Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ị Ga-eji Iguzosi Ike n’Ihe Meso Ya Ihe’

‘Ị Ga-eji Iguzosi Ike n’Ihe Meso Ya Ihe’

Bịaruo Chineke Nso

‘Ị Ga-eji Iguzosi Ike n’Ihe Meso Ya Ihe’

2 SAMUEL 22:26

ONYE mmadụ tụkwasịrị obi ịgba ya mgba okpuru na-ewute nnọọ ewute. Ụdị ihe ahụ na-emekarị n’ụwa a ndị na-anaghị eguzosi ike n’ihe juru. (2 Timoti 3:1-5) Ò nwere onye anyị nwere ike ịtụkwasị obi na mee elu mee ala ọ ga-eguzosi ike n’ebe anyị nọ? Ka anyị tụlee akaebe Eze Devid nke Izrel oge ochie gbara.

Devid nwere ọtụtụ ndị gbara ya mgba okpuru ná ndụ ya. Sọl, bụ́ eze mbụ nke Izrel, chụpụrụ ya n’obodo ma kpagbuo ya n’ihi ekworo. N’ụlọ Devid, Maịkal, bụ́ nwunye ya, eguzosighị ike n’ebe di ya nọ, kama nke ahụ, o ‘ledara ya anya n’obi ya.’ (2 Samuel 6:16) Ahitofel, bụ́ onye ndụmọdụ Devid ọ tụkwasịrị obi, gbara ya mgba okpuru ma soro onye na-achọ ịnara Devid ọchịchị. Olee onye nọ n’isi ndị a na-achọ ịnara Devid ọchịchị? Leenụ, ọ bụ nnọọ Absalọm, nwa Devid! Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị Devid tụkwasịrị obi gbara ya mgba okpuru, ike ọ̀ gwụrụ Devid, ya ekwubiekwa na ọ dịghị onye nwere ike iguzosi ike n’ihe n’agbanyeghị ihe merenụ?

Anyị na-ahụ azịza ya n’okwu Devid e dere na 2 Samuel 22:26. Ebe Devid bụ nwoke nwere okwukwe siri ike, ọ bụrụ abụ banyere Jehova Chineke, sị: “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe.” Obi siri Devid ike na ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ nwere ike ịgba ya mgba okpuru, Jehova ga-anọgide na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.

Ka anyị lerukwuo okwu ndị ahụ Devid kwuru anya. Okwu Hibru a sụgharịrị “ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe” nwekwara ike ịpụta “ga-emere ebere.” Ezi iguzosi ike n’ihe na-adabere n’ịhụnanya. Jehova na-arapara nnọọ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ n’ahụ́. *

Ihe ọzọ anyị kwesịkwara ịmụta n’ebe a bụ na iguzosi ike n’ihe abụghị naanị ihe mmadụ na-eche n’echiche; ọ bụ ihe mmadụ na-eme n’omume. Devid si n’ihe ndị mere ya ná ndụ mata na Jehova na-eji iguzosi ike n’ihe emeso ndị mmadụ ihe. N’oge ndị ihe kacha siere Devid ike ná ndụ, Jehova gbataara ya ọsọ enyemaka, jiri iguzosi ike n’ihe na-echebe ma na-eduzi eze ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Devid kelere Jehova maka ihe ndị o meere ya ma kwuo na ọ bụ ya napụtara ya “n’ọbụ aka ndị iro ya.”—2 Samuel 22:1.

Olee ihe okwu Devid pụtaara anyị? Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Jems 1:17) Ọ na-agbaso ụkpụrụ ya ma na-emezu nkwa ya mgbe niile. Devid dere n’abụ ọma ọzọ, sị: “Jehova [agaghị] ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.”—Abụ Ọma 37:28.

Jehova ji iguzosi ike n’ihe anyị akpọrọ ihe. Obi na-atọ ya ụtọ mgbe anyị ji iguzosi ike n’ihe na-erubere ya isi, ọ na-agbakwa anyị ume iṅomi ya n’otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe. (Ndị Efesọs 4:24; 5:1) Ọ bụrụ na anyị ana-eguzosi ike n’ihe n’ụzọ ndị a, obi ga-esi anyị ike na ọ gaghị emekata hapụ anyị. N’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ ndị ọzọ si gbaa anyị mgba okpuru, obi nwere ike isi anyị ike na Jehova ga-eji iguzosi ike n’ihe gbatara anyị ọsọ enyemaka, nyere anyị aka imeri ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. Ì kpebiela ịbịarukwu Jehova, bụ́ “Onye na-eguzosi ike n’ihe,” nso?—Mkpughe 16:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Samuel nke Abụọ 22:26 na Abụ Ọma 18:25 na-ekwu otu ihe. Otu nsụgharị Baịbụl si otú a sụgharịa abụ ọma ahụ: “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-egosi onwe gị dị ka onye jupụtara n’ịhụnanya.”—The Psalms for Today.