-eche nche, ka Ya gaa kpee ekpere. Jizọs nọ n’oké mwute ma chọọ enyemaka, ma ụra buuru Pita na ndị nke ọzọ ugboro ugboro. Jizọs kwuru okwu a na-egosi na o nwere ọmịiko ma na-agbaghara mmehie: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Mak 14:32-38.

N’oge na-adịghị anya, otu ìgwè mmadụ ji ọkụ, mma agha, na okpiri bịa. Ugbu a bụ oge e kwesịrị iji nlezianya na akọ mee ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita mere ihe n’echeghị echiche, fee mma agha ya n’isi Malkọs, bụ́ ohu nnukwu onye nchụàjà, ma bepụ ya otu ntị. Jizọs ji nwayọọ gbazie Pita, gwọọ nwoke ahụ, ma kọwaa otu ụkpụrụ ga-eduzi ndị na-eso ụzọ ya ruo taa, ya bụ, na ha agaghị abụ ndị na-eme ihe ike. (Matiu 26:47-55; Luk 22:47-51; Jọn 18:10, 11) Pita emeela ọtụtụ ihe chọrọ ka Nna ya Ukwu gbaghara ya. Ihe ndị Pita mere na-echetara anyị na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ò nwere onye n’ime anyị mgbaghara Chineke na-adịghị mkpa kwa ụbọchị? Ma, a ka nwere ihe ndị chere Pita ihu n’abalị ahụ. Nke ka njọ ka ga-eme.

Mmehie Kacha Njọ Pita Mere

Jizọs gwara ìgwè mmadụ ahụ na ọ bụrụ yanwa ka ha na-achọ, ka ha hapụ ndịozi ya ka ha laa. Pita nọ na-ele ìgwè mmadụ ahụ naanị n’anya ka ha na-eke Jizọs agbụ. Pita gbaziri ọsọ, dị ka ndịozi ibe ya gbara.

Pita na Jọn gbatụrụ kwụsị, ikekwe, n’akụkụ ụlọ Anas, onye bụ́bu nnukwu onye nchụàjà, bụ́ ebe mbụ a kpọgara Jizọs ka a gbaa ya ajụjụ. Mgbe e si ebe ahụ kpọrọ Jizọs pụọ, Pita na Jọn nọ na-eso ha n’azụ “n’ebe dịtụ anya.” (Matiu 26:58; Jọn 18:12, 13) Pita abụghị onye ụjọ. O doro anya na ọ bụ obi ike o nwere mere o ji soro ha n’azụ. Ìgwè mmadụ ahụ ji ngwá ọgụ, Pita emerụọdịkwala otu n’ime ha ahụ́. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita egosighị ụdị ịhụnanya na-adịgide adịgide o kwuru na ya nwere, ya bụ, ịdị njikere ịnwụ n’akụkụ Nna ya Ukwu, ma ọ dị mkpa.—Mak 14:31.

Dị ka Pita mere, ọtụtụ ndị taa na-achọ iso Kraịst n’azụ “n’ebe dịtụ anya”—otú ọ na-enweghị onye ga-ahụ ha. Ma, dị ka Pita n’onwe ya mechara dee, naanị otú anyị ga-esi soro Kraịst nke ọma bụ isochi ya anya otú anyị nwere ike, na-eṅomi ihe nlereanya ya n’ihe niile, n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta.—1 Pita 2:21.

Pita mechara jiri nwayọọ nwayọọ rute n’ọnụ ụzọ ámá nke otu n’ime ụlọ ndị kacha buo ibu ma maa mma na Jeruselem. Ọ bụ ụlọ Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà bara ọgaranya a na-akwanyere ùgwù. A na-ewu ụlọ ndị dị otú ahụ ka ha gbaa ime èzí gburugburu, e nweekwa ọnụ ụzọ ámá n’ihu ha. Pita ruru n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, ma e kweghị ya banye. Jọn, bụ́ onye banyerela abanye, bịara gwa onye nche ọnụ ụzọ ámá ahụ ka ọ kpọbata Pita. Ọ ga-abụ na Pita esochighị Jọn anya; ọ gbalịkwanụghị ịbanye n’ime ụlọ ahụ ka ọ nọrọ n’akụkụ Nna ya Ukwu. Ọ nọ n’ime èzí, bụ́ ebe ndị ohu na ndị na-eje ozi nọ gburugburu otu ọkụ na-enwu nke ọma na-anya ọkụ n’abalị ahụ oyi na-atụ, na-ele ka ndị na-agbagide Jizọs akaebe ụgha na-abanye n’ime ụlọ ebe a nọ na-ekpe ya ikpe ma na-apụta.—Mak 14:54-57; Jọn 18:15, 16, 18.

N’ìhè ọkụ ahụ, nwa agbọghọ ahụ kpọbatara Pita n’ọnụ ụzọ ámá hụrụ ya nke ọma. Ọ maara ya. O ji iwe gwa ya, sị: “Gị onwe gị na Jizọs onye Galili na-anọ!” Pita atụghị anya ihe ahụ o kwuru, ya agọọ na ya amaghị Jizọs—ma ọ bụ na ya aghọtadịghị ihe nwa agbọghọ ahụ na-ekwu. Ọ gara guzoro n’ebe dị nso n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, na-agbalị ka a ghara ịmata ya, ma nwa agbọghọ ọzọ hụrụ ya ma kwuo otu ihe ahụ, sị: “Nwoke a na Jizọs onye Nazaret nọrọ.” Pita ṅụrụ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ!” (Matiu 26:69-72) Ikekwe, ọ bụ mgbe Pita gọnahụchara Jizọs nke ugboro abụọ a ka ọ nụrụ ka oké ọkpa na-akwa, ma ihe ndị na-emenụ megharịrị ya anya nke na o chetaghị amụma Jizọs buru naanị awa ole na ole tupu mgbe ahụ.

Mgbe obere oge gachara, Pita ka na-agbalị ka ndị mmadụ ghara ịmata ya. Ma, ìgwè mmadụ guzo n’ime èzí ahụ bịakwutere ya. Otu n’ime ha bụ onye ikwu Malkọs, bụ́ ohu ahụ Pita merụrụ ahụ́. Ọ gwara Pita, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?” Pita gbasiri mbọ ike ime ka ha kweta na ihe ha kwuru abụghị eziokwu. N’ihi ya, ọ ṅụụrụ ha iyi, ikekwe, na-ekwu ka ihe ọjọọ mee ya ma ọ bụrụ na ya na-agha ụgha. Ozugbo o kwuchara ya, oké ọkpa kwara—bụ́ nke abụọ Pita nụrụ n’abalị ahụ.—Jọn 18:26, 27; Mak 14:71, 72.

Jizọs ka si nnọọ n’ime ụlọ pụta na veranda, bụ́ nke chere ihu n’ime èzí. Ọ bụ n’oge ahụ ka anya ya na Pita kụkọtara, dị ka a kọrọ ná mmalite isiokwu a. Anya meghere Pita, ya aghọta otú o mejọruru Nna ya Ukwu. Pita hapụrụ ime èzí ahụ, nwee oké mwute n’ihi mmehie ya. Ọ banyere n’okporo ámá ndị dị n’obodo ahụ ka ọnwa gbazuru agbazu ji nwayọọ nwayọọ na-abanyeghachi n’urukpuru. Uche ya adịghị n’ebe ọ na-aga. Anya mmiri agbajuo ya anya. O jitelighị onwe ya, ya akwaa ákwá nke ukwuu.—Mak 14:72; Luk 22:61, 62.

Mgbe mmadụ mechara ụdị mmehie a, ọ dị nnọọ mfe onye ahụ iche na mmehie ya dị oké njọ nke na Chineke agakwaghị agbaghara ya. Ọ ga-abụ na Pita chere otú ahụ banyere onwe ya. Ma, ọ̀ bụnụ eziokwu?

Mmehie Pita Ò Ruola Otú A Na-agakwaghị Agbaghara Ya?

O siri ike ịghọta otú Pita nweruru mwute mgbe chi bọrọ, ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ amalite ime. Ọ ga-abụrịrị na ọ tara onwe ya ụta mgbe a tachara Jizọs ahụhụ ọtụtụ awa, ya anwụọ n’ehihie ya! Ọ ga-abụrịrị na ọ na-ewute Pita mgbe ọ bụla o chetara na ya so mee ihe wutere Nna ya Ukwu n’ụbọchị mechara bụrụ ụbọchị ikpeazụ ná ndụ Ya dị ka mmadụ. Ọ bụ ezie na ihe ahụ merenụ wutere nnọọ Pita, o kweghị ka obi koropụ ya. Otú anyị si mara nke a bụ na n’oge na-adịghị anya, ọ gakwughachiri ụmụnna ya. (Luk 24:33) O doro anya na ndịozi niile ahụ kwara ụta maka àgwà ha kpara n’abalị ahụ ebelebe ahụ gburu, ma, ha kasirịtara ibe ha obi.

E nwere ike ikwu na ihe a Pita mere bụ otu n’ime ihe ndị kacha mma o mere ná ndụ ya. Ọ bụrụ na ohu Chineke emehie, ọ bụghị mmehie ahụ o mere bụ ihe kacha mkpa, ihe kacha mkpa bụ ya ikpebisi ike isi ná mmehie ya bilie, ya bụ, imezi ihe o mebiri. (Ilu 24:16) Pita gosiri na ya nwere ezi okwukwe site n’ịgakwuru ụmụnna ya n’agbanyeghị na obi jọrọ ya njọ. Mgbe mmadụ nọ ná mwute, ihe na-amasịkarị ya ime bụ ịkpa iche, ma nke ahụ jọgburu onwe ya. (Ilu 18:1) Ihe ziri ezi ime bụ ịnọ ndị kwere ekwe ibe ya nso ma nwetaghachi ume ịnọgide na-efe Chineke.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ebe Pita na ụmụnna ime mmụọ ya nọ, ọ nụrụ ozi na-awụ akpata oyi bụ́ na ozu Jizọs adịkwaghị n’ili. Pita na Jọn gbagara n’ebe ahụ e liri Jizọs, bụ́ nke e mechiri ọnụ ụzọ ya emechi. O nwere ike ịbụ na Pita tọrọ Jọn, ebe ọ bụ na Jọn bu ya ụzọ ruo. Mgbe Jọn hụrụ na ọnụ ụzọ ili ahụ ghe oghe, ọ kwụsịtụrụ. Ma, Pita emeghị otú ahụ. N’agbanyeghị na ọ ka na-eku ume ọkụ ọkụ, ọ banyere ozugbo. Ozu Jizọs adịghị na ya!—Jọn 20:3-9.

Pita ò kweere na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ? O kwetaghị ná mmalite, n’agbanyeghị na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi kọrọ na ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ha ma gwa ha na Jizọs ebiliela n’ọnwụ. (Luk 23:55–24:11) Ma, tupu chi ejie n’ụbọchị ahụ, mwute na obi abụọ Pita nwere akwụsịla. Jizọs dị ndụ, ọ bụzi mmụọ dị ike! Ọ pụtara n’ihu ndịozi ya niile. Ma, o nwere ihe ọzọ o bu ụzọ mee, bụ́ nke o meere otu onye. Ndịozi ahụ kwuru n’ụbọchị ahụ, sị: “N’ikwu eziokwu, a kpọlitere Onyenwe anyị, ọ pụtakwara n’ihu Saịmọn!” (Luk 24:34) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi mechara dee banyere ụbọchị ahụ pụrụ iche ma kwuo na Jizọs “pụtakwara n’ihu Sifas, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:5) Sifas na Saịmọn bụ aha ndị ọzọ a na-akpọ Pita. Jizọs pụtara n’ihu ya n’ụbọchị ahụ—o doro anya na ọ bụ mgbe Pita nọ naanị ya.

Baịbụl akọrọghị anyị ihe ndị mere n’oge ahụ pụrụ iche Jizọs na Pita nọrọ. Naanị ihe anyị nwere ike ime bụ iji anya nke uche anyị hụ otú obi si tọọ nnọọ Pita ụtọ ịhụ Onyenwe ya ọ hụrụ n’anya ná ndụ ọzọ na inwe ohere igosi mwute na nchegharị ya. Ihe kacha ya mkpa n’oge ahụ bụ ka a gbaghara ya. O doro anya na Jizọs gbaghaara ya, gbaghakwara ya n’ụba! Ndị Kraịst taa mehierenụ kwesịrị icheta Pita. Anyị ekwesịtụghị iche na mmehie anyị dị oké njọ nke na Chineke agakwaghị agbaghara anyị. Jizọs kpara nnọọ àgwà ka Nna ya, bụ́ onye ‘na-agbaghara mmehie n’ụzọ dị ukwuu.’—Aịzaya 55:7.

Ihe Ọzọ Gosiri na A Gbaghaara Ya

Jizọs gwara ndịozi ya ka ha gaa Galili, bụ́ ebe ya na ha ga-anọkọ ọzọ. Mgbe ha rutere, Pita kpebiri ịga gbuo azụ̀ n’Oké Osimiri Galili. Ụfọdụ n’ime ha sonyeere ya. Pita gaghachiri n’ọdọ mmiri ahụ ọ na-anọkarị n’oge ọ bụ okorobịa. Mkpọtụ ụgbọ na-eme n’elu mmiri, ụda ebili mmiri, na ụgbụ na-adụtụ ogwu Pita ji n’aka, bụ́ ihe ndị maara ya ahụ́, mere ya obi ụtọ. Ò chere echiche n’abalị ahụ banyere ihe o kwesịrị iji ndụ ya eme ugbu a Jizọs jecharala ozi ya n’ụwa? Ọ̀ gụrụ ya agụụ ịlaghachi n’ọrụ ịkụ azụ̀? Ka o sina dị, ha egbuteghị azụ̀ n’abalị ahụ dum.—Matiu 26:32; Jọn 21:1-3.

Ma, mgbe chi bọrọ, otu onye si n’ikpere mmiri ahụ kpọọ ha òkù ma gwa ha ka ha wụnye ụgbụ ha n’akụkụ nke ọzọ nke ụgbọ mmiri ahụ. Ha mere ihe o kwuru ma dọpụta ọtụtụ azụ̀ dị otu narị na iri ise na atọ! Pita matara onye onye ahụ bụ. Ya esi n’ụgbọ ahụ mapụ ma gwuru mmiri ruo n’ikpere mmiri ahụ. N’ikpere mmiri ahụ, Jizọs nyere ha azụ̀ ọ mịrị n’icheku ọkụ. Ya elekwasịzie Pita anya.

Jizọs jụrụ Pita ma ọ̀ hụrụ Onyenwe ya n’anya “karịa ihe ndị a”—ikekwe, na-atụrụ ya aka n’ọtụtụ azụ̀ ahụ ha gbutere. Pita ọ̀ hụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ n’anya n’obi ya otú ọ hụrụ Jizọs n’anya? Dị nnọọ ka Pita gọnahụrụ Onyenwe ya ugboro atọ, Jizọs nyeziri ya ohere ugboro atọ n’ihu ndị ibe ya ka o gosi na ọ hụrụ ya n’anya. Mgbe Pita na-eme nke ahụ, Jizọs gwara ya otú ọ ga-esi gosi ịhụnanya ahụ: site n’ibute ozi dị nsọ ọ na-ejere Chineke ụzọ karịa ihe niile ọzọ, na inye atụrụ Kraịst, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, nri na ilekọta ha.—Jọn 21:4-17.

Jizọs si otú ahụ gosi na Pita ka baara ya na Nna ya uru. Pita ga-arụ ọrụ dị mkpa n’ọgbakọ, bụ́ nke Kraịst na-eduzi. Nke ahụ gosiri nke ọma na Jizọs agbagharala ya kpamkpam! O doro anya na ebere ahụ e meere Pita metụrụ Pita n’ahụ́, ọ naghịkwa echefu ya echefu.

Pita ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ya ọtụtụ afọ. O mere ka ụmụnna ya dị ike, dị ka Jizọs nyere ya iwu n’abalị bọtara ụbọchị ọnwụ Ya. Pita ji obiọma na ndidi lekọta ndị na-eso ụzọ Kraịst ma nye ha nri. Nwoke a a kpọrọ Saịmọn mezuru ihe aha ahụ Jizọs gụrụ ya pụtara, bụ́ Pita, ma ọ bụ Oké Nkume, site n’ịbụ onye kwụsịrị ike na onye na-akwado ihe ziri ezi n’ọgbakọ. Ihe na-egosi nnọọ na nke ahụ bụ eziokwu bụ akwụkwọ ozi abụọ na-agba ume Pita ji aka ya dee nke mechara soro n’akwụkwọ Baịbụl ndị baara anyị uru. Akwụkwọ ozi ndị ahụ gosikwara na Pita echefutụghị ihe ọ mụtara n’aka Jizọs banyere mgbaghara.—1 Pita 3:8, 9; 4:8.

Ka anyị mụtakwa ihe ahụ ọ mụtara. Ànyị na-arịọ Chineke mgbaghara kwa ụbọchị maka ọtụtụ mmehie anyị na-eme? Ànyị na-ekweta na a gbagharala anyị ma kwere na ọ ga-emeli ka anyị dị ọcha? Ànyị na-agbaghakwara ndị mejọrọ anyị? Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na-eṅomi okwukwe Pita, nakwa ebere Nna ya Ukwu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Pita mere ọtụtụ ihe chọrọ ka Nna ya Ukwu gbaghara ya, ma ò nwere onye n’ime anyị mgbaghara na-adịghị mkpa kwa ụbọchị?

[Foto dị na peeji nke 23]

‘Onyenwe anyị tụgharịrị legide Pita anya’

[Foto dị na peeji nke 24]

“Onyenwe anyị . . . pụtakwara n’ihu Saịmọn!”