Ndị Nkwado—Okwukwe Hà Bụ Ndị Gbachiteere Ozizi Ndị Kraịst Ka Hà Bụ Ndị Na-aga Ịghọ Ndị Ọkà Ihe Ọmụma?
Ndị Nkwado—Okwukwe Hà Bụ Ndị Gbachiteere Ozizi Ndị Kraịst Ka Hà Bụ Ndị Na-aga Ịghọ Ndị Ọkà Ihe Ọmụma?
NA NARỊ afọ nke abụọ O.A. (Oge Anyị), e boro Ndị Kraịst ebubo dị iche iche na-enweghị isi, bụ́ ndị gụnyere na ha na-edina ndị ikwu ha, na-egbu ụmụaka ma na-eri anụ mmadụ. Nke a kpataara nnọọ Ndị Kraịst mkpagbu nke na ndị edemede sị na ha bụ Ndị Kraịst chere na ọ dị mkpa ka ha gbachitere okwukwe ha. Ndị edemede a, bụ́ ndị e mechara kpọwa ndị nkwado okwukwe, ma ọ bụ ndị na-agbachitere ihe ndị ha kweere, malitere ide ihe odide iji gosi na ọ dịghị ihe dị njọ n’okpukpe ha na iji nweta obi ndị ọchịchị Rom na ọha na eze. Ihe ahụ ha chọrọ ime bụ itinye aka ná nsogbu, n’ihi na naanị ihe a na-emekarị iji meta ọha na eze na alaeze ukwu ahụ mma bụ ikwenyere ha. Nke a nwekwara ike ime ka a kpagbukwuo Ndị Kraịst ma ọ bụ mee ka ha gwagbuo ozizi ha site n’ikwenyere ọha na eze. Olee nnọọ otú ndị nkwado okwukwe si gbachitere okwukwe ha? Olee ihe ndị ha kwuru iji gbachitere okwukwe ha? Oleekwa ihe ndị si ná mbọ ha gbara pụta?
Ndị Nkwado Okwukwe na Alaeze Ukwu Rom
Ndị nkwado okwukwe bụ ndị ikom gụrụ akwụkwọ dịrị ndụ malite na narị afọ nke abụọ ruo ná mmalite narị afọ nke atọ. Ndị a kacha mara amara n’ime ha bụ Jọstin Mata, Klement nke Alegzandria, na Tetọlian. * Ndị bụ́ isi ha degaara ihe odide ha bụ ndị na-ekpere arụsị na ndị ọchịchị Rom, ha bukwa n’obi ịkọwara ha ihe Ndị Kraịst kweere, ha denyekwara ọtụtụ ihe e kwuru n’ebe dị iche iche na Baịbụl. Nke ka nke bụ na ndị nkwado okwukwe guzogidere ndị na-akpagbu Ndị Kraịst, gọọ ebubo ndị ha boro ha ma kwuo okwu ọma banyere Ndị Kraịst.
Otu n’ime ihe ndị kacha ndị nkwado okwukwe mkpa bụ ime ka o doo ndị ọchịchị anya na Ndị Kraịst abụghị ndị iro eze ukwu na alaeze ukwu ahụ. Mgbe Tetọlian na-ekwu banyere eze ukwu ahụ, ọ sịrị na “ọ bụ Chineke anyị họpụtara ya,” Atenagoras kwukwara na otú ahụ nwa na-esi anọchi nna ya n’alaeze ukwu ahụ ziri ezi, si otú ahụ tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ahụ. Ihe a ha mere gosiri na ha leghaaJọn 18:36.
ra okwu Jizọs Kraịst anya, bụ́ onye sịrị: “Alaeze m esighị n’ebe a.”—Ndị nkwado okwukwe kwukwara na e kwesịrị inwe ihe jikọrọ Rom na okpukpe Ndị Kraịst. Melito kwuru na òtù abụọ ahụ na-arụkọ ọrụ ọnụ, soro na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’alaeze ukwu ahụ. Onye a na-amaghị aha ya nke dere akwụkwọ bụ́ The Epistle to Diognetus kwuru na Ndị Kraịst dị ka mkpụrụ obi nke ‘jikọrọ ụwa ọnụ.’ Tetọlian dekwara na Ndị Kraịst na-ekpe ekpere ka alaeze ukwu ahụ nwee ọganihu nakwa ka ọgwụgwụ ụwa ghara ịbịa ngwa ngwa. N’ihi ya, ọbịbịa Alaeze Chineke yiziri ihe na-adịchaghị mkpa.—Matiu 6:9, 10.
“Iso Ụzọ Kraịst” Aghọọ Nkà Ihe Ọmụma
Ọkà ihe ọmụma bụ́ Selsọs kwara Ndị Kraịst emo na ha bụ “ndị ọrụ ike, ndị na-arụzi akpụkpọ ụkwụ, ndị ọrụ ugbo, ndị kacha nọrọ n’ìsì na ndị kacha daa iberiibe.” Ịkwa emo a wutere nnọọ ndị nkwado okwukwe. Ha kpebiri iji ụzọ ọzọ nweta obi ọha na eze. Ha jizi amamihe ụwa ha jụburu ajụ mere ngwa ọrụ “Ndị Kraịst.” Dị ka ihe atụ, Klement nke Alegzandria lere nkà ihe ọmụma anya dị ka “ezi nkà mmụta okpukpe.” N’agbanyeghị na Jọstin sịrị na ya ekweghị na nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ, ọ bụ ya bụ onye mbụ ji okwu na echiche nkà ihe ọmụma kọwaa ozizi “Ndị Kraịst,” kwuo na ụdị nkà ihe ọmụma a “dị mma ma baa uru.”
Malite n’oge a gawa, ha emegideghị nkà ihe ọmụma, kama nke ahụ, ha mere ka ihe a sị na ọ bụ echiche Ndị Kraịst ghọọ nkà ihe ọmụma karịrị nke ndị na-ekpere arụsị. Jọstin dere, sị: “N’ihe ụfọdụ, anyị na ndị na-ede abụ na ndị nkà ihe ọmụma bụ́ ndị unu na-akwanyere ùgwù na-akụzi otu ihe, n’ihe ndị ọzọ, ihe anyị na-akụzi na-aka mma ma na-esi n’aka Chineke karịa nke ha.” Mgbe e jirila nkà ihe ọmụma mee ka ozizi a sị na ọ bụ nke Ndị Kraịst maa mma n’anya ndị mmadụ, a malitere ịkụzi na e kwesịrị ịkwanyere ya ùgwù dị ka ozizi dị adị kemgbe. Ndị nkwado okwukwe kwuru na akwụkwọ Ndị Kraịst tọrọ nnọọ akwụkwọ ndị Gris nakwa na ndị amụma Baịbụl dịrị ndụ tupu ndị ọkà ihe ọmụma ndị Gris. Ụfọdụ ndị nkwado okwukwe kwubidịrị na ndị ọkà ihe ọmụma si n’ihe ndị amụma dere dee nke ha. Ha kwudịrị na Pleto bụ onye na-eso ụzọ Mozis!
A Gwagbuo Iso Ụzọ Kraịst
Ihe a ha malitere ime mere ka a gwakọta Iso Ụzọ Kraịst na nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ. E ji chi ndị Gris tụnyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. E ji Pesis tụnyere Jizọs; jirikwa ime Meri tụụrụ tụnyere nke nne Pesis, bụ́ Danai, bụ́ onye a sịrị na ọ bụkwa nwaanyị na-amaghị nwoke.
Jọn 1:1-3, 14-18; Mkpughe 19:11-13) Site nnọọ ná mmalite, Jọstin ji nkà ya dị ka ọkà ihe ọmụma rọgharịa ozizi a, kụgide aka n’ihe abụọ okwu Grik bụ́ logọs nwere ike ịpụta: “okwu” na “echiche.” Ọ sịrị na okwu ahụ Ndị Kraịst natara bụ Kraịst n’onwe ya. Ma, mmadụ niile nwere logọs nke bụ́ echiche n’ime onwe ha, tinyere ndị ọgọ mmụọ. N’ihi ya, o kwubiri na ndị ndụ ha gosiri na ha na-eche echiche nke ọma bụ Ndị Kraịst, ọbụna ndị kwuru na ha ekweghị na Chineke ma ọ bụ ndị e chere na ha ekweghị na Chineke, dị ka Sọkretis na ndị ọzọ.
A gbanwere ihe dị ukwuu n’ozizi ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, na Baịbụl, a kpọrọ Jizọs “Logọs,” nke pụtara “Okwu” Chineke, ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Ya. (Ihe ọzọkwa bụ na mgbe Tetọlian ji nkà ihe ọmụma ndị Gris tụnyere Jizọs, bụ́ onye nwere nnọọ ihe jikọrọ ya na Chineke, ndị nkwado okwukwe, nke gụnyere Tetọlian, malitere ozizi mechara duba Ndị Kraịst n’ozizi Atọ n’Ime Otu. *
Okwu bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara ihe karịrị narị ugboro asatọ na iri ise na Baịbụl, gụnyere ihe karịrị otu narị ugboro n’asụsụ Grik. Isi ihe ọ pụtara bụ ihe na-anwụ anwụ, ihe ndị e kere eke dị ndụ, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:45; Jems 5:20; Mkpughe 16:3) Ma, ndị nkwado okwukwe rọgharịrị ozizi Baịbụl a site n’ịgwakọta ya na ozizi Pleto nke bụ́ na mkpụrụ obi bụ ihe a na-anaghị ahụ anya, na-anaghịkwa anwụ anwụ dị iche n’anụ ahụ́. Minushiọs Filiks kwudịrị na ebe mbụ e si nweta ozizi mbilite n’ọnwụ bụ n’ozizi mkpụrụ obi isi otu ebe gaa ebe ọzọ nke Pitagoras kụziri. Ozizi ndị Gris emeela nnọọ ka ha hapụ ozizi Baịbụl!
Ụzọ Ha Si Mee Ya Ezighị Ezi
Ụfọdụ ndị nkwado okwukwe ghọtara nsogbu nkà ihe ọmụma nwere ike ịkpatara okwukwe Ndị Kraịst. Ma n’agbanyeghị na ha na-akatọ ndị ọkà ihe ọmụma, otú ndị ọkà ihe ọmụma si eji ọgụgụ isi akụzi ihe ka na-amasị ha. Dị ka ihe atụ, Teshan katọrọ ndị ọkà ihe ọmụma na o nweghị uru ha bara, ma n’otu mgbe ahụ, ọ kpọrọ okpukpe Ndị Kraịst “nkà ihe ọmụma anyị” ma kụzie ozizi nkà ihe ọmụma na-edoghị anya. Tetọlian katọrọ otú nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ si emetụta echiche Ndị Kraịst. Ma, o kwuru na ya chọrọ iso nzọụkwụ “Jọstin, bụ́ ọkà ihe ọmụma na onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya; nke Miltayadis, bụ́ ọkà mmụta nke chọọchị,” nakwa nke ndị ọzọ. Atenagoras kpọrọ onwe ya “ọkà ihe ọmụma ndị Atens bụ́ Onye Kraịst.” E kwuru na Klement chere na “nkà ihe ọmụma nwere ike inyere Ndị Kraịst aka inweta amamihe na ịgbachitere okwukwe ha.”
N’agbanyeghị ihe ịga nke ọma ọ ga-abụ na ndị nkwado okwukwe nwere n’ịgbachitere okwukwe ha, ha mere ihe dị oké njọ mgbe ha na-eme nke ahụ. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst na n’ime ihe agha niile ha nwere, ọ dịghị nke dị irè karịa “okwu Chineke,” bụ́ nke “dị ndụ ma na-akpa ike.” Pọl kwuru na ‘anyị na-eji ya akụghasị echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.’—Ndị Hibru 4:12; 2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5; Ndị Efesọs 6:17.
Jọn 16:33) Ọnwụnwa na mkpagbu ndị bịaara ya n’ụwa emebighị okwukwe ya, ha emeghịkwa ka ọ ghara iguzosi ike n’ebe Nna ya nọ. N’otu aka ahụ, onyeozi Jizọs ikpeazụ nwụrụnụ, bụ́ Jọn, dere, sị: “Ọ bụ okwukwe anyị bụ ihe anyị ji merie ụwa.” (1 Jọn 5:4) Ọ bụ ezie na ndị nkwado okwukwe chọrọ ịgbachitere okwukwe Ndị Kraịst, ha mebiri ihe mgbe ha nabatara echiche nkà ihe ọmụma ụwa na otú ha si eme ihe. N’ihi ya, ndị nkwado okwukwe kwere ka nkà ihe ọmụma ụwa dị otú ahụ megharịa ha anya, nke pụtakwara na ha kwere ka ụwa merie ha na ụdị Iso Ụzọ Kraịst ha. N’ihi ya, kama ndị nkwado okwukwe nke chọọchị oge gboo ịbụ ndị na-akwado ma na-agbachitere okwukwe Ndị Kraịst, ha dabara n’ọnyà Setan, ikekwe, n’amaghị ama, n’ihi na Setan “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.”—2 Ndị Kọrịnt 11:14.
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya, sị: “Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Ihe ka ọtụtụ ná ndị ụkọchukwu na ndị ọkà mmụta okpukpe nke oge a na-emekwa otu ihe ahụ. Kama iji Okwu Chineke na-agbachitere ezi Iso Ụzọ Kraịst, ha na-eledakarị Baịbụl anya ma na-akụzi nkà ihe ọmụma ụwa iji nweta obi ọha na eze na òtù dị iche iche. Kama ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere nsogbu dị n’ịgbaso omume ụwa ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ha aghọọla ndị nkụzi na-agbasi mbọ ike ikwu ihe ‘ga-atọ’ ndị na-ege ha ntị “ụtọ ná ntị” ka ha wee nweta ndị òtù. (2 Timoti 4:3) Dị ka ndị nkwado okwukwe oge ochie mere, ọ dị mwute ikwu na ndị nkụzi ndị a na-eleghara ịdọ aka ná ntị a onyeozi Jizọs nyere anya: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” E chetakwaara anyị na “ọgwụgwụ ha ga-abụ dị ka ọrụ ha si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8; 2 Ndị Kọrịnt 11:15.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ndị ọzọ so na ha bụ Kwọdretọs, Aristidis, Teshan, Apolinaris, Atenagoras, Tiofilọs, Melito, Minushiọs Filiks, na ndị edemede ndị ọzọ a na-amachaghị ama. Gụọ Ụlọ Nche May 15, 2003, peeji nke 27-29, na nke March 15, 1996, peeji nke 28-30.
^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị Tetọlian kweere, gụọ Ụlọ Nche May 15, 2002, peeji nke 29-31.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]
“Anyị na-akụghasị echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.”—2 NDỊ KỌRỊNT 10:5
[Foto dị na peeji nke 28]
N’uche Jọstin, iṅomi nkà ihe ọmụma “dị mma ma baa uru”
[Foto dị na peeji nke 29]
Klement lere nkà ihe ọmụma anya ka “ezi nkà mmụta okpukpe”
[Foto dị na peeji nke 29]
Ọ bụ ozizi Tetọlian so tọọ ntọala ozizi Atọ n’Ime Otu
[Foto dị na peeji nke 29]
Teshan kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst “nkà ihe ọmụma anyị”
[Foto dị na peeji nke 30]
Ndị ụkọchukwu na ndị nkà mmụta okpukpe nke oge a na-agbaso ihe nlereanya nke ndị nkwado okwukwe
[Foto dị na peeji nke 31]
Pọl onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị zere nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu nke mmadụ
[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji nke 29]
Klement: Historical Pictures Service; Tetọlian: © Bibliothèque nationale de France