Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Metụtaruru Ndị Mmadụ

Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Metụtaruru Ndị Mmadụ

Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Metụtaruru Ndị Mmadụ

“O doro anya na ihe akaebe kacha adịgide adịgide e nwere banyere onye amamihe ahụ si Kapaniọm bụ na ndị mmadụ ka na-ege ya ntị ma na-erubere ya isi n’ihi otú okwu ya si eru ha n’ahụ́.” *—ONYE EDEMEDE BỤ́ GREG ISTABRUK.

OKWU ọnụ na-akpa ike. Okwu amamihe e chere echiche kwuo nwere ike iru n’obi, mee ka e nwee olileanya ma gbanwee ndụ. Ọ dịtụbeghị onye okwu ọnụ ya kpara ike karịa nke Jizọs Kraịst. Otu onye nke nụrụ mgbe Jizọs ziri Ozizi Elu Ugwu a ma ama ugbu a mechara dee, sị: “Mgbe Jizọs kwusịrị okwu ndị a, otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.”—Matiu 7:28.

Ruo taa, ụmụ mmadụ gburugburu ụwa maara ọtụtụ ihe Jizọs kwuru. Ka anyị tụlee ole na ole n’ime okwu ndị bara uru o kwuru.

“Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—Matiu 6:24.

“Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.

“Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Matiu 22:21.

“A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Ma, ihe Jizọs mere abụghị naanị ikwu okwu ndị a na-anaghị echefu echefu. Ozi o kwusara kpara ike n’ihi na o mere ka ndị mmadụ mara eziokwu banyere Chineke, kụziere ha otú ha ga-esi nwee ezi obi ụtọ ná ndụ, meekwa ka ha mara nnọọ ihe ga-akwụsị ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata, ya bụ, Alaeze Chineke. Ka anyị na-atụle ozi a na peeji ndị na-esonụ, anyị ga-ahụ ihe mere ọtụtụ nde mmadụ ka ji ‘na-ege Jizọs ntị ma na-erubere ya isi n’ihi otú okwu ya si eru ha n’ahụ́.’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 E weere Kapaniọm nke dị n’ógbè Galili ka obodo Jizọs.—Mak 2:1.