Ihe Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
Ihe Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
“Ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa . . . ozi ọma alaeze Chineke.”—LUK 8:1.
Ọ NA-AMASỊ anyị ikwu banyere ihe ndị dị anyị mkpa, ihe ndị anyị ji kpọrọ ihe. Dị ka Jizọs n’onwe ya kwuru, “ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Matiu 12:34) Ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ndị Jizọs kwuru mgbe ọ na-eje ozi ya, anyị nwere ike ikwubi na Alaeze Chineke dị ya nnọọ mkpa.
Gịnị bụ Alaeze Chineke? Alaeze bụ ọchịchị nke eze na-achị. N’ihi ya, Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke Chineke hiwere. Jizọs kwuru okwu ọtụtụ ugboro banyere Alaeze Chineke, jiri ya mere isiokwu nke ozi ya. A kpọrọ Alaeze ahụ aha ihe karịrị ugboro otu narị na iri n’Oziọma anọ dị na Baịbụl. Ma, ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka Jizọs ji kụziere ndị mmadụ ihe. Omume ya kụzikwaara ndị mmadụ ọtụtụ ihe banyere Alaeze Chineke na ihe ọ ga-eme.
Ònye bụ Eze ya? E jighị ntụli aka ụmụ mmadụ mere họpụta Eze nke Alaeze Chineke. Kama, ọ bụ Chineke n’onwe ya họpụtara Onye Ọchịchị a. Mgbe Jizọs na-ezi ihe, o gosiri na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ Eze.
Jizọs maara na amụma ndị dị na Baịbụl kwuru na Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ga-achị Alaeze ga-adịru mgbe ebighị ebi. (2 Samuel 7:12-14; Daniel 7:13, 14; Matiu 26:63, 64) Cheta na Jizọs kwuru n’ihu ọha na ya bụ Mesaya ahụ e buru n’amụma. Ihe Jizọs si otú ahụ na-ekwu bụ na ya bụ Eze nke Chineke họpụtara. (Jọn 4:25, 26) Ọ dabara adaba na Jizọs kwuru okwu bụ́ “alaeze m” ọtụtụ ugboro.—Jọn 18:36.
Jizọs kụzikwara na a ga-enwe ndị ya na ha ga-eso chịa n’Alaeze ahụ. (Luk 22:28-30) Ọ kpọrọ ndị ahụ ya na ha ga-eso chịa “ìgwè atụrụ nta,” n’ihi na ha ga-adị ole na ole. O kwuru banyere ha, sị: “Ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” (Luk 12:32) Akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl na-egosi na ndị ahụ ga-eso Kraịst chịa ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.—Mkpughe 5:9, 10; 14:1.
Ebee ka Alaeze ahụ ga-esi chịa? Jizọs gwara onye ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Alaeze Chineke nke Kraịst bụ eze ya agaghị esi n’aka ụmụ mmadụ na-achị. Ọtụtụ ugboro, Jizọs kpọrọ Alaeze Chineke “alaeze eluigwe.” * (Matiu 4:17; 5:3, 10, 19, 20) N’ihi ya, Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe.
Jizọs tụrụ nnọọ anya na ya ga-alaghachi n’eluigwe ma ya nọchaa n’ụwa. O kwuru na ya na-aga ‘ịkwadebe ebe’ n’eluigwe, iji mee ka ndị ya na ha ga-eso chịa nwee ike ịgakwuru ya.—Jọn 14:2, 3.
Olee ihe Alaeze ahụ ga-arụ? Jizọs kụziiri ndị gere ya ntị ka ha na-ekpegara Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) A na-eme uche Chineke n’eluigwe. Alaeze ahụ bụ ihe Chineke ga-eji emezu nzube ya banyere ụwa. Iji mezuo nke ahụ, Alaeze ahụ ga-agbanwe nnọọ ụwa a.
Olee ihe Alaeze ahụ ga-eme n’ụwa? Jizọs kụziri na Alaeze Chineke ga-akwụsị ihe ọjọọ site n’ikpochapụ ndị kpọchiri ntị na-eme ya. (Matiu 25:31-34, 46) Nke ahụ pụtara na nrụrụ aka na ihe ọjọọ niile ga-akwụsị. Jizọs kụziri na ụwa ga-ejupụta n’ụmụ mmadụ “ndị dị nwayọọ n’obi,” ndị ezi omume, ndị na-eme ebere, “ndị dị ọcha n’obi,” na ndị na-eme udo.—Matiu 5:5-9.
Ndị a kwesịrị ntụkwasị obi hà ga-ebi n’ụwa a e metọrọ emetọ? Mbanụ! Jizọs kwere nkwa na a ga-enwe ezigbo mgbanwe n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa. Otu nwoke a chọrọ igbu ya na Jizọs kwuru, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Jizọs gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:42, 43) Alaeze Chineke ga-agbanwe nnọọ ụwa a ka ọ ghọọ paradaịs zuru ụwa ọnụ, nke yiri nke ahụ dịrị n’ogige Iden.
Olee ihe ọzọ Alaeze ahụ ga-emere ụmụ mmadụ? Ihe Jizọs mere abụghị naanị ikwe nkwa ihe Alaeze Chineke ga-eme. Matiu 4:23.
O gosikwara ihe ọ ga-eme. Jizọs ji ọrụ ebube gwọọ ọtụtụ mmadụ ọrịa, si otú ahụ gositụ anyị na ya ga-eme nnọọ ihe ka ukwuu n’ọdịnihu mgbe Alaeze ya ga-achịwa. Oziọma e si n’ike mmụọ nsọ dee kwuru banyere Jizọs, sị: “O wee gazuo Galili dum, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ, na-agwọkwa ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.”—Jizọs gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche. O “meghere anya onye kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya.” (Jọn 9:1-7, 32, 33) Jizọs ji nwayọọ bitụ otu nwoke na-arịa ọrịa ekpenta na-asọ oyi aka ma gwọọ ya. (Mak 1:40-42) Mgbe a kpọtaara Jizọs “otu nwoke ntị chiri nke nwekwara nsogbu ikwu okwu,” Jizọs gosiri na ya nwere ike ime ka “ndị ntị chiri nụ ihe, na-emekwa ka ndị dara ogbi kwuo okwu.”—Mak 7:31-37.
Ọnwụ enwedịghị ike ịnọchiri Eze a Chineke họpụtara ụzọ. Na Baịbụl, e dere ugboro atọ Jizọs mere ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ. Ọ kpọlitere otu mkpụrụ nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ, nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ, na ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs, n’ọnwụ.—Luk 7:11-15; 8:41-55; Jọn 11:38-44.
Jizọs si n’ọnụ Jọn onyeozi buo amụma nke kọwara ọdịnihu magburu onwe ya ndị Alaeze Chineke ga-achị ga-enweta, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” (Mkpughe 1:1; 21:3, 4) Chegodị echiche otú ụwa ga-adị mgbe iru uju, ihe mgbu na ọnwụ na-agakwaghị adị! Mgbe ahụ ka a ga-emezucha ekpere ahụ anyị na-ekpe ka uche Chineke mee n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe.
Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa? Jizọs kụziri na mmalite ọchịchị ya ga-adaba n’oge pụrụ iche nke ọ kpọrọ “ọnụnọ” ya. Jizọs buru amụma kwuru ọtụtụ ihe iji gosi mgbe ọnụnọ ya dị ka eze ga-amalite. Ihe a ga-eji mata oge a bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, ndị gụnyere agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, na ịba ụba nke mmebi iwu. (Matiu 24:3, 7-12; Luk 21:10, 11) Ihe ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ Jizọs buru n’amụma emesiwela ike kemgbe afọ 1914, bụ́ afọ Agha Ụwa Mbụ malitere. Ya mere, Jizọs na-achị ugbu a dị ka Eze. N’oge na-adịghị anya, oge ga-eru mgbe Alaeze ahụ ga-abịa mee ka uche Chineke mee n’ụwa. *
Olee ihe ọbịbịa Alaeze Chineke ga-apụtara gị? Ihe ga-ekpebi ya bụ ma ị̀ họọrọ ịnabata ozi Jizọs ma ọ bụ na ị họrọghị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Okwu bụ́ “alaeze eluigwe” pụtara ihe dị ka ugboro iri atọ n’Oziọma Matiu.
^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara nke ọma otú anyị si mata na Alaeze Chineke dị nso, gụọ isi 9, bụ́ “Ànyị Na-ebi ‘n’Ụbọchị Ikpeazụ’?,” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.