Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bọlsọm nke Gilied—Ihe Otite Na-agwọ Ọrịa

Bọlsọm nke Gilied—Ihe Otite Na-agwọ Ọrịa

Bọlsọm nke Gilied—Ihe Otite Na-agwọ Ọrịa

OTU akụkọ a ma ama dị n’akwụkwọ Jenesis na Baịbụl kwuru otú ụmụnne Josef si resị ya ndị ahịa Ishmel na-aga Ijipt. Ìgwè ndị njem ahụ na-aga ahịa si Gilied, kamel ha bukwa bọlsọm na ngwá ahịa ndị ọzọ na-aga Ijipt. (Jenesis 37:25) Akụkọ a dị nkenke gosiri na e jighị bọlsọm si Gilied egwuri egwú n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie, n’ihi na ọ na-agwọ nnọọ ọrịa.

Ma, na narị afọ nke isii T.O.A. (Tupu Oge Anyị), Jeremaya onye amụma ji mwute jụọ, sị: “Ọ̀ bụ na mmanụ bọlsọm adịghị na Gilied?” (Jeremaya 8:22) Olee ihe kpaliri Jeremaya ịjụ ajụjụ a? Olee nnọọ ihe bụ́ bọlsọm? È nwere bọlsọm nke nwere ike ịgwọ ọrịa taa?

Bọlsọm n’Oge Baịbụl

Bọlsọm bụ aha a na-akpọ mmiri na-esi ísì ụtọ na-adịkarị mmanụ mmanụ na-agbapụta n’ahịhịa na n’osisi dị iche iche. Mmanụ bọlsọm, bụ́ nke a na-ejikarị emepụta ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ma ọ bụ sent, so n’ihe ndị dị oké ọnụ ahịa e nwere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie. O so n’ihe ndị a kpọrọ aha e ji mee mmanụ nsọ e ji ete mmadụ mmanụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ e surere n’ụlọikwuu obere oge ụmụ Izrel sicha n’Ijipt pụta. (Ọpụpụ 25:6; 35:8) Mmanụ bọlsọm so n’onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn. (1 Ndị Eze 10:2, 10) E tere Esta ‘mmanụ bọlsọm ma jiri ya hịa ya aka n’ahụ́ ruo ọnwa isii’ tupu ya apụta n’ihu Eze Ahazuirọs nke Peshia.—Esta 1:1; 2:12.

Ọ bụ ezie na a na-esi n’ebe dị iche iche n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa enweta bọlsọm, bọlsọm nke Gilied na-esi n’Ala Nkwa ahụ, ebe ọ bụ na Gilied bụ ógbè dị nnọọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan. Nna ochie bụ́ Jekọb lere bọlsọm anya dị ka otu n’ime “ihe ndị kasị mma nke ala [ya],” ma ziga ya n’Ijipt dị ka onyinye. (Jenesis 43:11) Bọlsọm sokwa ná ngwa ahịa ndị Ezikiel onye amụma depụtara, bụ́ ndị ndị Juda na Izrel na-ebuga Taya. (Ezikiel 27:17) A ma bọlsọm ama dị ka ihe e ji agwọ ọrịa. Akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie kwuru ugboro ugboro na bọlsọm na-agwọ ọrịa, karịsịa ọnyá.

Bọlsọm Maka Mba Nọ n’Ọrịa

Oleezi ihe mere Jeremaya ji jụọ ajụjụ ahụ bụ́, “Ọ̀ bụ na mmanụ bọlsọm adịghị na Gilied”? Iji ghọta azịza ya, anyị aghaghị ịtụle ọnọdụ mba Izrel n’oge ahụ. Tupu mgbe ahụ, onye amụma bụ́ Aịzaya kwuru banyere ọnọdụ ọjọọ nke mba ahụ n’ihu Chineke: “Malite n’ọbụ ụkwụ ruo n’isi, ọ dịghị ebe fọrọnụ. Ọnyá na nchihịa ahụ́ na ọnyá ọhụrụ, a pịghị ha apị, e kechighị ha ekechi.” (Aịzaya 1:6) Kama mba ahụ ga-aghọta ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya ma chọọ ọgwụgwọ, ha nọgidere n’ụzọ ọjọọ ha. N’oge Jeremaya, naanị ihe Jeremaya nwere ike ime bụ ịkwa arịrị, sị: “Ha ajụwo okwu Jehova, olee ụdị amamihe ha nwere?” A sị na ha lọghachikwutere Jehova, ọ gaara agwọ ha. “Ọ̀ bụ na mmanụ bọlsọm adịghị na Gilied?” Nke ahụ bụ nnọọ ajụjụ kwesịrị ime ka mmadụ chee echiche!—Jeremaya 8:9.

N’ọtụtụ ụzọ, ụwa nke oge a nwere nnọọ “ọnyá na nchihịa ahụ́ na ọnyá ọhụrụ.” Ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ihi ịda ogbenye, ikpe na-ezighị ezi, ịchọ ọdịmma onwe onye naanị, na obi ịkpọ nkụ, n’ihi na ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi ajụọla oyi. (Matiu 24:12; 2 Timoti 3:1-5) Ọtụtụ ndị na-ele onwe ha anya dị ka ndị a jụrụ ajụ n’ihi agbụrụ ha, ọnọdụ ha ná ndụ, na afọ ndụ ha. E wezụgakwa nke ahụ, ụnwụ nri, ọrịa, agha, na ọnwụ na-akpa ha aka ọjọọ. Dị ka Jeremaya, ọtụtụ ndị kwere ekwe obi ha dị ọcha na-eche ma è nwere ‘bọlsọm na Gilied’ nke a ga-eji kechie ndị na-ata ahụhụ ọnyá ime mmụọ ha na obi ha tiwara etiwa.

Ozi Ọma nke Na-agwọ Ọrịa

N’oge Jizọs, ndị dị umeala n’obi nọkwa na-eche banyere ajụjụ ahụ. Ma, a zara ha ya. Ná mmalite afọ 30 O.A., n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Nazaret, Jizọs si n’akwụkwọ mpịakọta Aịzaya gụpụta, sị: “Jehova etewo m mmanụ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma. O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi.” (Aịzaya 61:1) Jizọs kwuziri na ọ bụ ya ka ebe ahụ na-ekwu banyere ya, mee ka a mara na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ nke e nyere ọrụ izi ndị mmadụ ozi nkasi obi.—Luk 4:16-21.

N’oge niile Jizọs jere ozi ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 4:17) N’Ozizi Elu Ugwu ya, o kwere ndị na-ata ahụhụ nkwa na a ga-agbanwe ọnọdụ ha, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị na-akwa ákwá ugbu a, n’ihi na unu ga-achị ọchị.” (Luk 6:21) Site n’ịkpọsa ọbịbịa nke Alaeze Chineke—bụ́ ozi olileanya—Jizọs ‘kechiri ọnyá nke ndị e tiwara obi.’

N’oge anyị a, “ozi ọma alaeze ahụ” ka na-akasi ndị mmadụ obi otú ahụ. (Matiu 6:10; 9:35) Ka anyị were ọnọdụ Roja na Lilian dị ka ihe atụ. Jenụwarị 1961 bụ mgbe mbụ ha nụrụ banyere nkwa Chineke kwere inye ụmụ mmadụ ndụ ebighị ebi, o mekwara nnọọ ka ahụ́ ruo ha ala ka ndị e tere mmanụ bọlsọm. Lillian chetara ihe merenụ, sị: “Ihe m nọ na-amụta mere ka m tegharịa egwú n’usekwu anyị. Obi tọrọ m nnọọ ụtọ.” Roja, bụ́ onye otu akụkụ ahụ́ ya kpọnwụrụla akpọnwụ ruo afọ iri mgbe ahụ, kwukwara, sị: “M nwere ezigbo obi ụtọ, obi ụtọ ịdị ndụ, n’ihi olileanya magburu onwe ya m nwere—olileanya mbilite n’ọnwụ na nkwụsị a ga-akwụsị ihe mgbu na ọrịa niile.”—Mkpughe 21:4.

N’afọ 1970, nwa ha nwoke dị afọ iri na otu nwụrụ. Ma, ha adaghị mbà n’obi. Ha hụrụ na Jehova “na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Abụ Ọma 147:3) Olileanya ha kasiri ha obi. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ ise ugbu a, ozi ọma nke Alaeze Chineke na-abịanụ emeela ka ha nwee udo na afọ ojuju.

Ọgwụgwọ A Ka Ga-enwe n’Ọdịnihu

Ya mere, è nwere ‘bọlsọm na Gilied’ taa? Ee, mmanụ bọlsọm ime mmụọ ka dị taa. Nkasi obi na olileanya ozi ọma nke Alaeze ahụ na-enye nwere ike ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi. Ị̀ ga-achọ inweta ụdị ọgwụgwọ ahụ? Naanị ihe ị ga-eme bụ imepe obi gị ma nabata ozi nkasi obi nke si n’Okwu Chineke, kwekwa ka o jupụta ná ndụ gị. Ọtụtụ nde mmadụ emeelarị otú ahụ.

Ọgwụgwọ a na-enweta na bọlsọm a na-egosi na ụmụ mmadụ ka ga-enweta obi iru ala ka ukwuu n’ọdịnihu. Oge Jehova Chineke ‘ga-agwọ mba niile’ iji mee ka ha nweta ndụ ebighị ebi na-eru nso n’ike n’ike. N’oge ahụ, “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” Ee, a ka nwere ‘bọlsọm na Gilied’!—Mkpughe 22:2; Aịzaya 33:24.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọgwụgwọ a na-enweta n’ozi ọma nke Alaeze Chineke ka na-eme ka obi ruo ndị e tiwara obi ha etiwa taa ala