Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu Banyere Mmehie

Eziokwu Banyere Mmehie

Eziokwu Banyere Mmehie

ONYE ọrịa ò nwere ike ime ka ndị mmadụ kwere na o nweghị ihe na-eme ya site n’imebi ihe e ji lee ya ahụ́? Mbanụ! N’otu aka ahụ, na ọtụtụ ndị ekweghị ihe Chineke kwuru banyere mmehie apụtaghị na mmehie adịghị. Okwu ya, bụ́ Baịbụl, kwuru ọtụtụ ihe banyere mmehie. Olee kpọmkwem ihe o kwuru banyere mmehie?

Mmadụ Niile Erughị Ebube Chineke

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Pọl onyeozi kwuru na o wutere ya na ‘ezi ihe nke ya na-achọ ime ka ya na-adịghị eme, kama ihe ọjọọ nke ya na-achọghị ime ka ya na-eme.’ (Ndị Rom 7:19) Ọ bụrụ na anyị agwa onwe anyị eziokwu, anyị ga-ekweta na ọnọdụ anyị na ya yiri. Ikekwe, ọ masịrị anyị idebe Iwu Iri ahụ ma ọ bụ iwu ndị ọzọ, ma, ma ọ̀ dị anyị mma ma ọ bụ na ọ dịghị anyị mma, anyị niile na-eme mmehie. Ọ bụghị na anyị na-ama ụma emebi iwu, kama anyị bụ ndị na-ezughị okè. Olee ihe mere o ji dị otú ahụ? Pọl n’onwe ya zara ya, sị: “Ọ bụrụ na ihe m na-achọghị ime ka m na-eme, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-arụpụta ya, kama ọ bụ mmehie nke bi n’ime m.”—Ndị Rom 7:20.

Dị ka Pọl, mmadụ niile bu adịghị ike pụta ụwa—nke na-egosi na ha ketara mmehie na ezughị okè. Onyeozi ahụ kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” Olee ihe kpatara ọnọdụ a? Pọl gara n’ihu ịsị: “Dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Ndị Rom 3:23; 5:12.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị anabataghị echiche bụ́ na mmehie nne na nna anyị mbụ mere mere ka anyị na Chineke ghara ịdịkwa ná mma, meekwa ka anyị gharazie izu okè, n’ezie, ọ bụ ihe Baịbụl na-akụzi. Jizọs gosiri na ya kweere akụkọ Adam na Iv site n’ikwu ihe ndị dị n’isi ndị mbụ nke Jenesis iji kwado ihe ọ na-ekwu.—Jenesis 1:27; 2:24; 5:2; Matiu 19:1-5.

Otu n’ime ozizi ndị bụ́ isi dị na Baịbụl bụ na Jizọs bịara n’ụwa ịgbapụta ụmụ mmadụ ndị nwere okwukwe na ya ná mmehie ha. (Jọn 3:16) Ihe ga-eme ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ n’ọdịnihu bụ ịnabata ndokwa Jehova mere ịgbapụta ụmụ mmadụ ndị na-akwanyere ya ùgwù ná nsogbu ha na-agaghị anapụtali onwe ha na ya. Ma, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe bụ́ mmehie n’anya Chineke, anyị agaghị aghọtali ndokwa o merela iji gbapụta anyị na ya.

Àjà Jizọs na Ihe Mere O Ji Dị Mkpa

Jehova nyere nwoke mbụ ahụ olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Naanị ihe nwere ike ime ka olileanya a magburu onwe ya kwaa Adam bụ ya inupụrụ Chineke isi. Adam nupụrụ isi ma ghọọ onye mmehie. (Jenesis 2:15-17; 3:6) Adam mere ihe megidere uche Chineke, gharazie izu okè, ma mebie mmekọrịta ya na Chineke. Mgbe o mere mmehie site n’ịda iwu Chineke, ọ malitere ịka nká ma mechaa nwụọ. Ọ dị mwute na a mụrụ ụmụ Adam niile—ma anyị—ná mmehie, ọnwụ na-echekwa anyị ihu n’ihi ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Azịza ya dị nnọọ mfe. Nne na nna na-ezughị okè enweghị ike ịmụ ụmụ zuru okè. Ụmụ niile Adam mụrụ bụ ndị mmehie, Pọl onyeozi kwukwara na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ma, ihe a e kwukwara n’amaokwu ahụ mere ka anyị nwee olileanya: “Ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, site n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, a ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ na-erube isi ma na-akwanyere Chineke ùgwù nsogbu ndị mmehie Adam buteere ha. * (Matiu 20:28; 1 Pita 1:18, 19) Olee otú nke ahụ kwesịrị ime ka obi dị gị?

Ịhụnanya Kraịst “Na-akpali Anyị”

Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe bụ́ uche Chineke n’ajụjụ ahụ dị n’elu. O dere, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị, n’ihi na ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile; . . . ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.” (2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15) Ọ bụrụ na mmadụ ghọtara na àjà Jizọs chụrụ nwere ike ime ka o nwere onwe ya ná nsogbu ndị mmehie butere—ma nwee mmasị ikele Chineke maka ndokwa ahụ—o kwesịrị ịgbalị ibi ndụ ya otú Chineke chọrọ. Nke a gụnyere ịmụta ihe Chineke chọrọ ya n’aka, iji ụkpụrụ Baịbụl zụọ akọ na uche ya, ma biwezie ndụ kwekọrọ na ha.—Jọn 17:3, 17.

Ime ihe ọjọọ na-emebi mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. O doro anya na ezigbo ihere mere Eze Devid mgbe ọ ghọtara otú iko ya na Bat-shiba kwara na ogbugbu o gburu di ya jọruru ná njọ. Ma, ihe kacha wute ya, bụ́kwanụ otú o kwesịrị ịdị, bụ na mmehie ya wutere Chineke. O ji mwute gwa Jehova, sị: “Ọ bụ gị, naanị gị, ka m mehieworo, ọ bụkwa ihe dị njọ n’anya gị ka m meworo.” (Abụ Ọma 51:4) N’otu aka ahụ, mgbe a nwara Josef ọnwụnwa ịkwa iko, akọ na uche ya mere ka ọ jụọ, sị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?”—Jenesis 39:9.

N’ihi ya, ihe dị njọ ná mmehie abụghị naanị mwute anyị nwere ike inwe na e jidere anyị. Ọ bụghị naanị na ọha na eze nwere ike ịkpọ anyị asị n’ihi na anyị mere ihe e weere dị ka ihe ọjọọ. Anyị ịda iwu Chineke nyere banyere mmekọahụ, ịkwụwa aka ọtọ, nsọpụrụ, ofufe, na ihe ndị ọzọ, na-emebi mmekọrịta anyị na ya. Ọ bụrụ na anyị amara ụma na-eme mmehie, anyị na-eme onwe anyị ndị iro Chineke. Ihe a bụ eziokwu anyị kwesịrị nnọọ ichebara echiche.—1 Jọn 3:4, 8.

Ajụjụ bụzi, Mmehie ọ̀ laala? Nke bụ́ eziokwu bụ na mmehie ka dị. Ọ bụ naanị na ndị mmadụ malitere ịkpọ ya aha ọzọ, chee na ọ ga-eme ka ọ ghara ịdịchakwa njọ. Ọtụtụ ndị mere ka akọ na uche ha kwụsị ịrụ ọrụ nke ọma ma ọ bụ kwụsị ige ya ntị. Ndị niile chọrọ ka Chineke gọzie ha aghaghị izere ụdị àgwà ahụ. Dị ka anyị hụrụla, ụgwọ ọrụ nke mmehie abụghị naanị mmadụ ire ùgwù ya ma ọ bụ imechu onwe ya ihu, kama ọ bụ ọnwụ. Okwu banyere mmehie bụ okwu ọnwụ na ndụ.

Ma, obi ga-adị gị ụtọ ịmata na n’ihi àjà mgbapụta Jizọs ji ndụ ya chụọ, e nwere ike ịgbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị chegharịa ma hapụ ha. Pọl dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a gbaghaara mmebi iwu ha na ndị e kpuchiri mmehie ha; obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-agaghị agụkọrọ mmehie ya ma ọlị.”—Ndị Rom 4:7, 8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara nke ọma otú àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ si nwee ikike ịnapụta ụmụ mmadụ na-erube isi, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 47 ruo nke 54, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Chọọchị Agbanwee Ozizi Ya

Ọ dịtụbeghị mgbe ozizi Limbo doro ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga chọọchị Katọlik anya. Kemgbe iri afọ ole na ole, ọ nọ na-anyụ ka ọkụ—ruo n’ókè na ọ naghịzi apụta n’akwụkwọ katkizim. N’afọ 2007, Chọọchị Katọlik wepụtara otu ihe odide ha ji gosi na ha akwụsịla izi ozizi Limbo ma kwuo “ihe ndị metụtara nkà mmụta na ozizi okpukpe mere a ga-eji nwee olileanya na e nwere ike ịzọpụta ụmụ ọhụrụ ndị nwụrụ mgbe a na-emebeghị ha baptizim ma mee ka ha banye n’obi ụtọ ebighị ebi.”—Òtù Na-ahụ Maka Nkà Mmụta Okpukpe Katọlik n’Ụwa Niile.

Gịnị mere ha ji gbanwee ozizi a? Isi ihe ọ rụpụtara bụ na o mere ka chọọchị ahụ nwere onwe ya n’ihe Henri Tink, bụ́ onye Frans na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, kpọrọ “ibu arọ si n’aka fere n’aka nke Chọọchị aghụghọ nọ na-agbachitere malite n’ihe dị ka narị afọ nke iri na abụọ ruo na narị afọ nke iri abụọ, bụ́ Chọọchị ọ na-amasị iji ozizi Limbo eyi ndị nne na nna egwu ka ha kwere ka e mee ụmụ ha baptizim ozugbo.” Ma, nkwụsị a kwụsịrị ịkụzi ozizi Limbo akpatakwala ajụjụ ndị ọzọ.

Omenala Ka Ọ̀ Bụ Akwụkwọ Nsọ? Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ozizi Limbo malitere mgbe ndị ọkà mmụta okpukpe dịrị ndụ na narị afọ nke iri na abụọ nwechara nrụrịta ụka banyere pọgatrị. Chọọchị Katọlik kụziri na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe mmadụ nwụrụ, n’ihi ya, ha aghaghị ikwu ebe mkpụrụ obi ụmụaka na-agalighị eluigwe maka na e meghị ha baptizim ga-aga, ebe ọ bụkwanụ na ha ekwesịghị ịga ọkụ ala mmụọ. Ọ bụ otú ahụ ka e si malite izi ozizi Limbo.

Ma, Baịbụl anaghị akụzi na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe mmadụ nwụchara. Kama ikwu na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ, o kwuru hoo haa na e nwere ike ‘ibibi’ mkpụrụ obi ụmụ mmadụ na-eme mmehie nakwa na ha “ga-anwụ.” (Ọrụ 3:23; Ezikiel 18:4) Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, e nweghị ike inwe ebe dị ka Limbo. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl kwuru na onye nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, jiri ọnwụ tụnyere ụra.—Ekliziastis 9:5, 10; Jọn 11:11-14.

Baịbụl gosiri na Chineke weere ụmụaka ndị nne na nna ha bụ Ndị Kraịst dị ka ndị dị nsọ. (1 Ndị Kọrịnt 7:14) Okwu dị otú a enweghị isi ma ọ bụrụ na ime ụmụ ọhụrụ baptizim dị mkpa iji zọpụta ha.

Ozizi Limbo na-akparị Chineke, mee ka o yie onye aka ike nke na-ata ndị aka ha dị ọcha ahụhụ, kama ịbụ Nna na-ekpe ikpe ziri ezi nke hụrụ ụmụ ya n’anya, bụ́kwanụ ihe ọ bụ. (Diuterọnọmi 32:4; Matiu 5:45; 1 Jọn 4:8) Ka a sịkwa ihe mere ozizi a na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ ji na-enye Ndị Kraịst obi ha dị ọcha nsogbu n’obi kemgbe!

[Foto dị na peeji nke 9]

Irubere Okwu Chineke isi ná ndụ anyị na-eme ka anyị na Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị dịrị ná mma