Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ

A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ

A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ

JIZỌS KRAỊST buru amụma na otu ụbọchị n’ọdịnihu, ‘ọgwụgwụ ga-abịa.’ Mgbe ọ na-akọwa oge ahụ, o kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.”—Matiu 24:14, 21.

Ihe ahụ Jizọs kwuru banyere ọgwụgwụ na ihe amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru banyere ya na-akpata ọtụtụ ajụjụ dị mkpa. Ọ́ gaghị adị mma ka i mepee Baịbụl gị ma gụọ otú o si zaa ajụjụ ndị ahụ?

1 Gịnị Ga-agwụ?

Baịbụl anaghị akụzi na a ga-ebibi ụwa nkịtị. Otu ọbụ abụ dere, sị: “[Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Baịbụl akụzikwanụghị na a ga-agba ihe niile dị ndụ n’ụwa ọkụ. (Aịzaya 45:18) Jizọs n’onwe ya kwuru ihe gosiri na ụfọdụ ndị ga-alanahụ ọgwụgwụ ahụ. (Matiu 24:21, 22) Oleezi ihe Baịbụl kwuru ga-agwụ?

Ọchịchị ọjọọ ụmụ mmadụ ga-agwụ. Chineke nyere Daniel onye amụma ike mmụọ nsọ ide, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Agha na mmetọ ụwa ga-agwụ. Mgbe Abụ Ọma 46:9 na-akọwa ihe Chineke ga-eme, o kwuru, sị: “Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.” Baịbụl na-akụzikwa na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.

Mpụ na ikpe na-ezighị ezi ga-agwụ. Okwu Chineke kwere nkwa, sị: “Ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya. Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.” *Ilu 2:21, 22.

2 Olee Mgbe Ọgwụgwụ Ga-abịa?

Jehova Chineke ewepụtala ‘oge a kara aka’ iji kwụsị ajọ omume ma weta ọchịchị Alaeze ya. (Mak 13:33) Ma Baịbụl mere ka o doo anya na anyị agaghị agbakọtali ụbọchị ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Matiu 24:36) Ma, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya buru amụma otú ọnọdụ ụwa ga-adị obere oge tupu Chineke eweta ọgwụgwụ ahụ. Mgbe ihe niile anyị na-aga ikwu banyere ha mewere n’otu mgbe n’ụwa niile, ọ pụtara na ọgwụgwụ ahụ adịla nso.

Nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ebe obibi na nke dị n’etiti ụmụ mmadụ na ibe ha na-akawanye njọ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Mgbe Jizọs na-aza ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya banyere ọgwụgwụ, o kwuru, sị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha, a ga-enwe ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche, a ga-enwe ụkọ nri. Ihe ndị a bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” (Mak 13:8) Pọl onyeozi dere, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya; zere ndị dị otú a.”—2 Timoti 3:1-5.

A na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile nakwa n’asụsụ dị iche iche. Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

3 Gịnị Ga-eme Mgbe Ọgwụgwụ Gasịrị?

Baịbụl anaghị akụzi na a ga-esi n’ụwa kpọrọ ndị ezi omume niile ibi ndụ obi ụtọ n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. Kama nke ahụ, Jizọs kụziri na a ga-emezu nzube mbụ nke Chineke. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5; 6:9, 10) Baịbụl kwere nkwa na a ga-akpọlite ndị nwụrụ tupu ọgwụgwụ ahụ abịa n’ọnwụ n’ọdịnihu. (Job 14:14, 15; Jọn 5:28, 29) Gịnị ga-eme mgbe ọgwụgwụ ahụ gasịrị?

Jizọs ga-esi n’eluigwe chịa dị ka Eze nke Alaeze Chineke. Daniel onye amụma dere, sị: “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ m hụrụ n’abalị, ma, lee! onye yiri nwa nke mmadụ [Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ] nọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe; ọ banyere n’ebe Onye Ochie ahụ [Jehova Chineke] nọ, ha wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ. E wee nye ya [Jizọs] ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.”—Daniel 7:13, 14; Luk 1:31, 32; Jọn 3:13-16.

Ndị Alaeze Chineke na-achị ga-enwe ahụ́ ike zuru okè, udo na-adịgide adịgide, na ndụ ebighị ebi. Aịzaya onye amụma dere, sị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya.” (Aịzaya 65:21-23) Jọn onyeozi dere banyere oge ahụ, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

4 Gịnị Ka Ị Na-aghaghị Ime Iji Lanahụ Ọgwụgwụ Ahụ?

Pita onyeozi kwetara na ụfọdụ ndị ga-ebi n’oge ọgwụgwụ ga-akwa ndị na-asị na Chineke ga-etinye aka n’ihe ụmụ mmadụ na-eme ma kwụsị ajọ omume n’ụwa emo. (2 Pita 3:3, 4) N’agbanyeghị nke ahụ, Pita gbara ndị bi n’oge anyị ume ime ihe na-esonụ.

Mụta ihe n’ihe ndị merela eme. Pita dere na Chineke “[ahapụghị] inye ụwa oge ochie ahụhụ, kama o chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ, mgbe o ji iju mmiri bibie ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:5) Pita kwuru banyere ndị ahụ na-akwa emo, sị: “Dị ka ha si chọọ, ha na-echezọ eziokwu a, na e nwere eluigwe nke dị site n’oge ochie na ala kpụkọrọ ọnụ nke si na mmiri pụta ma guzoro n’etiti mmiri site n’okwu Chineke; e jikwa ihe ndị ahụ bibie ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya. Ma site n’otu okwu ahụ, eluigwe na ụwa * dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:5-7.

Na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume Chineke. Pita dere na ndị chọrọ ịlanahụ ọgwụgwụ ahụ ga na-akpa “àgwà dị nsọ,” na-emekwa “omume nsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:11) Ị̀ hụrụ na Pita kwusiri okwu ike banyere “àgwà dị nsọ” na “omume nsọpụrụ Chineke”? N’ihi ya, a chọrọ ihe karịrị mmadụ ikwu n’elu ọnụ na ya nwere okwukwe ma ọ bụ ịgba mbọ ime uche Chineke mgbe oge gaferela.

Olee kpọmkwem àgwà na omume ndị na-adị Chineke mma? Ọ́ gaghị adị mma ka i jiri ihe ị maara banyere nke a tụnyere ihe Baịbụl na-akụzi? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka. Gwa ha ka ha gosi gị na Baịbụl gị ebe ha si nweta ihe ha zara gị. Ime otú ahụ nwere nnọọ ike inyere gị aka ịghara ịtụ ụjọ ihe ọdịnihu ga-eweta, n’agbanyeghị ihe ndị na-emenye ụjọ gbara anyị gburugburu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mmadụ Niile Hà Nwere Ohere Ha Nhata Ịmata Chineke?” nke dị na peeji nke 22 nke magazin a.

^ par. 19 Ụwa Pita na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụwa ihe atụ. Onye so dee Baịbụl bụ́ Mozis kwukwara okwu banyere ụwa ihe atụ. O dere, sị: “Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ.” (Jenesis 11:1) Otú ahụ ụwa nkịtị na-anaghị asụ “otu asụsụ,” ọ bụghị ụwa nkịtị ka a ga-ebibi. Kama nke ahụ, dị ka Pita kwuru, ọ bụ ndị ajọ omume ka a ga-ebibi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Ụwa agaghị agwụ, ma ndị na-ebibi ya ga-agwụ