Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Olee Ihe Mere Mmadụ Ga-eji Kwụsị Ebe A?”

“Olee Ihe Mere Mmadụ Ga-eji Kwụsị Ebe A?”

Akwụkwọ Ozi Si Saụt Afrịka

“Olee Ihe Mere Mmadụ Ga-eji Kwụsị Ebe A?”

“EBE A DỊ NJỌ—IZU OHI NA ỊGBA AKWỤNA JURU NA YA.” Ihe a bụ ịdọ aka ná ntị e dere n’otu saịn bọọdụ dị n’akụkụ okporo ụzọ dị warara dị n’ime obodo. Anyị kwụsịrị n’akụkụ okporo ụzọ ahụ bụ́ ebe dị uzuzu uzuzu iji sonyere ụgbọala ole na ole ndị ọzọ nọ na-eche n’okpuru otu nnukwu saịn bọọdụ na-egosi ụzọ e si aga n’ebe ntụrụndụ na ebe a na-agba ọkụ na-eri ego nke dị ma a gatụkwuo n’okporo ụzọ ahụ. Ụgbọala ndị oké ozu nọ na-agbafesị anyị, anyị hụkwara otú ndị nọ n’ime ha si na-ele anyị anya ka ndị ihe juru anya. O yiri nnọọ ka hà na-ekwu n’obi ha, sị: ‘Olee ihe mere mmadụ ga-eji kwụsị ebe a?’

Mgbe ụgbọala anyị kwụsịchara, anyị pụtara ma sonyere ìgwè mmadụ ahụ jikere nke ọma bụ́ ndị guzo n’okpuru saịn bọọdụ ahụ. Ndị so anyị n’ìgwè ahụ si n’agbụrụ na mba dị iche iche, bụ́ ihe a na-anaghị ahụkarị na Saụt Afrịka. Anyị gbara ihe dị ka otu narị kilomita iji rute n’ebe a, bụ́ nke dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Johanisbọg, na-enwe olileanya ịkụziri ndị bi n’obodo nta ndị dị n’ebe a eziokwu Baịbụl.

Anyị nwere obere nzukọ n’akụkụ okporo ụzọ ahụ iji tụlee amaokwu Akwụkwọ Nsọ ma hazichaa otú anyị ga-esi kwusaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. E kpere ekpere, anyị abanyeghachikwa n’ụgbọala anyị. N’ihu ihu, ma a gafee ala dị larịị, anyị hụrụ ọtụtụ ụlọ na bacha ndị a rụrụ aghara aghara. O yiziri ka ụlọ ndị ahụ hà dịcha obere n’ihi nnukwu mkpumkpu ájá ndị e gwupụtara n’ebe ndị a na-egwupụta ihe e ji eme ọla. Ọtụtụ ndị n’obodo a dara ogbenye, n’agbanyeghị nnukwu akụ̀ ime ala a na-egwu na ya.

Mụ na nwunye m na ndị ọbịa abụọ si Jamanị so, ihe mbụ anyị mekwara n’ụtụtụ ahụ bụ ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ebe a enweghị ọrụ, n’ihi ya, ụlọ ndị dị ebe a amachaghị mma. Ọtụtụ n’ime ha bụ bacha ndị na-esighị ike, ndị e kpunyere okwuchi karama a kụsara akụsa na ntu e ji kụọ gbamgbam ha.

Ka anyị na-eru nso n’ụlọ ndị mmadụ, anyị na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá kelee ha, ndị na-apụtakarịkwa bụ ụmụ nwaanyị. Ndị anyị gwara okwu chọrọ nnọọ ịnụ ozi anyị ji bịa, ha mesokwara anyị ka ndị ọbịa pụrụ iche. Anwụ na-acha na gbamgbam ụlọ ndị ahụ na-eme ka ime ụlọ na-ekpo ezigbo ọkụ n’ehihie. A na-edunyekarị ụmụaka ka ha banye n’ime ụlọ bute oche dowe n’okpuru osisi, a na-enyekwa anyị oche n’okpuru osisi.

Ndị ezinụlọ na-ezukọ ma nọrọ ọdụ n’oche ndị a na-akpụchaghị elu ha nke ọma ma ọ bụ na kret mmanya e kpuru ihu n’ala. A na-akpọdị ụmụaka ji ihe ndị ha rụpụtara n’onwe ha egwuri egwu òkù ka ha bịa gee ntị. Anyị na-agụrụ ha amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ma gwa ụmụaka ndị nke torurula ịga akwụkwọ ka ha gụpụta ihe e dere n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anyị ji bịa. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na onye ọ bụla anyị hụrụ nwere obi ụtọ ịnata akwụkwọ anyị, ọtụtụ gwakwara anyị ka anyị bịa ọzọ.

N’ehihie, anyị kwụsịtụrụ taa achịcha e tinyere ihe n’ime ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ juru oyi tupu anyị agaghachi na nke ndị anyị gaburu n’ụlọ ha. Ebe mbụ anyị gara bụ n’ụlọ Jimi, bụ́ onye si Malawi nke na-arụ ọrụ n’otu n’ime ebe ndị ahụ a na-egwupụta ihe e ji eme ọla. O ruola ọnwa ole na ole anyị gawara n’ụlọ Jimi. Obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ hụrụ anyị, anyị na ya ekwurịtakwala banyere Baịbụl ọtụtụ ugboro. Jimi lụrụ nwaanyị obodo a bụ́ onye Setswana, ha amụtakwala ọmarịcha ụmụ abụọ. Ọ nọghị n’ụlọ mgbe ikpeazụ anyị bịara na nke ya, n’ihi ya, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịmara otú o mere.

Ka anyị kwọ ụgbọala na-abata n’ụlọ Jimi nke na-amachaghị mma, anyị chọpụtara ozugbo na nsogbu dị. Ubi ya mara mma eruola ahịhịa, ọka ndị ọ kụrụ akpọnwụchaala, anyị ahụkwanụghị ọkụkọ ya ndị na-akpa nri n’ala ebe ahụ. E ji nnukwu agbụ ígwè gbachie ọnụ ụzọ ya. Otu onye agbata obi ya pụtara ịhụ ihe na-emenụ. Anyị jụrụ ya ma ọ̀ ma ebe Jimi nọ. Ya akọọrọ anyị akụkọ a na-awụ akpata oyi: Jimi anwụọla, nwunye ya akpọrọkwala ụmụ ya laa n’ụlọ nna ya.

A na-ele ịjụ ajụjụ ihe gburu mmadụ anya ọjọọ, ma anyị jụrụ ya ihe gburu ya. Ọ gwara anyị, sị: “Ọ rịara ọrịa, nwụọ. E nwerenụ ọtụtụ ọrịa n’oge a. Ọtụtụ ndị na-anwụ.” Ọ bụ ezie na o nweghị ọrịa ọ kpọrọ aha, ebe ọ bụ na a naghị ekwukarị ihe gburu mmadụ ebe a, n’agbanyeghị na ọtụtụ ili ọhụrụ ndị a na-egwu n’ebe a na-eli ozu n’obodo ahụ na-egosi nnọọ na ihe nwaanyị ahụ kwuru bụ eziokwu. Anyị gwatụrụ ya banyere olileanya mbilite n’ọnwụ, anyị jizi oké mwute gawa ebe ọzọ.

Anyị banyere n’obodo nta ọzọ ma kwọrọ ụgbọala anyị ruo n’ebe ụlọ ndị ikpeazụ e nwere n’ebe ahụ dị, bụ́ ebe mkpumkpu ájá dị elu e gwupụtara n’ebe a na-egwu ihe e ji eme ọla dị. Anyị banyere n’otu obere ụzọ dị n’ebe okporo ụzọ ahụ jedebere. E ji ágbá dee n’otu okwute dị n’ubi dị n’ebe ahụ, sị, “Emeghị mkpebi ngwa ngwa bụ igbu oge; mmadụ iyigharị ihe ọ chọrọ ime bụkwa igbu oge.” Devid, * bụ́ onye dere ihe ahụ, si n’ebe ọ nọ na-arụ ọrụ ná njin ụgbọala Vọkswejin ochie ya welite isi. O mechilatara anya ya n’ihi anwụ na-acha ya n’ihu ma mụmụọ nnọọ ọnụ ọchị mgbe ọ matara na ọ bụ anyị, ọlaedo o ji chọọ ezé ya mma nọkwa na-egbuke. O hichara aka ya ma bịa kelee anyị.

O kwuru, sị: “Ndeewonụ, ndị enyi m. Olee ebe unu nọ kemgbe?” Obi dị anyị ụtọ ịhụ Devid ọzọ. Ọ sịrị anyị ewela iwe na anyị na ya agaghị anọ ogologo oge taa n’ihi na ọ chọtala ọrụ kemgbe ikpeazụ anyị bịachara na nke ya, ọ ga-agakwa ọrụ n’oge na-adịghị anya. N’oge niile anyị na Devid ji ịnụ ọkụ n’obi kwurịta okwu, ọ nọgidere na-achị ọchị. O ji obi ụtọ kwuo, sị: “Ụbọchị mbụ ahụ unu gwara m okwu gbanwere ndụ m! Ịgwa unu eziokwu, amaghị m ebe m gaara anọ taa ma a sị na unu abịaghị na nke m n’ụbọchị ahụ.”

Anyị ji obi ụtọ hapụ Devid. Ka chi jiwere, anyị banyere n’ụgbọala anyị lawa. Ka anyị lere ala ahụ dị larịị anya ikpeazụ, uzuzu emeekwa ka anyị ghara ịhụcha ụzọ ebe chi jiwerela, anyị nọ na-eche otú a ga-esi zie ndị a niile ozi ọma. Anyị hụrụ nnọọ na ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu: “N’ezie, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.”—Luk 10:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 17]

Ikike a natara Ụlọ Ọrụ Na-ezipụ Akwụkwọ Ozi nke Saụt Afrịka