Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Ọ̀ bụ eziokwu na ndanda na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị, na-achịkọtakwa ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi?
▪ Ilu 6:6-8 kwuru, sị: “Gakwuru ndanda, gị onye umengwụ; hụ ụzọ ya wee mara ihe. Ọ bụ ezie na o nweghị ọchịagha, onyeisi ma ọ bụ onye na-achị achị, ọ na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị; ọ chịkọtawo ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi.”
N’ezie, ụdị ndanda ụfọdụ na-akwakọba ihe oriri. O nwere ike ịbụ na ụdị ndanda Sọlọmọn kwuru banyere ya, bụ́ ụdị kacha dịrị n’Izrel taa, bụ ndanda na-achịkọta ihe oriri (Messor semirufus).
Otu akwụkwọ kwuru na “ndanda ndị a dị uchu ndị na-achịkọta ihe oriri na-ahapụ ọnụ ha n’oge okpomọkụ ịga chọọ ihe oriri . . . [ma] jiri oge okpomọkụ niile n’afọ chịkọta mkpụrụ akụ́kụ́.” Ha nwere ike ịghọrọ mkpụrụ osisi dị iche iche ma ọ bụ buru ndị dara n’ala. Ndanda ndị ahụ na-atụ ọnụ n’ime ala n’ebe dị nso n’ubi, ebe a na-akwakọba mkpụrụ akụ́kụ́, ma ọ bụ n’ebe a na-azọcha ọka, bụ́ ebe ha nwere ike ịhụ mkpụrụ akụ́kụ́ dị iche iche.
N’ime ọnụ ha, ndanda ndị ahụ na-edokọta ihe oriri n’oghere dị iche iche ndị nwere ụzọ ndị jikọtara ha. Ebe ndị ha na-akwakọba ihe oriri nwere ike ịdị sentimita iri na abụọ n’obosara ma dị otu sentimita n’ịdị elu. N’ihi ya, e kwuru na ìgwè ndanda ndị na-enweta ihe oriri na-ezuru ha nwere ike ịdịgide ndụ “ruo ihe karịrị ọnwa anọ n’enwetaghị ihe oriri ma ọ bụ mmiri n’èzí.”
Olee ihe dị n’ịbụ obu ihe ọṅụṅụ eze?
▪ Nehemaya bụ obu ihe ọṅụṅụ nke Eze Atazaksis nke Peshia. (Nehemaya 1:11) N’obí eze ndị e nwere n’oge ochie n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, obu ihe ọṅụṅụ eze anaghị abụ odibo nkịtị. Kama nke ahụ, ọ na-abụ onye nọ n’ọkwá dị elu. Ihe odide oge ochie na ọtụtụ ihe osise oge ochie nke ndị obu ihe ọṅụṅụ na-enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ banyere ọrụ Nehemaya n’obí eze Peshia.
Obu ihe ọṅụṅụ na-ebu ụzọ aṅụtụ mmanya eze iji hụ na e nyeghị eze nsí. N’ihi ya, obu ihe ọṅụṅụ bụ onye eze tụkwasịrị nnọọ obi. Ọkà mmụta bụ́ Edwin M. Yamauchi kwuru, sị: “Mgba okpuru a na-agbakarị n’obí ndị eze Peshia mere ka ọ dị oké mkpa inwe ndị a tụkwasịrị obi na-eje ozi n’obí eze.” Ọ ga-abụ na obu ihe ọṅụṅụ bụkwa onye ukwu eze hụrụ n’anya, onye na-atụrụ eze aro ihe ọ na-eme. Otú o si anọ eze nso kwa ụbọchị nwere ike ime ka ọ na-ekpebi onye ga-ahụ eze na onye na-agaghị ahụ ya.
O nwere ike ịbụ ọkwá Nehemaya so mee ka o nwee ike inweta ikike ịlaghachi Jeruselem ịga wughachi mgbidi ya. Ọ ghaghị ịbụ na eze ji Nehemaya kpọrọ nnọọ ihe. The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “Naanị ihe eze zara ya bụ, ‘Olee mgbe ị ga-alọta.’”—Nehemaya 2:1-6.
[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 9]
Ihe a tụrụ atụ si n’obí eze dị na Pesepọlis
[Ihe Osise]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Obu ihe ọṅụṅụ
Ọkpara Eze Bụ́ Zaksis
Darayọs Onye Ukwu
[Ebe E Si Nweta Foto]
© The Bridgeman Art Library International