Aha Chineke, Bụ́ Jehova, DỊ n’Ụlọ Arụsị Dị n’Ijipt
Aha Chineke, Bụ́ Jehova, DỊ n’Ụlọ Arụsị Dị n’Ijipt
OLEE mgbe mbụ aha Chineke, bụ́ Jehova, ma ọ bụ Yawe, pụtara n’ebe na-abụghị Baịbụl? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu hoo haa, sị: Ọ pụtalarị na narị afọ nke iri na anọ T.O.A. (Tupu Oge Anyị) Olee ihe mere ha ji ekwu otú ahụ?
N’ihe dị ka afọ 1370 T.O.A., ndị Ijipt emeriela ọtụtụ ala. Onye na-achị Ijipt n’oge ahụ, bụ́ Fero Amenhotep (Amenofis) nke Atọ, wuru otu nnukwu ụlọ arụsị na Soleb, dị na Nubia, bụ́ nke a na-akpọzi Sudan. Mgbe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọtara ụlọ arụsị ahụ, ha hụrụ ihe odide ndị Ijipt dị ka ihe e sere ese nke yiri ka ò nwere mkpụrụ okwu Hibru anọ nọchiri anya aha Chineke—YHWH, ma ọ bụ Jehova. Ihe odide ahụ a kanyere n’ahụ́ ụlọ arụsị ji narị afọ ise tọọ Nkume Moab ahụ a ma ama—nke e cheburu bụ́ ebe kasị ochie aha Chineke pụtara. Olee ihe mere o ji yie ka à kanyere aha Chineke nke Baịbụl n’ụlọ arụsị ndị Ijipt?
“Ala Shasu nke Yahu”
Fero Amenhotep nke Atọ raara ụlọ arụsị ahụ o wuru nye chi a na-akpọ Amun-Ra. E wuru ụlọ arụsị ahụ ka ọ dị otu narị mita na iri abụọ n’ogologo, ọ dịkwa n’ikpere mmiri ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Naịl. N’ala ala ogidi ndị dị n’otu n’ime ụlọ nzukọ ndị dị na ya, e ji ihe odide ndị dị ka ihe e sere ese depụta aha ókèala ndị Amenhotep sịrị na ya meriri. Ihe nọchiri anya ókèala nke ọ bụla bụ onye mkpọrọ e kefere aka azụ, nke jikwa ọta e dere aha ala ya ma ọ bụ ndị ya. Ala nke ọtụtụ ndị a na-akpọ ndị Shasu, ma ọ bụ ndị Shosu, so ná ndị ahụ e ji mkpụrụ akwụkwọ yiri ihe osise dee. Olee ndị bụ́ ndị Shasu?
Shasu bụ aha ndị Ijipt na-akpọ ndị Bedowin, bụ́ agbụrụ dị iche iche a na-eleda anya ha na Ijipt gbara n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ala ndị Shasu ruru n’ebe ndịda Palestaịn, ebe ndịda ala
Jọdan, na Saịnaị. Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha kwuru na ala ndị e kwuru na ha bụ nke ndị Shasu ruru n’ebe ime ime ebe ugwu Lebanọn na Siria. N’ala ndị ahụ e meriri emeri e depụtara na Soleb, e nwere otu a gụrụla dị ka “Yawe nọ n’ala Shosu,” “Ala Shasu nke Yahu,” ma ọ bụ “Ala ndị Shasu-yhw.” Ọkà n’ihe ọmụmụ banyere Ijipt oge ochie, bụ́ Jọn Leklan, kwuru na o yiri ka aha e dere n’ọta ahụ dị na Soleb “na ‘mkpụrụ akwụkwọ anọ nọchiri aha’ chi nke Baịbụl, bụ́ YHWH, hà bụ otu.”Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta kweere na ọ ga-abụrịrị na aha ndị ahụ bụ́ Yahu, Yehu, ma ọ bụ Yawe e dere n’ebe ahụ nakwa n’ebe ndị yiri ya bụ aha obodo ma ọ bụ ógbè. Ọkà mmụta bụ́ Shmul Ahituf kwuru na ihe odide ahụ na-akọwa “ebe agbụrụ ndị na-efe Yāhū, bụ́ Chineke Izrel, na-awagharị.” * Ọ bụrụ na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu, aha obodo ahụ bụ nnọọ otu n’ime ọtụtụ ihe atụ nke okwu Arameik oge ochie a na-akpọ ma obodo ma chi ha na-efe. Ihe atụ ọzọ bụ Asọ, bụ́ nke a na-akpọ ala Asiria nakwa chi ya kachanụ.
Ọkà mmụta Baịbụl bụ́kwa onye na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie, bụ́ Rolan de Vo, kwuru banyere ihe e dere n’ụlọ arụsị dị na Nubia, sị: “N’etiti puku afọ nke abụọ BC, n’obodo ha na ndị nna nna ụmụ Izrel mekọtara nnọọ ihe, e nwere aha obodo ma ọ bụ agbụrụ yiri nnọọ nke Chineke Izrel ma ọ bụrụ na ya na ya abụghị otu.”
Aha A Ka Na-asọpụrụ
Ọ bụghị naanị na Soleb dị na Nubia bụ ebe e dere aha bụ́ Yawe n’ihe odide ndị Ijipt dị ka ihe e sere ese. A hụrụ ihe odide yiri ihe odide ahụ dị na Soleb n’ụlọ arụsị Ramesis nke Abụọ n’Amara nke Ebe Ọdịda Anyanwụ nakwa n’Aksa. N’ihe odide ahụ dị n’Amara, ihe odide “Yawe nọ n’ala Shosu” yitụrụ ndị nke ala ndị Shosu ndị ọzọ, bụ́ ndị e chere bụ́ Sia na Leban. Baịbụl gosiri na ebe ndị ahụ bụ ebe ndịda Palestaịn, Idọm, na Saịnaị. (Jenesis 36:8; Diuterọnọmi 1:1) Ha bụ ebe ndị maara ma na-efe Jehova na-agakarị ma tupu ndị Izrel agaa biri n’Ijipt ma mgbe ha lọtasịrị.—Jenesis 36:17, 18; Ọnụ Ọgụgụ 13:26.
N’adịghị ka aha chi ndị ọzọ dị n’ihe odide oge ochie ahụ, a ka na-akpọ aha Chineke nke Baịbụl, bụ́ Jehova, ma na-asọpụrụ ya n’ebe niile. Dị ka ihe atụ, n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa ji ndụ ha na-enyere ndị ọzọ aka, ọ bụghị naanị ịmata aha ahụ, kamakwa ịbịaru Chineke nke na-aza aha ahụ pụrụ iche, bụ́ Jehova, nso.—Abụ Ọma 83:18; Jems 4:8.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-enwe obi abụọ ma ihe odide a yiri ihe e sere ese ọ̀ na-ekwu na ndị Shasu “bụ ndị na-eso ụzọ chi bụ́ Yawe.” Ha kweere na o nwere ike ịbụ na aha obodo a, nke ọ na-enweghị onye maara ya, yiri nnọọ aha Chineke Izrel, nke ahụ ga-abụkwanụ ihe ijuanya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]
Gịnị mere e ji kanye aha Jehova, bụ́ Chineke nke Baịbụl, n’ụlọ arụsị ndị Ijipt?
[Map dị na peeji 21]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
IJIPT
Ụlọ arụsị ahụ dị na Soleb
SUDAN
Osimiri Naịl
[Map dị na peeji 21]
OGidi yiri nke ahụ dị n’ụlọ arụsị ahụ
[Foto dị na peeji nke 22]
Ebe ụlọ arụsị Amun-Ra dịbu, na Soleb, Sudan
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ed Scott/Pixtal/age fotostock
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 21]
N’azụ azụ: Asian and Middle Eastern Division/The New York Public Library/Astor, Lenox and Tilden Foundations