Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee uru na ọrụ ndị dị n’ịbụ diọkpara?
▪ Kemgbe oge ndị nna nna ochie, ndị ohu Chineke na-enye onye bụ́ diọkpara ihe ndị pụrụ iche. Mgbe nna nwe ụlọ nwụrụ, diọkpara ya na-aghọ onyeisi ezinụlọ. Ọ ga na-elekọta ezinụlọ ahụ ma na-achị onye ọ bụla ka bi na ya. Ọ bụkwa diọkpara na-anọchi anya ezinụlọ ahụ n’ihu Chineke. Ọ bụ ezie na a na-ekenye ụmụ nwoke ndị ọzọ niile ihe, a na-ekenye diọkpara ihe gbara nnọọ ọkpụrụkpụ. E jiri ihe diọkpara na-eketa tụnyere nke ụmụ nwoke ndị nke ọzọ, ọ na-eketa òkè abụọ.
N’oge ndị nna ochie, diọkpara nwere ike ịtụfu ọnọdụ ya dị ka diọkpara. Dị ka ihe atụ, Isọ resịrị nwanne ya nke ọ tọrọ ọnọdụ ya dị ka diọkpara. (Jenesis 25:30-34) Jekọb naara diọkpara ya, bụ́ Ruben, ọnọdụ ya dị ka diọkpara ma nye ya Josef. Ruben tụfuru ọnọdụ ahụ n’ihi omume rụrụ arụ o mere. (1 Ihe E Mere 5:1) Ma, n’Iwu Mozis, nwoke lụrụ ihe karịrị otu nwaanyị enweghị ike ịnapụ ọkpara otu nwunye ya ọnọdụ diọkpara ya ma nye ya ọkpara nke nwunye ya ọzọ naanị n’ihi na ọ hụrụ nwunye ya nke ọzọ ahụ n’anya. Nwoke ahụ ga-enyerịrị diọkpara ya ihe ruuru ya.—Diuterọnọmi 21:15-17.
Olee ihe mere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ji eyi “mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ”?
▪ Jizọs katọrọ ndị okpukpe na-emegide ya, bụ́ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, n’ihi na ha “na-eme ka mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ha na-eyi dị ka ihe nchebe bukwuo ibu.” (Matiu 23:2, 5) Ndị okpukpe ahụ na-eke obere mkpọ̀ nwere akụkụ anọ e ji akpụkpọ anụ mee, nke a na-akpọ filaktrị, n’egedege ihu ha. Ha na-ekekwa ha n’apata aka ha otú ọ ga-adị nso n’obi ha. Ihe na-adị n’ime mkpọ̀ ndị ahụ bụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. Ihe mere ha ji eyi mkpọ̀ ndị ahụ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ na ha ghọtara ntụziaka a Chineke nyere ụmụ Izrel n’ụzọ nkịtị, nke kwuru, sị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị . . . Kee ha dị ka ihe ịrịba ama n’aka gị, ha ga-abụkwa ihe ị na-ekegide n’egedege ihu gị, n’agbata anya gị abụọ.” (Diuterọnọmi 6:6-8) O nweghị onye maara kpọmkwem mgbe a malitere iyi filaktrị, ma ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na ọ malitere na narị afọ nke atọ ma ọ bụ nke abụọ Tupu Oge Anyị.
E nwere ihe abụọ mere Jizọs ji katọọ omume ahụ. Nke mbụ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-eme ka filaktrị ha bukwuo ibu iji gosi ndị ọzọ na ha dị nnọọ nsọ. Nke abụọ, ndị òtù abụọ a lere mkpọ̀ ahụ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ anya dị ka ọtụmọkpọ, ma ọ bụ ọgwụ, nke ga-echebe ha. A sụgharịkwara aha mkpọ̀ a na Grik, bụ́ phylakterion, bụ́ ihe a kpọrọ ya n’akwụkwọ ndị na-abụghị Baịbụl dị ka “ụlọ elu ndị nche,” “ebe e wusiri ike,” ma ọ bụ “ihe nchebe.”