Mmehie—Olee Ihe Gbanwere na Ya?
Mmehie—Olee Ihe Gbanwere na Ya?
“NDỊ oge a achọghị iji ntị anụ banyere Mmehie Mbụ—na anyị niile na-ata ahụhụ ihe nne na nna anyị mbụ metara. Ma, ha achọghịkwa iji ntị anụ banyere mmehie n’onwe ya. . . . O nwere ike ịbụ na ndị dị ka Adọlf Hitla na Josef Stalin mere mmehie, ma anyị niile na-ata ahụhụ ihe anyị na-emeghị.”—The Wall Street Journal.
Dị ka ihe akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na-egosi, o yiri ka ọtụtụ ndị ekwetakwaghị na mmehie dị taa. Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Olee ihe gbanwerelanụ? Oleedị ihe bụ́ mmehie a ndị mmadụ na-achọghị ikweta taa na ọ dị?
Mmehie a a na-ekwu okwu ya dị ụzọ abụọ—mmehie e ketara eketa na mmehie mmadụ na-eme n’onwe ya. Nke mbụ ahụ bụ ihe dị anyị n’ahụ́, ma ọ̀ dị anyị mma ma ọ bụ na ọ dịghị anyị mma, nke abụọ abụrụ ihe anyị na-eme. Ka anyị lerukwuo nke ọ bụla n’ime ha anya.
Mmehie Mbụ Ò Metụtara Anyị?
Baịbụl kwuru na nne na nna anyị mbụ bufere mmadụ niile mmehie mbụ ha mere. N’ihi ya, anyị niile bu ezughị okè pụta ụwa. Baịbụl kwuru, sị: “Ajọ omume niile bụ mmehie.”—1 Jọn 5:17.
Ma, ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ekwetaghị na ụmụ mmadụ niile bụ ndị mmehie n’ihi mmehie e mere mgbe dị anya gara aga nke aka ha na-adịkwanụghị na ya, ha aghọtakwanụghị ihe mere mmehie ahụ ga-eji metụta ha. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Edwọd Oks kwuru na ozizi a “na-agbagwoju ụfọdụ ndị anya, ndị ọzọ ekwetatụghị na ọ bụ eziokwu, ndị ọzọkwa kweere ya n’elu ọnụ, ma ha amaghị otú o kwesịrị isi metụta ndụ ha dị ka Ndị Kraịst.”
Otu ihe mere o ji esiri ndị mmadụ ike ikweta na mmehie mbụ ahụ metụtara anyị bụ ihe chọọchị dị iche iche kụzirila banyere ya. Dị ka ihe atụ, ná Nzukọ Ndị Isi Chọọchị e nwere na Trent (1545-1563), chọọchị kwuru na ọ bụ arụ mmadụ ikwu na ọ dịghị mkpa ime ụmụ ọhụrụ baptizim iji gbaghara ha mmehie ha. Ndị ọkà mmụta okpukpe kwuru na ọ bụrụ na nwa ọhụrụ anwụọ mgbe a na-emebeghị ya baptizim, mmehie ya a na-asachapụghị ga-egbochi ya ịga n’ihu Chineke n’eluigwe ruo ebighị ebi. Kalvin kụzidịrị na ụmụ ọhụrụ ‘na-ebu amamikpe nke ha apụta n’afọ nne ha.’ O kwusiri ike na mmehie ha dị ukwuu nke na ‘Chineke kpọrọ ha asị ma na-asọ ha oyi.’
Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ chere na aka ụmụ ọhụrụ dị nnọọ ọcha nke na ọ gaghị adị mma mmadụ iche na ụmụ ọhụrụ kwesịrị ịta ahụhụ n’ihi mmehie ha ketara eketa. O sighị ike ịhụ ihe mere ozizi ndị dị otú ahụ chọọchị na-ezi jirila mee ka ndị mmadụ ghara ikweta ozizi mmehie mbụ ahụ. N’ezie, ọ na-esiri ụfọdụ ndị ndú okpukpe ike ikwu na nwa ọhụrụ a na-emeghị baptizim ga-aga ọkụ ala mmụọ. *
Ha chere na ọdịnihu ụmụ ọhụrụ dị otú ahụ ka gbara ndị ọkà mmụta okpukpe gharịị. Ọ bụ ezie na o nweghị mgbe ọ ghọrọ ozizi chọọchị Katọlik, ihe ha kụziri ruo ọtụtụ narị afọ bụ na mkpụrụ obi nke ụmụ ọhụrụ aka ha dị ọcha a na-emeghị baptizim ga-aga n’ebe dị n’agbata eluigwe na ọkụ ala mmụọ, bụ́ Limbo.Ihe ọzọ so mee ka ndị mmadụ kwụsịwa ikwere n’ozizi mmehie mbụ ahụ bụ na ndị ọkà ihe ọmụma, ndị ọkà mmụta sayensị, na ndị ọkà mmụta okpukpe nke narị afọ nke iri na itoolu malitere ikwu na obi esichaghị ha ike na ihe ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme. Ozizi evolushọn Dawịn emeela ka ọtụtụ ndị chezie na akụkọ Adam na Iv bụ akụkọ ifo. Ihe ihe niile a rụpụtara bụ na ọtụtụ ndị ugbu a weere Baịbụl ka ihe si n’echiche na omenala nke ndị dere ya, kama ịbụ ihe si n’aka Chineke.
Olee otú nke a sirila metụta ozizi mmehie mbụ? O doro anya na ọ bụrụ na e mee ka ndị na-aga chọọchị kwere na ọ dịghị mgbe Adam na Iv dịrị ndụ, ha ga-ekwerezi na ọ dịghị mmehie mbụ e mere. Ndị kwetadịrị ekweta na ụmụ mmadụ nwere nsogbu chere na mmehie mbụ ahụ bụ naanị ihe e ji akọwa ihe mere ụmụ mmadụ ji bụrụ ndị na-ezughị okè.
Ka anyị hapụtụgodị okwu banyere mmehie mbụ ahụ. Oleekwanụ maka ozizi bụ́ na mmehie ndị mmadụ na-eme, bụ́ nke dị iche na nke ha ketara eketa, na-akpasukwa Chineke iwe?
Ọ̀ Bụ Mmehie n’Ezie?
Mgbe a jụrụ ọtụtụ ndị banyere mmehie mmadụ nwere ike ime, ihe na-agbata ha n’obi bụ Iwu Iri ahụ—nke megidere igbu mmadụ, ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ, izu ohi, na ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ihe chọọchị na-akụzi kemgbe bụ na onye ọ bụla na-echegharịghị n’ụdị mmehie ndị a nwụọ ga-ata ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. *
Chọọchị Katọlik na-akụzi na ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịga ọkụ ala mmụọ bụ onye ahụ ịga kwupụta mmehie ya n’ihu ụkọchukwu, bụ́ onye ha sịrị nwere ikike ịgbaghara mmehie. Ma, ihe ka ọtụtụ ná ndị Katọlik chere na oge ikwupụta mmehie n’ihu ụkọchukwu, ụkọchukwu ịgbaghara mmehie na mmadụ ịkwa ụta n’ihi mmehie agafeela. Dị ka ihe atụ, nnyocha e mere na nso nso a gosiri na ihe karịrị mmadụ isii n’ime mmadụ iri ọ bụla bụ́ ndị Katọlik n’Ịtali anaghịzi aga nkwupụta mmehie.
O doro anya na ihe chọọchị na-akụzi kemgbe banyere mmehie ndị mmadụ na-eme na ihe ndị ha na-akpata emebeghị ka ndị mmadụ kwụsị ime mmehie. Ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ekwezighị na ihe niile ahụ dị njọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-asị na ọ bụrụ na mmadụ abụọ torola eto ekwekọrịta inwe mmekọahụ, ọ dịkwanụghị onye ọzọ mmekọahụ ahụ mejọrọ, olee ihe ọjọọ dị na ya?
Otu ihe nwere ike ime ka ndị mmadụ na-eche echiche otú a bụ na ndị na-akpa ụdị àgwà ahụ ejighị obi ha dum kwere na ihe a kụziiri ha banyere mmehie bụ eziokwu. N’ezie, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na Chineke nke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ga-ata ndị mmehie ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. O nwekwara ike ịbụ na ụdị obi abụọ a so mee ka o yie ka “mmehie” abụkwaghị oké ihe n’anya ndị mmadụ. Ma, e nwekwara ihe ndị ọzọ so mee ka mmehie ghara ịbụkwa oké ihe n’anya ndị mmadụ.
Ịjụ Ụkpụrụ Ndị A Na-agbasobu
Ihe ndị mere na narị afọ ole na ole gara aga agbanweela nnukwu ihe n’ụwa nakwa n’otú ndị mmadụ si eche echiche. Agha ụwa abụọ, ọtụtụ obere agha ndị ọzọ a lụrụla, na mgbukpọ e gbukpọrọla ndị mmadụ emeela ka ọtụtụ ndị nwewe obi abụọ ma ụkpụrụ ndị mmadụ na-agbaso kemgbe hà bakwara uru. Ha na-ajụ, sị: ‘Ò ziri ezi n’oge a ụwa meperela anya irube isi n’ụkpụrụ ndị a tụrụ ọtụtụ narị afọ gara aga bụ́ ndị oge ha gafecharala?’ Ọtụtụ n’ime ndị kweere na mmadụ kwesịrị iji ọgụgụ isi ya kpebiere onwe ya ihe ọma na ihe ọjọọ na ndị na-amụ banyere ụkpụrụ omume ekwubiela na o zighị ezi. Ha kweere na ndị mmadụ kwesịrị ịhapụ ụfọdụ omume na nkwenkwe ụgha e ji kee ha agbụ ma lekwasị anya n’agụmakwụkwọ iji mepee anya.
Isi otú a eche echiche emekwuola ka ndị mmadụ ghara inwe mmasị n’okpukpe. N’ọtụtụ ala ndị dị na Yurop, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka na-aga chọọchị. Ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ihe ha kweere ekwere na-amụba amụba, ọtụtụ ndị na-ekwukwa n’ihu ọha na ha ekweghị n’ozizi chọọchị, bụ́ ndị ha weere na ha enweghị isi. Ha na-eche na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ si n’ụmụ anụmanụ pụta ma dịgide ndụ n’onwe ha, olee mkpa ọ dị ikwu na mmadụ ga-aza ajụjụ maka ihe ndị o mejọrọ?
Ejighị ụkpụrụ omume ọma kpọrọ ihe ná mba ndị meperela anya na narị afọ nke iri abụọ akpatala ihe ọjọọ dị iche iche, tinyere ara mmekọahụ ịgba ndị mmadụ. Mkpesa ụmụ akwụkwọ, òtù dị iche iche na-agba omenala ụkwụ, na ọgwụ mgbochi afọ ime ndị ụlọ ọgwụ na-
enye socha mee ka ndị mmadụ jụ ụkpụrụ omume ọma ndị dị kemgbe. N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ jụrụ ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl. Ndị mmadụ gbanweziri ihe ha weere dị ka omume ọma, gbanweekwa otú ha si ele mmehie anya. Otu onye edemede kwuru na malite mgbe ahụ gawa “naanị iwu ndị mmadụ maara bụ iwu ịhụnanya,” bụ́ nke ha na-egosikarị site n’ịkwa iko.Okpukpe Ndị Na-agwa Ndị Mmadụ Ihe Ha Chọrọ Ịnụ
Magazin Newsweek kwuru hoo haa banyere ọnọdụ e nwere n’Amerịka, sị: “Ọtụtụ ndị ụkọchukwu ndị chọrọ inwetakwu ndị mmadụ na chọọchị ha chere na ha ekwesịghị ikwu ihe ga-achụrụ ha ndị mmadụ.” Ha na-atụ ụjọ na ọ bụrụ na ha enyekarịa ndị chọọchị ha iwu, ha ga-agba ọsọ. Ndị mmadụ achọghị ịnụ na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi, inwe njide onwe onye, na ime omume ọma ma ọ bụ na ha kwesịrị ige akọ na uche ha na-ama ha ikpe ntị ma chegharịa ná mmehie ha. N’ihi ya, ọtụtụ chọọchị na-akụzi ihe akwụkwọ akụkọ bụ́ Chicago Sun-Times kpọrọ “okwuchukwu ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, ga-egboro ha mkpa ha, na nke ga-emedị ka onwe ha ju ha afọ [ma] hapụ ozi ọma Baịbụl.”
Ihe si n’ụdị echiche a pụta bụ okpukpe nke na-akọwa Chineke otú ọ chọrọ, chọọchị ndị lekwasịrị anya n’ebe ndị mmadụ nọ na ihe ga-eme ka a na-akwanyekwuru ha ùgwù kama ilekwasị anya n’ebe Chineke nọ na ihe ọ chọrọ anyị n’aka. Mkpa ha bụ igboro ndị chọọchị ha mkpa ha. Ihe ọ rụpụtara bụ okpukpe na-enweghị ihe ha kweere. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal jụrụ, sị: “Olee ihe e ji dochie anya ụkpụrụ Ndị Kraịst? Ọ bụ ụkpụrụ nke imere ndị ọzọ ọmịiko, nke bụ́ na ‘ịbụ ezigbo mmadụ’ agwụla ihe dị mkpa.”
Ihe ihe a niile rụpụtara bụ na ndị mmadụ na-echezi na okpukpe ọ bụla nke na-eme ndị mmadụ obi ụtọ dị nnọọ mma. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal kwuru na onye ọ bụla nabatara ụdị echiche a “nwere ike ịbanye okpukpe ọ bụla, ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị atụrụ ya ụdị omume ọ ga na-eme, ma ọ bụrụ na ọ na-agwa ya ihe ga-amasị ya kama ịkatọ ya akatọ.” Chọọchị dị iche iche dịkwanụ njikere iwere ndị mmadụ “kpọmkwem otú ha dị,” n’atụrụghị ha ihe ha ga-eme.
Ihe ndị a e kwurula nwere ike ichetara ndị na-agụ Baịbụl otu amụma Pọl onyeozi dere na narị afọ mbụ Oge Anyị. O kwuru, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị; ha ga-ewepụkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu ahụ.”—2 Timoti 4:3, 4.
Mgbe ndị ndú okpukpe na-ejighị mmehie kpọrọ ihe, na-ekwu na e nweghị ihe bụ́ mmehie ma na-agwa ndị chọọchị ha “ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị” kama ịgwa ha ihe Baịbụl kwuru, ha na-eme ha nnọọ ihe ọjọọ. Ozizi a bụ ozizi ụgha nke dị ize ndụ. O megidere otu n’ime ozizi ndị bụ́ isi nke Ndị Kraịst. Mmehie na mgbaghara mmehie so n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ozi ọma Jizọs na ndịozi ya ziri. Ị chọọ ịhụ otú nke a si bụrụ eziokwu, biko, gụrụ gawa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ikekwe, ihe mere e ji wepụ Limbo na katkizim ndị Katọlik bipụtara na nso nso a bụ mgbagwoju anya ozizi a na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ kpatarala. Gụọ igbe bụ́ “Chọọchị Agbanwee Ozizi Ya,” nke dị na peeji nke 10.
^ par. 14 Baịbụl akwadoghị ozizi ịta ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ya nke ọma, gụọ isi 6, bụ́ “Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara?,” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
Okpukpe ndị na-eme ndị mmadụ obi ụtọ na-amị ajọ mkpụrụ
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ị̀ Sịrị Mmehie? “Anyị Etofeela Ya”
▪ “Okwu a so n’ihe ndị kacha enye chọọchị nsogbu. Anyị anaghịzi ewere onwe anyị dị ka ‘ndị mmehie’ nchegharị dị mkpa. O nwere ike ịbụ na ọ dị mgbe mmehie bụ nsogbu anyị, ma, ugbu a, anyị etofeela ya. N’ihi ya, ka chọọchị na-ekwu na o meriela nsogbu mmehie, ọ bụdịghị nsogbu n’anya ihe ka ọtụtụ ná ndị Amerịka—ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ bụghị oké nsogbu.”—Jọn A. Studebaka, Nke Nta, onye na-ede banyere okpukpe.
▪ “Ndị mmadụ na-asị: ‘M na-atụ anya ime nnọọ ezi omume, na-atụkwa anya ka ndị ọzọ meekwa otú ahụ, ma m maara na anyị niile bụkwanụ mmadụ, n’ihi ya, naanị ihe m na-agbalị ime bụ ihe m ga-emeli.’ Anyị na-eme ezi omume otú ọ na-agaghị enye anyị nsogbu, meruo ya otú anyị chere dị mma. Anyị na-emere ndị agbata obi anyị ihe ọma. Ma, anyị na-eleghara ihe ka mkpa anya bụ́ izere mmehie.”—Albat Mola, onyeisi Ụlọ Akwụkwọ Seminarị Ndị Baptist nke Ebe Ndịda.
▪ “Ndị mmadụ na-ejizi ihe a na-asọbu asọ anya isi [dị ka njọ ogbugbu]: ndị nne na nna na-agba ụmụ ha ume ka ha dị mpako iji mee ka onwe ha ju ha afọ; otu ìgwè ndị osi ite na Frans bụ́ ndị na-afụli onwe ha elu edegarala Vatịkan akwụkwọ iji kwuo na mmadụ iribiga nri ókè abụghị mmehie. Ọ bụ anyaụfụ mere ndị mmadụ ji enwe mmasị n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi. Agụụ ihe ọjọọ aghọọla ihe e ji akpọsa ngwá ahịa; iwe iwe bụzi ihe dị mma onye a kpasuru iwe nwere ike ime. Ọtụtụ ụbọchị, ọ na-agụsi m nnọọ agụụ ike ịdị umengwụ.”—Nansi Gibs, magazin Time.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ọtụtụ ndị taa na-ewere akụkọ Adam na Iv ka akụkọ ifo