Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị bụ ọnụ ụzọ ámá obodo e kwuru nnọọ okwu ya ọtụtụ ugboro na Baịbụl?

N’oge Baịbụl, a na-eji mgbidi agba ihe ka ọtụtụ n’obodo ndị e nwere mgbe ahụ gburugburu. N’ime ọtụtụ ọnụ ụzọ ámá, e nwere ámá ebe ndị mmadụ na-ezukọ iji hụ ndị ọzọ, iji zụọ ahịa, na iji kọrịa akụkọ. A na-anọ ebe a amara ọha na eze ọkwa, ndị amụma nwekwara ike ịnọ na ya zie ozi e dunyere ha. (Jeremaya 17:19, 20) Akwụkwọ bụ́ The Land and the Book kwuru na “ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ma ọ bụ n’ebe dị nso na ya ka ọha na eze na-anọ azụ ahịa niile ha na-azụ.” N’Izrel oge ochie, ọnụ ụzọ ámá obodo dị nnọọ ka ámá ndị e nwere n’obodo dị iche iche taa.

Dị ka ihe atụ, Ebreham zụrụ ala ebe a ga na-eli ndị ezinụlọ ya n’aka Ifrọn “n’ihu ụmụ Het n’etiti ndị niile na-abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya.” (Jenesis 23:7-18) Boaz gwakwara ndị okenye iri nke obodo Betlehem ka ha nọdụ ala n’ọnụ ụzọ ámá ka ya nọrọ n’ihu ha mee ndokwa maka Rut nakwa maka ihe onwunwe di ya nwụrụ anwụ, iji rube isi n’iwu ikuchi nwaanyị di ya nwụrụ. (Rut 4:1, 2) Mgbe ndị okenye obodo chọrọ ikpe ikpe, ha na-anọdụ ala n’ọnụ ụzọ ámá obodo ịnụrụ okwu ikpe, ikpebi ikpe, na ime ihe e kpere n’ikpe.—Diuterọnọmi 21:19.

Olee ebe Ofa dị, bụ́ ebe Baịbụl kpọrọ ebe e si enweta ezi ọlaedo?

Akwụkwọ Job bụ ebe mbụ e kwuru banyere “ọlaedo Ofa” ma jiri ya tụnyere “ezi ọlaedo.” (Job 28:15, 16) Ihe dị ka narị afọ isii oge Job gachara, Eze Devid tụbatara “ọlaedo Ofa” maka iwu ụlọ nsọ Jehova na Jeruselem. Nwa ya Sọlọmọn si n’Ofa tụbatakwa ọlaedo.—1 Ihe E Mere 29:3, 4; 1 Ndị Eze 9:28.

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Sọlọmọn rụrụ ọtụtụ ụgbọ mmiri n’Iziọn-giba, n’Oké Osimiri Uhie, bụ́ ndị na-esi n’Ofa ebutere ya ọlaedo. (1 Ndị Eze 9:26) Ndị ọkà mmụta kwuru na Iziọn-giba dị n’elu elu Alaka Oké Osimiri Akaba nke dị nso n’obodo Ilat na Akaba nke oge a. Ụgbọ mmiri nwere ike isi n’ebe ahụ ruo ebe ọ bụla n’Oké Osimiri Uhie ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ dị anya a na-azụ ahịa n’ụsọ oké osimiri ndị dị n’Afrịka ma ọ bụ n’India, bụ́ ebe ndị nwere ike ịbụ obodo Ofa. Ma, ndị ọzọ kweere na Ofa dị n’Arebia, bụ́ ebe a chọpụtarala e gwuru ọlaedo n’oge ochie, bụ́kwa ebe e gwudịrị ọlaedo n’oge anyị a.

Iji gosi ma ebe ahụ Sọlọmọn gwuru ọlaedo ọ̀ bụ naanị akụkọ ifo, dị ka ụfọdụ ndị kweere, ka ọ̀ bụ na ọ bụghị, ọkà n’ihe ọmụmụ banyere Ijipt oge ochie bụ́ Kenet A. Kichin dere, sị: “Ofa abụghị akụkọ ifo. E dere okwu a dị nkenke a na-ahụ nke ọma n’ahụ́ iberibe ite ụrọ ndị Hibru nke ọ ga-abụ na a kpụrụ na narị afọ nke asatọ [T.O.A.]: ‘Ọlaedo Ofa maka Bet-Horọn—shekel iri atọ.’ Ofa a e dere na ya bụ nnọọ ebe e si enweta ọlaedo, dịkwa ka ọ dị ‘Ọlaedo ‛Amau,’ ma ọ bụ ‘Ọlaedo Punt’ ma ọ bụ ‘Ọlaedo Kush’ bụ́ ndị e dere n’ihe odide ndị Ijipt—ma ọ́ bụghị na obodo nke ọ bụla a kpọrọ aha n’ebe a bụ ebe e si enweta ọlaedo ahụ, ya abụrụ na ọ bụ ụdị ọlaedo e nwere n’obodo ahụ.”

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe Ebreham nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo, na-achọ ịzụ ala

[Foto dị na peeji nke 15]

Iberibe ite ụrọ ndị Hibru nke ihe e dere na ya kpọrọ Ofa aha

[Ebe e si Nweta Foto]

Ihe si n’aka Israel Antiquities Authority, Foto © The Israel Museum, Jeruselem