Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Onwe Ya

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Onwe Ya

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Onwe Ya

“Jizọs anọtụghị ná mgbagwoju anya banyere onye ọ bụ, ebe o si bịa, ihe mere o ji bịa n’ụwa, na ihe na-eche ya n’ọdịnihu.”—ONYE EDEMEDE BỤ́ HABAT LỌKYA.

TUPU anyị ekwere ma nwee okwukwe n’ihe ndị Jizọs kụziri, ọ dị anyị mkpa ịma ihe banyere ya. Ònye ka Jizọs bụ n’ezie? Olee ebe o si bịa? Gịnị bụ nzube ya ná ndụ? N’Oziọma ndị dị na Baịbụl—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—anyị ga-anụ azịza ha n’ọnụ Jizọs.

Ọ dịrị ndụ tupu a mụọ ya n’ụwa Ọ dị mgbe Jizọs kwuru, sị: “Tupu a mụọ Ebreham, mụ onwe m adịrịla ndụ.” (Jọn 8:58) Ebreham dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ abụọ tupu a mụọ Jizọs. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs dịdị ndụ tupu a mụọ nna ochie ahụ bụ́ onye ezi omume. Ma, olee ebe Jizọs bibu tupu ya abịa n’ụwa? O kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.”—Jọn 6:38.

Ọkpara Chineke Jehova nwere ọtụtụ ụmụ bụ́ ndị mmụọ ozi. Ma, Jizọs pụrụ iche. Ọ kpọrọ onwe ya “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Jọn 3:18) Okwu ahụ pụtara na Jizọs bụ naanị onye Chineke kere n’onwe ya. Ọ bụ Ọkpara a a mụrụ naanị ya ka Chineke ji kee ihe ndị ọzọ niile.—Ndị Kọlọsi 1:16.

“Nwa nke mmadụ” Jizọs kpọrọ onwe ya aha a karịa aha ọ bụla ọzọ. (Matiu 8:20) O si otú a gosi na ya abụghị mmụọ ozi nwoghara enwogha ma ọ bụ Chineke bịara n’anụ ahụ́. Kama nke ahụ, ọ bụ nnọọ mmadụ. Chineke ji mmụọ nsọ ya si n’eluigwe budata ndụ Ọkpara ya n’ụwa, mee ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri dịrị ime. N’ihi ya, a mụrụ Jizọs dị ka mmadụ zuru okè nke na-enweghị mmehie ọ bụla.—Matiu 1:18; Luk 1:35; Jọn 8:46.

Mesaya e kwere ná nkwa Otu nwaanyị Sameria gwara Jizọs, sị: “Amaara m na Mesaya na-abịa.” Jizọs sịrị ya: “Ọ bụ mụ onwe m nke na-agwa gị okwu bụ ya.” (Jọn 4:25, 26) Okwu ahụ bụ́ “Mesaya” na okwu bụ́ “Kraịst” pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Chineke tere Jizọs mmanụ, ma ọ bụ họpụta ya, ịrụ ọrụ pụrụ iche iji mezuo nkwa Chineke.

Isi ihe mere o ji bịa Ọ dị mgbe Jizọs kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Ọ bụ ezie na o meere ndị nọ ná mkpa ọtụtụ ihe ọma, isi ihe o ji ndụ ya mee bụ ikwusa Alaeze Chineke. Anyị ga-atụle ihe ndị ọ kụziri banyere Alaeze ahụ ma e mechaa.

O doro anya na Jizọs bụ mmadụ pụrụ iche. * Anyị ga-emecha hụ na ndụ o biri n’eluigwe mere ka okwu ndị o kwuru n’ụwa bakwuo uru. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na o kwusara ozi ga-emetụta ndụ ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Jizọs na ọrụ ọ na-arụ n’imezu nzube Chineke, gụọ isi 4 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.