Kpakpando Hà Na-emetụta Ndụ Gị?
Kpakpando Hà Na-emetụta Ndụ Gị?
Ị NỌRỌ n’ebe gbara ọchịchịrị n’abalị ihu ígwé gbachapụrụ agbachapụ lelie anya elu, eluigwe na-adị ka ákwà ojii mara mma nwere ọtụtụ puku dayamọnd na-egbuke egbuke. Ọ bụ naanị kemgbe narị afọ atọ na ọkara gara aga ka ụmụ mmadụ malitere ịghọta otú kpakpando dị iche iche bururu ibu na otú ha si dị anya site n’ụwa. Anyị ka na-amalite nnọọ amalite ịghọta nnukwu ihe dị iche iche na-akpa ike n’eluigwe na ala anyị dị ebube.
Kemgbe ụwa, ụmụ mmadụ na-ahụ ka ihe dị iche iche na-agagharị n’usoro n’ihu ígwé n’abalị na otú ha si agbanwe ọnọdụ ha n’oge dị iche iche. (Jenesis 1:14) Ọtụtụ ndị ekwuola ihe yiri ihe Eze Devid nke Izrel kwuru, bụ́ onye dere n’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ, nke mere i ji na-echeta ya?”—Abụ Ọma 8:3, 4.
N’agbanyeghị nke ahụ, ma ànyị maara ma ọ bụ na anyị amaghị, ihe ndị dị n’eluigwe na ngagharị ha na-emetụta ndụ anyị n’ụzọ ka nnọọ ukwuu. Anyanwụ, bụ́ kpakpando nke dị anyị nso, bụ́kwa nke ụwa na-agba gburugburu, bụ ihe ụmụ mmadụ kacha eji agụ oge—awa ole dị n’ụbọchị na ọnwa ole dị n’afọ. Ọnwa bụ ‘ihe e ji amata oge a kara aka,’ ma ọ bụ ihe “na-egosi oge dị icheiche.” (Abụ Ọma 104:19; Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Kpakpando na-enyekwara nnọọ ndị njem ụgbọ mmiri aka ịmata ụzọ, na-enyedịrị ndị na-aga na mbara igwe aka iduzi ụgbọ mbara igwe ha. N’ihi nke a, ụfọdụ na-eche ma kpakpando hà nwere nnọọ ike ịrụrụ anyị ọrụ ọzọ karịa ime ka anyị na-amata oge ma na-ekelekwu Chineke maka ihe ndị o kere. Hà nwekwara ike ime ka anyị mata ọdịnihu anyị ma ọ bụ mata ọdachi ndị na-aga ịdakwasị anyị?
Ihe Mere E Ji Agụ Kpakpando na Otú O Si Malite
Ile anya n’eluigwe iji hụ ihe mgbaàmà ọdịnihu iji duzie ndụ ndị mmadụ n’ụwa malitere na Mesopotemia oge ochie, ma eleghị anya, na narị afọ nke atọ T.O.A. (Tupu Oge Anyị) Ndị mbụ gụrụ kpakpando na-eji nlezianya ekiri eluigwe. Nkà mmụta nke ihe ndị dị na mbara igwe malitere site ná mbọ ha gbara ịghọta otú ihe ndị dị na mbara igwe si agagharị, idekọ ebe kpakpando dị iche iche dị, imepụta kalenda, na ikwu oge ndị chi ga-eji n’ehihie. Ma, ịgụ kpakpando abụghị naanị ịhụ otú anyanwụ na ọnwa si emetụta ụwa. Ọ bụghị naanị na ndị na-agụ kpakpando na-ekwusi ike na otú anyanwụ, ọnwa, planet, kpakpando na ìgwè kpakpando dị iche iche si nọrọ n’akụkụ ibe ha na-emetụta
ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na-eme n’ụwa, kamakwa ha na-ekwu na ha na-emetụta ndụ ndị mmadụ n’otu n’otu. Olee otú ọ bụ?Ụfọdụ ndị na-agụ kpakpando weere ịgụ kpakpando dị ka otú ha si eji ihe ndị dị na mbara igwe amata ọdịnihu, bụ́ nke nwere ike ịbara ndị maara otú e si akọwa ha uru n’ụzọ dị iche iche. Ndị ọzọ chere na ịgụ kpakpando na-egosi nnọọ ihe a kara aka na anyị ga-eme ma ọ bụ na o nwere ike inyere anyị aka ịmata oge kacha mma iji mee ihe ụfọdụ anyị chọrọ ime. E kwuru na a na-amata ihe ndị dị otú ahụ site n’ikiri ebe ihe ndị bụ́ isi dị na mbara igwe dị na “ịgbakọ” otú ha si emetụta ibe ha na ụwa. A sịrị na ihe na-ekpebi otú ha si emetụta mmadụ bụ ebe ihe ndị dị na mbara igwe dị mgbe a mụrụ mmadụ.
Ndị mbụ gụrụ kpakpando chere na ụwa dị n’etiti mbara igwe nakwa na e nwere ihe ndị yiri ụzọ gbara ụwa okirikiri bụ́ ndị nke ọ bụla n’ime ha na-asa mbara karịa nke bu ya ụzọ bụ́ ebe kpakpando na planet dị iche iche si na-agba ụwa gburugburu. Ha chekwara na e nwere otu ụzọ dị na mbara igwe anyanwụ si agafesị kpakpando na ìgwè kpakpando dị iche iche otu ugboro kwa afọ. Ha kpọrọ ụzọ ahụ e chere anyanwụ na-esi aga ekliptik ma kebie ya ụzọ iri na abụọ. A kpọrọ nkebi nke ọ bụla aha ìgwè kpakpando dị na ya bụ́ nke anyanwụ na-esi agafe. Ọ bụ otú ahụ ka e si nweta akara zodịak iri na abụọ. E chere na nkebi ndị a, ma ọ bụ “ụlọ ndị dị n’eluigwe,” bụ ebe obibi nke chi dị iche iche. Ma, ka oge na-aga, ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara na anyanwụ anaghị agba ụwa gburugburu, kama na ọ bụ ụwa na-agba anyanwụ gburugburu. Nchọpụta a mere ka a kwụsị ile ịgụ kpakpando anya ka sayensị.
Ịgụ kpakpando esila n’ebe ọ malitere bụ́ na Mesopotemia gbasaruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ niile nke ụwa, ụdị ya dị iche iche agbanyekwala mgbọrọgwụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo niile kacha mepee anya n’ụwa. Mgbe ndị Peshia merichara Babịlọn, ịgụ kpakpando gbasaruru Ijipt, Gris, na India. Ndị ozi ala ọzọ nke okpukpe Buda si n’India buru ya gaa n’Ebe Etiti Eshia, Chaịna, Tibet, Japan, na n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye maara kpọmkwem otú o si ruo ndị Maya aka, ha gụrụ nnọọ kpakpando ka ndị Babịlọn. Ọ dị ka ụdị ịgụ kpakpando “ọgbara ọhụrụ” ọ̀ malitere n’Ijipt mgbe ndị Gris na-achị ya, o metụtakwala nnọọ nkwenkwe nke ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, okpukpe Alakụba, na nke Krisendọm.
Ọbụna tupu a dọrọ mba Izrel n’agha gaa Babịlọn na narị afọ nke asaa T.O.A., ịgụ 2 Ndị Eze 23:5.
kpakpando metụtara ha. Baịbụl kọọrọ anyị banyere mbọ Eze Josaya kwesịrị ntụkwasị obi gbara ịkwụsị ndị ya ịchụrụ “anyanwụ na ọnwa na ìgwè kpakpando nke zodịak na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe” àjà.—Onye Ịgụ Kpakpando Si n’Aka
Ịgụ kpakpando sitere ná nghọtahie ndị mmadụ ghọtahiere otú ihe ndị dị n’eluigwe dị na otú ha si arụ ọrụ. N’ihi ya, o doro anya na o nweghị ike isi n’aka Chineke. Ebe ọ bụ na ịgụ kpakpando dabeere n’ụgha, o nweghị ike inyere anyị aka ịmata ọdịnihu. E nwere ihe abụọ mere n’oge ochie ga-amasị gị ịnụ bụ́ ndị gosiri nnọọ na ịgụ kpakpando enweghị isi.
Mgbe Eze Nebukadneza na-achị Babịlọn, ndị nchụàjà na ndị na-agụ kpakpando akọlirighị eze ahụ otu nrọ ọ rọrọ. Daniel, bụ́ onye amụma nke ezi Chineke, bụ́ Jehova, kọwara ihe kpatara ya, sị: “Ndị amamihe, ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ, ndị dibịa anwansi na ndị na-agụ kpakpando enweghị ike ịkọrọ eze ihe nzuzo eze chọrọ ka a kọọrọ ya. Otú ọ dị, e nwere Chi nọ n’eluigwe, Onye na-ekpughe ihe nzuzo, o mewokwa ka Eze Nebukadneza mara ihe gaje ime n’oge ikpeazụ.” (Daniel 2:27, 28) N’ezie, Daniel lekwasịrị Jehova Chineke, bụ́ “Onye na-ekpughe ihe nzuzo” anya—ọ bụghị anyanwụ, ọnwa, ma ọ bụ kpakpando—ọ kọkwaara eze ahụ isi nrọ ya.—Daniel 2:36-45.
Otú ndị Maya si agbakọ kpọmkwem ebe kpakpando dị iche iche dị emeghị ka a ghara ibibi obodo ha na narị afọ nke itoolu O.A. (Oge Anyị) Ọ bụghị naanị na otú a ịgụ kpakpando si kụọ afọ n’ala na-egosi nnọọ na ịgụ kpakpando bụ aghụghọ na ihe na-enweghị ike ịkọ ọdịnihu, kamakwa o gosiri nnọọ isi ihe mere ịgụ kpakpando ji malite: ime ka ndị mmadụ ghara ilekwasị Chineke anya iji mata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu.
Na ịgụ kpakpando dabeere n’ụgha na-enyekwara anyị aka ịmata onye o si n’aka. Jizọs kwuru banyere Ekwensu, sị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.” (Jọn 8:44) Setan na-eme ka à ga-asị na ọ bụ “mmụọ ozi nke ìhè,” ndị mmụọ ọjọọ na-emekwa ka hà bụ “ndị ozi nke ezi omume.” Ma, ha bụ nnọọ ndị nduhie chọrọ iji aghụghọ mata ndị mmadụ n’ọnyà. (2 Ndị Kọrịnt 11:14, 15) Okwu Chineke mere ka anyị mara na “ọrụ niile dị ike na ime ihe ịrịba ama ụgha na ịrụ ọrụ ebube ụgha” bụ “ọrụ Setan.”—2 Ndị Tesalonaịka 2:9.
Ihe Mere I Kwesịrị Iji Zere Ya
Ịgụ kpakpando dabeere n’ụgha, n’ihi ya kwa, ọ bụ ihe arụ n’anya Chineke nke eziokwu, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 31:5) Ebe ọ dị otú ahụ, Baịbụl katọrọ ya nnọọ ma gbaa ndị mmadụ ume ka ha zere ya. Na Diuterọnọmi 18:10-12, Chineke kwuru hoo haa, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu . . . onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, . . . onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.”
Ebe ịgụ kpakpando sitere n’aka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, itinye aka na ya ga-eme ka mmadụ nọrọ n’okpuru ha. Dị nnọọ ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ nwere ike ime ka mmadụ bụrụ ohu ndị na-agba mgbere ọgwụ ọjọọ, itinye aka n’ịgụ kpakpando nwekwara ike ime ka mmadụ bụrụ ohu ọkà n’aghụghọ, bụ́ Setan. N’ihi ya, ndị hụrụ Chineke na eziokwu n’anya ga-ajụrịrị ịgụ kpakpando kpamkpam ma gee ntị na ndụmọdụ a dị na Baịbụl: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.”—Emọs 5:15.
Ihe mere ịgụ kpakpando ji amasị ndị mmadụ bụ na ha chọrọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu. Mmadụ ò nwere ike ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu? Ya bụrụ na o nwere ike, olee otú ọ ga-esi mata ya? Baịbụl gwara anyị na anyị enweghị ike ịma ihe ga-eme onye nke ọ bụla n’ime anyị echi, n’ọnwa ọzọ, ma ọ bụ n’afọ ọzọ. (Jems 4:14) N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl gwara anyị ihe ga-eme ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya. O mere ka anyị mara na n’oge na-adịghị anya, Alaeze ahụ anyị na-ekpe ekpere ya n’Ekpere Onyenwe Anyị ga-abịa. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) Ọ gwakwara anyị na ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata ga-akwụsị kpamkpam n’oge na-adịghị anya. (Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:4) Chineke akaghị ihe ga-eme ụmụ mmadụ aka, kama nke ahụ, ọ na-agwa mmadụ niile ka ha mụọ banyere ya na ihe ọ ga-emere ha. Olee otú anyị si mara? Baịbụl mere ka o doo anya na uche Chineke bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.
E keghị eluigwe dị ebube na ihe niile dị n’ime ya iduzi ndụ anyị. Kama nke ahụ, ha na-eme ka anyị mata ike Jehova na ụdị Chineke ọ bụ. (Ndị Rom 1:20) Ha nwere ike ime ka anyị jụ ozizi ụgha dị iche iche ma lekwasị Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl, anya iji nweta ezi nduzi na ntụziaka ndị ga-eme ka ndụ anyị gaa nke ọma. “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”—Ilu 3:5, 6.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]
Ndị Maya ji nnọọ ihe ndị ha chọpụtara n’ịgụ kpakpando mee ọtụtụ ihe
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]
“E nwere Chi nọ n’eluigwe, Onye na-ekpughe ihe nzuzo, o mewokwa ka [a] mara ihe gaje ime n’oge ikpeazụ”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]
Otú ndị Maya si agbakọ kpọmkwem ebe kpakpando dị iche iche dị emeghị ka a ghara ibibi obodo ha
[Foto dị na peeji nke 19]
Ebe a na-ekiri mbara igwe na El Karakol, Chichén Itzá, Yukatán, Meksiko, 750-900 O.A.
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 19]
Peeji nke 18 na 19, site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Kpakpando: NASA, ESA, na A. Nota (STScI); Kalenda ndị Maya: © Lynx/Iconotec com/age fotostock; Onye Maya na-enyocha mbara igwe: © Albert J. Copley/age fotostock; Ebe ndị Maya na-anọ ekiri mbara igwe: El Karakol (The Great Conch) (foto), Mayan/Chichen Itza, Yucatan, Mexico/Giraudon/The Bridgeman Art Library