Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE ihe ndị onye nọbu n’ajọ òtù nke wii wii riri ahụ́ mere iji kwụsị àgwà ọjọọ ya? Olee ihe mere onye nọ n’òtù na-akụ egwú rọk na-ada oké ụda ji kpụọ isi ya ma gbanwee otú o si ele egwú na-amasị ya anya? Gịnị kpaliri nwoke na-achọghị irubere okpukpe na gọọmenti isi ịghọ onye na-ekwusa ozi ọma? Ka anyị tụlee ihe ha kwuru.

“M kwụsịrị ise wii wii.”—PITA KAỤSANGA

ADỊ M AFỌ: 32

ABỤ M ONYE: NAMIBIA

NDỤ M BIRI: ANỌ M N’AJỌ ÒTÙ, ISE WII WIII RIKWARA M AHỤ́

NDỤ M BIRI NA MBỤ: M toro na Kehemu, bụ́ otu n’ime nnukwu ogige anọ dị n’obodo Rundu. Ndị bi n’ebe ahụ na-ere ọka milet, nkụ, na unyi iji kpaa afọ ha.

Mgbe m dị naanị afọ abụọ, nne m nwụrụ, n’ihi ya, ọ bụ nne nne m zụlitere m. Anyị enweghị ego. Abụghị m onye isi ike, ma m banyere ná nsogbu n’ihi nsogbu ndị ọgbọ m na-enye m. N’ụlọ akwụkwọ, m banyere n’ajọ òtù. Nke ahụ mere ka m na-alụ ọgụ n’okporo ámá, na-achọ okwu, na-ezu ohi, na-ebubata dayamọnd nke bụ́ ahịa iwu, ma na-aṅụ oké mmanya na ọgwụ ọjọọ. E jidere m ugboro abụọ ma tụọ m mkpọrọ maka izu ohi na igwu wayo.

M kwụsịrị ịga akwụkwọ mgbe m nọ na klas nke anọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma mechaa hapụ obodo anyị na òtù ọjọọ ahụ. M chọrọ ịgbanwe ndụ m. Ma, ise wii wii ka riri m ahụ́. Mgbe ụfọdụ, m na-eji ụkwụ aga ọtụtụ kilomita naanị iji zụta wii wii.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ná mbido afọ 1999, Ndịàmà Jehova nyere m akwụkwọ mgbe ha na-enye ndị na-agafe n’okporo ámá akwụkwọ. Ha kwanyeere m ezigbo ùgwù, nke ahụ metụkwara m nnọọ n’ahụ́. Ihe e kwuru n’akwụkwọ m natara mere ka obi sie m ike na mụ achọtala ezi okpukpe. M malitere ịmụsi Baịbụl ike ma ghọta n’oge na-adịghị anya na m kwesịrị ịgbanwe ndụ m ma ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe ga-atọ Jehova Chineke ụtọ.

M kpebiri ụbọchị m ga-akwụsị ise wii wii na sịga ma mebisịa ihe ọ bụla m nwere metụtara ha. M gwakwara ndị enyi m ka ha ghara inye m sịga ma rịọ ha ka ha ghara ịṅụ ya n’ebe m nọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe agaghị otú m chere. Agụụ sịga na wii wii mere ka m ṅụọ ha ugboro abụọ. Ma, nke ahụ emeghị ka m daa mbà. M na-echeta mgbe niile ihe a Ilu 24:16 kwuru: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” N’ikpeazụ, m kwụsịrị ise wii wii.

Ka m na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụ ka m na-achọkwu ka ọ ghọọ onye mụ na ya kacha dịrị ná mma. Otu amaokwu Baịbụl ruru m n’obi bụ Abụ Ọma 27:10, nke na-asị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” Ka m nọgidere na-amụsi Baịbụl ike, m chọpụtara na okwu ndị ahụ bụ eziokwu. M hụrụ na Jehova ghọọrọ m ezigbo Nna hụrụ m n’anya.

Mụ na Ndịàmà Jehova kpachiwekwara anya. Achọpụtara m na ha na-emekọrịta nnọọ ihe ka ndị enyi ma hụ ibe ha n’anya. Ahụtụbeghị m ndị na-eme otú ahụ.

URU NDỊ M RITERELA: Site n’enyemaka Jehova na nke Ndịàmà ibe m, ọdịdị m, ejiji m, omume m na okwu ọnụ m akala mma. M cheta otú ndụ m dịbu, echere m na ọ gbanweela otú ahụ egú jọrọ njọ si agbanwe ghọọ ọmarịcha urukurubụba. Mgbanwe a masịrị nnọọ ndị ikwu m, ha atụkwasịkwala m obi ugbu a. Alụọla m nwaanyị ugbu a, m na-agbalịkwa ịhụ nwunye m n’anya na ilekọta ụmụ m.

“Ndụ m enweela isi.”—MAKOS PAULU DI SOZA

ADỊ M AFỌ: 29

ABỤ M ONYE: BRAZIL

NDỤ M BIRI: ANỌ M N’ÒTÙ NA-AKỤ EGWÚ RỌK NA-ADA OKÉ ỤDA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Ezinụlọ anyị biri n’obodo Jaguariuna, dị na Sao Paụlo. Nne m na nna m bụ ezigbo ndị Katọlik. Mgbe m na-eto eto, abụ m nwa okoro na-eje ozi n’ọlta. N’ihi ya, ụmụ klas m n’ụlọ akwụkwọ praịmarị gụrụ m Fada. Ma, mgbe m dị afọ iri na ise, m nụrụ egwú rọk na-ada oké ụda. M malitere iso ndị na-agụ egwú rọk. M hapụrụ ntutu m ka o too. N’afọ 1996, nna m nyeere m aka zụọ ngwá egwú mbụ m.

N’afọ 1998, m banyere n’òtù na-akụ egwú rọk na-ada oké ụda. Egwú anyị na-akụ na-eto Setan, okwu rụrụ arụ na-ejukwa na ya. Ọ na-akwado ime ihe ike. Egwú ahụ metụtara echiche m, àgwà m, na omume m. M bịakwuru na-ele ihe ọ bụla anya ọjọọ ma na-esekarị okwu.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Oge mbụ m hụrụ Ndịàmà Jehova bụ n’afọ 1999. Ha gwara m ka ha mụwara m Baịbụl, mụ ekwere, n’agbanyeghị na enwechaghị m mmasị. Ma, ihe ndị m mụtara na Baịbụl gbanwere otú m si ele ndụ anya.

Ihe e ji mara m bụ “nwoke ntutu ogologo,” “onye egwú rọk,” ma ọ bụ “aka na-eti ịgba.” Ma, m malitere ịghọta na iso ndị òtù m akụ egwú mere ka m na-achọ ọdịmma onwe m naanị ma nwee mmụọ ịsọ mpi, onwe m gbụkwara m. Ọ bịara doo m anya na ndị egwú ahụ m na-akwanyere oké ùgwù enweghị ezi nzube ná ndụ ha. M ji nwayọọ nwayọọ ghọta na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe ga-atọ Jehova Chineke ụtọ, m ga-ahapụ egwú rọk na-ada oké ụda na omume rụrụ arụ na ikpere arụsị ha na ya so.

Egwú ahụ m na-akụ na ogologo ntutu m masịrị m. Ọ na-adị m ka ụwa m ọ̀ ga-agwụ ma m hapụ egwú ma kpụtuo ntutu m. M na-ewekwa iwe ọkụ, m makwaara na m kwesịrị ịmụta ịchịkwa ya. Ma, site n’ọmụmụ Baịbụl m, m malitere ịhụkwu Jehova n’anya. M hụkwuru Chineke n’anya mgbe m mụtara banyere ịhụnanya ya, ndidi, na ebere ya. M kpegaara Jehova ekpere ka o nyere m aka ịgbanwe àgwà m, o nyekwarala m aka. Ahụla m n’onwe m na ihe e kwuru ná Ndị Hibru 4:12 bụ eziokwu. Amaokwu ahụ kwuru, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”

Mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova, m chọpụtara na ha dị iche. Nke ahụ bụ nke mbụ m na-ahụ ebe ndị mmadụ na-egosi ibe ha ezigbo ịhụnanya. Ịhụnanya a kacha pụta ìhè ná mgbakọ ukwu Ndịàmà nwere. Otú ndị mmadụ si wepụta onwe ha rụsie ọrụ ike iji hụ na ahụ́ rukwuru ndị ọzọ bịara mgbakọ ahụ ala masịrị m.

URU NDỊ M RITERELA: Site n’enyemaka Jehova, m na-achịkwali iwe m ugbu a. M chere na anakwaghị m achọ ọdịmma onwe m naanị nakwa na adịghịzi m mpako.

N’ikwu eziokwu, o nwere mgbe ndụ ochie m gụrụ m agụụ—ma, ọ nakwaghị agụ m. Ugbu a ndụ m enweela isi. Obi dị m ụtọ na m na-amụta inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na ịchọ ọdịmma ha.

“Ana m enweta ọṅụ nke iche banyere ndị ọzọ.”—JEFRI NOBỤL

ADỊ M AFỌ: 59

ABỤ M ONYE: AMERỊKA

NDỤ M BIRI: ACHỌGHỊ M IRUBERE OKPUKPE NA GỌỌMENTI ISI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A zụlitere m n’Ipswich, Masachusets, bụ́ obodo dị n’akụkụ osimiri nke ọtụtụ ndị bi na ya bụ ndị ogbenye. Mgbe m toro, m gara biri n’ebe na-emepeghị emepe n’obodo Vemọnt. Mụ na enyi m nwaanyị na-ebi nnọọ ndụ ahụhụ ma e were otú ndị bi na Kọntinent Ebe Ugwu Amerịka si ebi ndụ lee anyị anya. Anyị enweghị ọkụ eletrik, n’ihi ya, ihe anyị na-eji esi nri ma na-ekpo ụlọ anyị ọkụ bụ nkụ anyị kpatara n’ọhịa. Anyị na-aga mposi n’èzí, ọ bụkwa naanị mgbe ụfọdụ ka pọmpụ anyị na-agba. Anyị achọghị ibi ndụ otú ndị ọzọ si ebi, ọdịdị anyị na-egosikwa nke a. O nwere mgbe m na-anya isi na abọghị m isi m ruo ọnwa isii.

N’oge ahụ, mba Amerịka na-alụ Agha Vietnam. Nke a metụtara otú m si ele ọchịchị anya. M hụrụ na ndị gọọmenti na ndị okpukpe bụ ndị ihu abụọ. M chere na gọọmenti na okpukpe agaghị egboli mkpa ụmụ mmadụ nakwa na onye ọ bụla kwesịrị ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, m chere na izuru ihe ọ bụla dị m mkpa abụghị ihe ọjọọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mụ na enyi m nwaanyị maliterela ịgụ Baịbụl, ma anyị anaghị aghọta ya. M na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ma m na-agbalịkwa ịkwụsị ya. Enyi m nwaanyị chọrọ ka anyị lụọ ma mụọ ụmụ. N’oge ahụ, Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị, anyị na ya amalitekwa ịmụ Baịbụl.

N’oge na-adịghị anya, m kwụsịrị ndụ ọjọọ m; ma, ịgbanwe otú m si ele ndị nọ n’ọchịchị anya siiri m ike karị. M na-agbagha ihe ọ bụla. M tolitere n’enwechaghị onye na-atụrụ m ihe m na-eme, n’ihi ya, o siiri m ike irubere iwu onye ọzọ isi.

Kemgbe ụwa, ekweere m n’Onye Okike, ma o nweghị ezigbo ihe m maara banyere ya. Ma, ka m na-amụ Baịbụl, m matawara ụdị onye Jehova Chineke bụ. M hụrụ na o kwuru kpọmkwem ihe ọ chọrọ m n’aka. Ihe ndị ọ chọrọ n’aka ụmụ mmadụ doro anya. M mụtakwara na o nwere nnọọ nzube ọ ga-eji mee ka ụwa bụrụ paradaịs. (2 Pita 3:13) Eziokwu ndị a mere ka m chọọ ịgbanwe àgwà m, ka m wee ruo eruo ijere ya ozi.

Ihe kacha masị m bụ otú Ndịàmà Jehova si jụ ịga agha. O nweghị okpukpe ọzọ zuru ụwa ọnụ m maara na-eme ihe ahụ Baịbụl kwuru.

M maara na ọ bụrụ na m chọrọ ijere Jehova ozi, m ga-agbanwerịrị ọdịdị m. Ná mmalite, o siiri m ike iji ụdị ejiji Ndịàmà na-eji. Ma mụ ma ndị enyi m adịghị onye nwere uwe e ji akpọ taị, traụza, ma ọ bụ ụdị akpụkpọ ụkwụ e ji eyi ha. Enwekwanụghị m taị! Ma, m kpụrụ isi m ma mezikwuo ọdịdị m. N’agbanyeghị nke ahụ, m na-echeta ụbọchị mbụ m gara ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. E nwere otu enyo m hụrụ otú m dịzi na ya. M jụrụ onwe m, sị, ‘Olee ihe m mere onwe m?’ Otú ọdịdị m dịzi mechara dị m mma.

URU NDỊ M RITERELA: M lụrụ enyi m nwaanyị, anyị ka bikwa n’obi ụtọ. Mụ na ya enweela ike ịzụlite ụmụ anyị atọ ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi. Obi atọọkwala m ụtọ inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu Baịbụl ndị ahụ nyeere m aka ịgbanwe ndụ m.

Mgbe mbụ, m na-anya isi na anaghị m achọ ịma ihe ndị ọzọ chere. Ana m enweta ọṅụ nke iche banyere ndị ọzọ na ndị ọzọ iche banyere m.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]

“M na-eji ụkwụ aga ọtụtụ kilomita naanị iji zụta wii wii”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

“Ihe ndị m mụtara na Baịbụl gbanwere otú m si ele ndụ anya”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

“O siiri m ike iji ụdị ejiji Ndịàmà na-eji”