Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Jizọs Agaghị Ngwa Ngwa

Ihe Mere Jizọs Agaghị Ngwa Ngwa

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ihe Mere Jizọs Agaghị Ngwa Ngwa

JIZỌS nụrụ na ezi enyi ya bụ́ Lazarọs nọ n’oké ọrịa. Ọ bụ onye ozi Meri na Mata, ụmụnne Lazarọs ndị nwaanyị, dunyere wetaara Jizọs ozi ahụ. Onye ozi ahụ si Betani, bụ́ ebe Lazarọs na ụmụnne ya ndị nwaanyị bi. Ụmụnne Lazarọs kweere na Jizọs ga-agwọtali nwanne ha nwoke, n’agbanyeghị na ha bi n’ebe dị anya n’ofe Osimiri Jọdan. Ha maara na ọ nọrọla ebe dị anya gwọọ ndị mmadụ ọrịa na mbụ.—Matiu 8:5-13; Jọn 11:1-3.

Mgbe onye ozi ahụ bịakwutere Jizọs ma kọọrọ ya akụkọ ọjọọ ahụ, Jizọs emeghị ihe ọ bụla. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ nọrọ ụbọchị abụọ n’ebe ahụ.” (Jọn 11:6) Ị̀ maara ihe mere Jizọs emeghị ngwa ngwa ịga nyere Lazarọs aka?— * Ka anyị kwuo banyere ya.

Jizọs maara na Lazarọs anwụọla n’ọrịa ya. N’ihi ya, ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ka anyị gaghachi na Judia.” Ha kwuru, sị: “Ọ dịchabeghị anya ndị Judia chọrọ ịtụ gị nkume, ị̀ na-agaghachi ebe ahụ?” Jizọs kọwara, sị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.”

Ndịozi ya gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.” Jizọs kọwaziri, sị: “Lazarọs anwụwo.” Mgbe ahụ o kwuru ihe ọ ga-abụrịrị na o juru ha anya, sị: “Ana m aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi unu na anọghị m n’ebe ahụ . . . Ma ka anyị gakwuru ya.”

Tọmọs ji obi ike kwuo, sị: ‘Ka anyị onwe anyị gaakwa, ka anyị wee soro Jizọs nwụọ.’ Tọmọs maara na ndị iro ga-agbalị ọzọ igbu Jizọs nakwa na e nwere ike igbukwa ndịozi ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ha niiile gawara. Mgbe ihe dị ka abalị abụọ gachara, ha rutere Betani, bụ́ obodo Lazarọs. Ọ dị ihe dị ka kilomita atọ site na Jeruselem.—Jọn 11:7-18.

Ị̀ maara ihe mere obi ji dị Jizọs ụtọ na ya agaghị ngwa ngwa karịa mgbe ahụ?— Jizọs akpọlitela ndị mmadụ n’ọnwụ tupu mgbe ahụ, ma ndị ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ nwụrụ naanị awa ole na ole tupu ya akpọlite ha. (Luk 7:11-17, 22; 8:49-56) Ma, ozu Lazarọs dị n’ili kemgbe abalị anọ. O doro mmadụ niile anya na ọ nwụọla n’ezie!

Nwanne Lazarọs bụ́ Mata nụrụ na Jizọs nọ nso na Betani, ya agbara ọsọ gawa izute ya. O kwuru, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Jizọs mesiri ya obi ike, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Mata gbaghachiri ma takwunyere Meri nwanne ya nwaanyị, sị: “Onye Ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.”

Meri gawara ozugbo ịhụ Jizọs. Ma, ìgwè mmadụ nọ n’ebe ahụ chere na ọ na-aga n’ili ahụ, n’ihi ya, ha sooro ya. Mgbe Jizọs hụrụ ka Meri na ìgwè mmadụ ahụ na-ebe ákwá, “anya mmiri” gbakwara ya. N’oge na-adịghị anya, ha niile rutere n’ili ahụ, bụ́ nke e ji nnukwu nkume mechie. Jizọs nyere iwu, sị: “Kwapụnụ nkume ahụ.” Ma Mata kwuru, sị: “Onyenwe anyị, ka ọ dị ugbu a, ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì, n’ihi na o meela ụbọchị anọ.”

Ndị mmadụ mere ihe Jizọs kwuru ma kwapụ nkume ahụ. O kpeziri ekpere, kelee Chineke maka ike ọ maara Chineke ga-enye ya iji kpọlite Lazarọs. Jizọs “ji oké olu tie mkpu, sị: ‘Lazarọs, pụta!’” Lazarọs bu “ákwà e kere ya” jiri ụkwụ ya pụta. N’ihi ya, Jizọs nyere iwu, sị: “Tọpụnụ ya ákwà ma hapụ ya ka ọ laa.”—Jọn 11:19-44.

Ị̀ ghọtala ugbu a ihe mere Jizọs agaghị ngwa ngwa?— Ọ maara na ọ bụrụ na ya echere, ya ga-enwe ike ịgbakwu àmà banyere Nna ya, bụ́ Jehova. Ebe ọ bụkwa na oge ahụ ọ họọrọ ịga bụ oge kacha mma, ọtụtụ ndị kweere na Chineke. (Jọn 11:45) Ị̀ hụrụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya Jizọs?—

I nwekwara ike ịhọrọ oge dị mma iji gbaa àmà banyere ihe ndị magburu onwe ha Chineke merela na ndị ọ ka ga-eme. Ma eleghị anya, i nwere ike ịkọrọ ha ụmụ akwụkwọ ibe gị ma ọ bụ ndị nkuzi gị. Ụfọdụ ndị na-eto eto ejiridịla ohere ha nwetara mgbe ha nọ na klas kọọrọ ụmụ klas ha banyere ngọzi ndị magburu onwe ha Alaeze Chineke ga-ewetara ụmụ mmadụ. O doro anya na ị gaghị akpọliteli ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ma i nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke bụ́ onye nwere ikike ịkpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ọ ga-akpọlitekwa ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

AJỤJỤ:

▪ Gịnị mere Jizọs emeghị ngwa ngwa ịga nyere Lazarọs aka?

▪ Gịnị mere Tọmọs ji sị: ‘Ka anyị onwe anyị gaa, ka anyị wee soro Jizọs nwụọ’?

▪ Olee otú Jizọs si nwee ike ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ?

▪ Olee ihe i nwere ike ime iji gosi na ị mụtara ihe n’ihe nlereanya Jizọs?