Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe A Ga-enwe Ezi Udo na Obi Iru Ala?

Olee Mgbe A Ga-enwe Ezi Udo na Obi Iru Ala?

Okwu Pụrụ Iche A Ga-agwa Ọha na Eze

Olee Mgbe A Ga-enwe Ezi Udo na Obi Iru Ala?

Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ na-achọ udo na obi iru ala. Ma, ha achọtabeghị ya. N’ihi gịnị? Baịbụl kwuru ụzọ ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ mere o ji esiri ụmụ mmadụ ike ịchọta udo. Ọ na-emekwa ka anyị mata ihe a na-eme obi ụtọ: Chineke ekwela nkwa inye ụmụ mmadụ ezigbo udo na obi iru ala na-adịgide adịgide n’ụwa niile.

Olee otú udo na obi iru ala a ga-esi ruo ụmụ mmadụ aka, oleekwa mgbe ọ ga-eru ha aka? Olee ihe i kwesịrị ime iji nweta ngọzi ndị a? A ga-aza ajụjụ ndị a n’okwu a ga-agwa ọha na eze nke isiokwu ya bụ, “Olee Mgbe A Ga-enwe Ezi Udo na Obi Iru Ala?” A ga-ekwu okwu a dabeere na Baịbụl n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. N’ọtụtụ ebe, ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ka a ga-anọ kwuo ya na Sọnde, Eprel 18, 2010. Obi ga-atọ Ndịàmà bi n’ebe unu bi ụtọ ịgwa gị oge ọ ga-abụ na ebe ọ ga-abụ. A na-akpọ gị òkù ka ị bịa.