Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Zigara Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ ‘Ime Ndị Na-eso Ụzọ’

E Zigara Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ ‘Ime Ndị Na-eso Ụzọ’

Ememme Ngụsị Akwụkwọ nke Klas nke 128 nke Gilied

E Zigara Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ ‘Ime Ndị Na-eso Ụzọ’

“IJI mee ka ndị mba niile nụrụ ozi ọma, ụfọdụ Ndị Kraịst aghaghị ịdị njikere ịhapụ ezinụlọ na ụlọ ha iji gaa kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ.” David Splane, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ji okwu ndị ahụ malite otu ememme ime mmụọ na-enye obi ụtọ.

Na Mach 13, 2010, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku mmadụ asatọ gbakọtara maka ememme ngụsị akwụkwọ nke klas nke 128 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ndị ikwu na ibe na ndị ọbịa si mba iri abụọ na asaa bịara ememme ahụ.

“Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Anọrọghị Nnọọ n’Ụlọ”

Nwanna Splane, bụ́ onyeisi oche nke ememme ahụ, malitere ememme ahụ site n’ịtụle iwu Jizọs bụ́: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19, 20) O mere ka o doo anya na Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gakwuru ndị mmadụ. N’ezie, na Pentikọst 33 O.A., ndị si Mesopotemia, Ebe Ugwu Afrịka, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ Alaeze Ukwu Rom na-achị bịara na Jeruselem ịnụrụ ozi ọma. Ọkà okwu ahụ kwuru na n’agbanyeghị nke ahụ, “ndị na-eso ụzọ Jizọs anọrọghị nnọọ n’ụlọ chere ka ndị si ná mba niile bịakwute ha. Ha gara n’ebe kasị anya n’ụwa iji chọta ndị mmadụ.”—Ọrụ 1:8.

Nwanna Splane kwuru, sị: “Naanị ihe Jizọs mere abụghị ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-eme. Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi mee ya. Ọ gwaghị ha naanị ka ha kpee ekpere; ọ kụziiri ha otú e si ekpe ekpere. Ọ gwaghị ha naanị ka ha kwusaa ozi ọma; o gosiri ha otú e si ekwusa ozi ọma. Ọ gwaghị ha naanị ka ha bụrụ ezi ndị nkụzi; o gosiri ha ụzọ dị mma ma dị irè e si akụzi ihe.”

N’okwu onyeisi oche ahụ gwara ndị mụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ, o kwughachiri okwu a Jizọs ji mesie ndị na-eso ụzọ ya obi ike: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Matiu 28:20) Nwanna Splane mesiri ndị na-ege ntị obi ike na Jizọs ga-anọgide na-elekọta ụmụ akwụkwọ ahụ n’ebe e kenyere ha ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ.

“Nyawanụ Isi”

Anthony Morris, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, gbara ndị klas ahụ ume ka ha ‘nyawa isi.’ O kwuru na e nwere ụdị ịnya isi dị mma na ụdị na-adịghị mma. Ụdị ịnya isi na-adịghị mma bụ mmadụ ito onwe ya. A kọwara ụdị ịnya isi dị mma ná 1 Ndị Kọrịnt 1:31: “Onye na-anya isi, ya jiri Jehova nyaa isi.” Nwanna Morris kwuru, sị: “Nke ahụ bụ ihe mmadụ kwesịrị iji nyaa isi—inwe nghọta na ihe ọmụma banyere Jehova Chineke. N’ezie, ihe ùgwù kacha ukwuu mụ na gị nwere bụ ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha nsọ ahụ, iso ná Ndịàmà Jehova.”—Jeremaya 9:24.

Ọkà okwu ahụ meziri ka mkpa ọ dị ime ka a mara aha Jehova doo anya site n’ịkọ otu ihe mere onye e zigara Afrịka ikwusa ozi ọma. Onye ahụ na nwunye ya nọ na-aga n’ebe ha ga-ekwu okwu dabeere na Baịbụl. N’otu ebe ndị soja na-eche nche, otu nwa okorobịa onye soja tụgidere nwanna nwoke ahụ égbè ma jụọ ya onye ọ bụ. Nwunye ya chetara ọzụzụ e nyere ha na Gilied ma gbanyere ya izu, sị, “Gwa ya na ị bụ Onyeàmà Jehova nakwa na ị na-aga ebe ị ga-ekwu okwu dabeere na Baịbụl.” O mere ihe ahụ nwunye ya gwara ya, a hapụkwara ha ka ha gafere. N’echi ya, di na nwunye ahụ nụrụ na redio na onyeisi ala gwara ndị soja ya ka ha lezie anya maka ndị mgbagbu na-akpọ onwe ha ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ! Di na nwunye ahụ zeere nnukwu nsogbu site n’ịkpọ onwe ha Ndịàmà Jehova kama ikwu na ha bụ ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ. Nwanna Morris mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Mgbe unu ruru n’ebe e kenyere unu ọrụ, nyawanụ isi. Nyaanụ isi n’ihi ihe niile Jehova ga-arụzu ka o ji unu na-arụ ọrụ maka otuto ebighị ebi ya.”

“Ùnu Ga-ejezu Ozi Unu?”

Geoffrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke na-ekwusabu ozi ọma n’ala ọzọ, nyeere ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụcha akwụkwọ aka ichebara ajụjụ a dị n’elu echiche. Ọ jụrụ, sị, “Olee ihe anyị bu n’obi mgbe anyị kwuru na mmadụ bụ onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ?” Ọ kọwara na ebe e si nweta okwu Bekee a sụgharịrị “onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ” bụ okwu Latịn nke pụtara onye ma ọ bụ ìgwè e nyere ọrụ pụrụ iche. Ọrụ anyị dị ka Ndịàmà Jehova bụ ikwusa ozi ọma na inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ. Anyị na-arụ ọrụ a iji ṅomie Jizọs Kraịst, bụ́ onye lekwasịrị anya n’ozi ọ bịara ije n’ụwa. Jizọs gwara onye ọchịchị Rom, bụ́ Pọntiọs Paịlet, sị: “Ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.”—Jọn 18:37.

Ọkà okwu ahụ nyeere ndị klas ahụ aka iche echiche banyere ihe a kọrọ na Baịbụl banyere agha Jeriko. Ruo ụbọchị isii, ndị agha Izrel na-ebili n’isi ụtụtụ, kee ekike agha ha, ma gaa Jeriko gburugburu, laghachizie n’ụlọ ha. Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “N’anya mmadụ, ozi ha yiri ozi iberiibe na ihe na-enweghị isi.” O kwuru na ụfọdụ ndị agha nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ihe a bụ nnọọ igbu oge.’ Ma, n’ụbọchị nke asaa, a gwara ndị Izrel ka ha gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa, tizie oké mkpu agha. Olee ihe si na ya pụta? Mgbidi Jeriko daruru ala!—Jọshụa 6:13-15, 20.

Nwanna Jackson kọwara ihe anọ anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Jeriko ahụ. (1) Nrubeisi dị ezigbo mkpa. Anyị kwesịrị ime ihe otú Jehova si chọọ, n’echeghị na ụzọ nke anyị ka mma. (2) Inwe okwukwe na Jehova na ịtụkwasị ya obi dị ezigbo mkpa. “Ọ bụ okwukwe ka e ji mee ka mgbidi Jeriko daa,” ọ bụghị ihe e ji akwatu mgbidi. (Ndị Hibru 11:30) (3) Anyị aghaghị inwe ndidi. Mgbe oge ya ruru, ngọzi Jehova ‘ga-achukwute unu.’ (Diuterọnọmi 28:2) (4) Ike agwụla unu. Ya adịla mgbe unu ga-echefu ozi unu. Nwanna Jackson mechiri okwu ya site n’ikwu, sị, “Ọ bụrụ na unu eburu ihe ndị a n’uche, unu ga-ejezu ozi unu ma wetara Jehova otuto.”

Isi Ihe Ndị Ọzọ E Mere n’Ememme Ahụ

“Hụnụ Baịbụl na Onye Chepụtara Ya n’Anya.” Nke ahụ bụ isiokwu nke okwu Maxwell Lloyd, bụ́ onye so na Kọmitii Alaka Amerịka. Ọ gwara klas ahụ, sị, “Baịbụl kwesịrị ịbụ akwụkwọ dị irè nye unu.” O nyeziri ha agbamume a: Ya adịla mgbe ịhụnanya unu nwere n’ebe Jehova Chineke nọ ga-ajụ oyi. Unu echela na mmadụ niile na-aghọta ihe unu na-akụziri ha. Mụtanụ ime ka eziokwu Baịbụl dị mfe nghọta iji mee ka ihe unu na-akụziri ndị unu na-amụrụ ihe ruo ha n’obi. Dịnụ umeala n’obi. Unu emela ka ha chee na unu ka ha ihe ama. Na-ejinụ ihe nlereanya unu akụziri ha ihe. Ka ndị unu na-amụrụ ihe hụ na unu hụrụ nnọọ Baịbụl n’anya.

“Rịbanụ Ugoloọma Ama nke Ọma.” Michael Burnett, bụ́ onye nkụzi klas ahụ nke na-ekwusabu ozi ọma n’ala ọzọ, kwuru okwu n’isiokwu ahụ. O kwuru na anyị ga-enwe nchekasị mgbe ụfọdụ. Ma chetanụ ndụmọdụ a Jizọs nyere: “Rịbanụ ama nke ọma na ugoloọma adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, . . . ma Chineke na-enye ha nri.” (Luk 12:24) N’ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, ugoloọma adịghị ọcha, e kwesịghịkwa iri ha eri. A ga na-asọ ha oyi. (Levitikọs 11:13, 15) N’agbanyeghị otú e si ele ha anya, Chineke na-enye ha nri. Nwanna Burnett kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na o nwee mgbe unu nwere oké nchekasị, chetanụ ugoloọma. Ọ bụrụ na Chineke na-elekọta nnụnụ na-adịghị ọcha nke a na-asọ oyi, ọ́ gaghị nnọọ elekọta unu karị bụ́ ndị dị ọcha n’anya ya.”

“Ọ Dịghị Ihe Ọjọọ M Mere Gị.” Mark Noumair, bụ́ onye ọzọ bụ́ onye nkụzi Gilied, nyeere ndị niile bịara ememme ahụ aka ịtụle ihe atụ Jizọs nyere banyere ndị ọrụ ubi vaịn. Ụfọdụ ndị ọrụ rụrụ ọrụ malite n’ụtụtụ ruo n’anyasị. Ndị ọzọ arụọ naanị otu awa. N’agbanyeghị nke ahụ, a kwụrụ ha niile otu ụgwọ! Ndị ahụ rụrụ ọrụ ogologo oge karị tamuwere ntamu. Onye nwe ubi vaịn ahụ gwara otu n’ime ndị ahụ na-atamu ntamu, sị: “Ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. I kwere na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs, ka ọ̀ bụ na i kweghị? Nara ihe bụ́ nke gị lawa.” (Matiu 20:13, 14) Olee ihe anyị na-amụta na ya? Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Nwanna Noumair kwuru, sị: “Naanị ihe iji onwe gị atụnyere ndị ọzọ n’ụzọ na-ezighị ezi ga-eme bụ ịnapụ gị ọṅụ. Nke ka njọ bụ na o nwere ike ime ka ị hapụ ọrụ e kenyere gị, si otú ahụ tụfuo ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa.” Ọkà okwu ahụ chetaara klas ahụ na ọ bụ Jizọs na-eduzi owuwe ihe ubi ime mmụọ a na-ewe n’oge anyị a nakwa na o nwere ike iji ndị na-eso ụzọ ya mee ihe otú masịrị ya. Ọ bụrụ na Jehova na Jizọs ekpebie imere ndị ọzọ ihe karịa unu, ha emeghị unu ihe ọjọọ. Lekwasịnụ anya n’ihe bụ́ nke unu, unu ekwekwala ka “ụgwọ ọrụ” ndị ọzọ dọpụ uche unu n’ọrụ Jehova nyere unu ịrụ.

Ahụmahụ na Ajụjụ Ọnụ

Mgbe ụmụ akwụkwọ Gilied na-anọghị na klas ma ọ bụ na-eme ihe omume e kenyere ha ime n’ụlọ, ha na-eso ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ ekwusa ozi ọma. Sam Roberson, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi Gilied, gbara ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ajụjụ ọnụ banyere ihe ndị ha hụrụ n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, Nwanna Nwaanyị Alessandra Kirchler zutere otu nwaanyị bụ́ onye na-echegbu onwe ya banyere sịga nwa ya nwoke na-aṅụ. Alessandra mechara jiri isiokwu Teta! kwuru banyere ịṅụ sịga laghachi. Ọ dịghị onye nọ n’ụlọ, ma ọ hapụrụ isiokwu ahụ. Mgbe e mechara, Alessandra hụrụ nwaanyị ahụ n’ụlọ, nwaanyị ahụ akpọbatakwa ya ụlọ. Isiokwu ahụ tọrọ nwaanyị ahụ ụtọ, ya asịkwa, “Echeela m mgbe mgbe ihe Chineke chọrọ iji nsogbu niile ọ na-eme ka m nwee kụziere m.” Alessandra gosiri ya na Baịbụl na Chineke anaghị akpatara anyị ihe ọjọọ. (Jems 1:13) Ma nwaanyị ahụ ma nwa ya nwoke na-amụ Baịbụl ugbu a.

Melvin Jones bụ́ onye na-arụ ná Ngalaba Ije Ozi gbara mmadụ atọ bụ́bu ụmụ akwụkwọ Gilied ajụjụ ọnụ: Jon Sommerud, onye na-eje ozi n’Albenia; Mark Anderson, onye na-eje ozi na Kenya; na James Hinderer, onye na-arụ ná Ngalaba Ụlọ Akwụkwọ Ọchịchị Chineke. Ha atọ kwekọrịtara na ihe Gilied na-akụziri ụmụ akwụkwọ abụghị naanị eziokwu ndị bụ́ isi dị na Baịbụl, kamakwa na ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-etinye eziokwu ndị ahụ n’ọrụ ná ndụ ha, n’agbanyeghị ndị ụmụ akwụkwọ ahụ bụ ma ọ bụ ebe ha na-eje ozi.

Otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ gụziri akwụkwọ ozi na-emetụ n’ahụ́ klas ahụ ji gosi obi ụtọ ha nwere. John Barr, onye dị afọ iri itoolu na isii, bụ́ onye tọcharanụ ná ndị Òtù Na-achị Isi, ji ekpere mechie ihe omume ahụ, rịọ Jehova ka ọ gọzie ọrụ nke klas nke 128 nke Gilied.

[Chaatị/​Map dị na peeji nke 31]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

8 mba ole ha si

54 ole ụmụ akwụkwọ dị

27 mmadụ ole bụ́ di na nwunye

35.2 nkezi afọ ndụ ha

19.1 nkezi afọ ole ha nọrọla kemgbe e mere ha baptizim

13.8 nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile

[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E kenyere ndị klas ahụ ọrụ ná mba 25 e dere n’okpuru ebe a:

EBE NDỊ E ZIGARA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’ALA ỌZỌ

ALBENIA

ARUBA

BOLIVIA

KAMBODIA

KOT DIVUA

DOMINIKAN RIPỌBLIK

EKWEDỌỌ

GANA

GUWATEMALA

GINI

GAYANA

HỌNDURAS

INDONISHA

SEBIA

LATVIA

LAỊBERỊA

MADAGASKA

MONGOLỊA

NAMIBIA

NIKARAGUA

PARAGỤWAỊ

ROMENỊA

ROWANDA

KOSOVO

TAỊWAN

(EBE NDỊ E KENYERE HA ỌRỤ ALAKA ỤLỌ ỌRỤ ỌSTRELIA NA-ELEKỌTA)

[Foto dị na peeji nke 30]

Ebe ụmụ akwụkwọ Gilied na-eme ihe ngosi nke otu n’ime ihe ndị ha hụrụ n’ozi

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Klas nke 128 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied

E nyere ahịrị ndị dị na foto a nọmba malite n’ihu laa azụ, aha ha malitekwara n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Keller, E.; Ostopowich, I.; Jacobsen, S.; Arias, M.; Dieckmann, Y.; Tanaka, J.; Harada, K.

(2) Camacho, L.; Kirchler, A.; Rodríguez, S.; Ward, B.; Trenalone, K.; Victoria, V.; Oxley, F.; Nguyen, K.

(3) Oxley, O.; De Dios, A.; Lindström, C.; Allen, J.; Meads, T.; Waddington, J.; Victoria, E.

(4) Harada, H.; Lindström, A.; Orsini, E.; Logue, D.; Missud, T.; Bergeron, S.; Camacho, G.; Ward, T.

(5) Kirchler, W.; Nguyen, H.; Kremer, E.; Burgaud, C.; Titmas, N.; De Dios, C.; Rodríguez, A.; Waddington, M.

(6) Dieckmann, J.; Allen, C.; Titmas, R.; Arias, J.; Bergeron, E.; Keller, J.; Ostopowich, F.; Burgaud, F.

(7) Tanaka, K.; Kremer, J.; Jacobsen, R.; Trenalone, J.; Logue, J.; Meads, D.; Missud, D.; Orsini, A.