Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Kwanyeere Anyị Ùgwù Site n’Inye Anyị Ikike Ikpebiri Onwe Anyị Ihe Anyị Ga-eme

Ọ Kwanyeere Anyị Ùgwù Site n’Inye Anyị Ikike Ikpebiri Onwe Anyị Ihe Anyị Ga-eme

BỊARUO CHINEKE NSO

Ọ Kwanyeere Anyị Ùgwù Site n’Inye Anyị Ikike Ikpebiri Onwe Anyị Ihe Anyị Ga-eme

2 NDỊ EZE 18:1-7

NNE NA NNA kwesịrị igosi ụmụ ha ezi ihe nlereanya. Àgwà ọma nne na nna nwere ike inyere nwata aka ịmụta ezigbo àgwà na ịhọrọ ime ihe dị mma ná ndụ. Ọ dị mwute na ọtụtụ nne na nna na-egosi ụmụ ha ajọ ihe nlereanya. Ọ̀ pụtara na ụmụaka dị otú ahụ enweghị ike ime nke ọma ná ndụ? Azịza ya dị n’otu n’ime eziokwu ndị kacha agba ume—Jehova Chineke kwanyeere onye nke ọ bụla n’ime anyị ùgwù site n’inye anyị ikike ikpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme. Tụlee akụkọ banyere Hezekaya, nke dị ná 2 Ndị Eze 18:1-7.

Hezekaya bụ “nwa Ehaz bụ́ eze Juda.” (Amaokwu 1) Ehaz mere ka ndị ọ na-achị hapụ ofufe dị ọcha nke Jehova. Ajọ eze a fere Bel, bụ́ nke gụnyere ịchụ ndị mmadụ n’àjà. O gburu otu n’ime ụmụnne Hezekaya ma ọ bụ karị. Ehaz mere ka e mechie ọnụ ụzọ abụọ nke ụlọ nsọ Chineke ma “meere onwe ya ebe ịchụàjà n’akụkụ ngalaba ụzọ ọ bụla na Jeruselem.” Ọ ‘kpasuru Jehova iwe.’ (2 Ihe E Mere 28:3, 24, 25) O doro anya na nna Hezekaya bụ nnọọ onye ọjọọ. Ma, Hezekaya ọ̀ ga-emerịrị ihe ọjọọ ndị ahụ nna ya mere?

N’oge na-adịghị anya Hezekaya nọchichara Ehaz n’ocheeze, o gosiri na ọ bụghị iwu na ya ga-agbaso àgwà ọjọọ nna ya. Hezekaya “wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova.” (Amaokwu nke 3) Hezekaya tụkwasịrị Jehova obi, ‘ọ dịghịkwa onye dị ka ya n’ime ndị eze niile nke Juda.’ (Amaokwu nke 5) N’afọ mbụ nke ọchịchị ya, eze ahụ na-eto eto malitere ịlụso ofufe rụrụ arụ ọgụ nke mere ka e wepụ ebe ndị dị elu, bụ́ ebe ndị a na-anọ ekpere arụsị. E mepeghachiri ụlọ nsọ ahụ, maliteghachikwa ofufe dị ọcha. (Amaokwu nke 4; 2 Ihe E Mere 29:1-3, 27-31) Hezekaya ‘rapaara Jehova n’ahụ́, Jehova wee nọnyere ya.’—Amaokwu nke 6, 7.

Olee ihe mere Hezekaya ji nwee ike izere ihe nlereanya ọjọọ nna ya? Ọ̀ ga-abụ na nne ya, bụ́ Abaịja—bụ́ onye anyị na-amachaghị ihe banyere ya—nyeere nwa ya aka ime ezi ihe? Ezi ihe nlereanya Aịzaya, bụ́ onye malitere ibu amụma tupu a mụọ Hezekaya, ò metụtara àgwà Hezekaya mgbe ọ ka na-eto eto dị ka nwa eze? * Baịbụl agwaghị anyị. Nke ọ bụla ọ bụ, otu ihe doro anya: Hezekaya họọrọ ibi ndụ dị nnọọ iche na nke nna ya.

Ihe nlereanya Hezekaya ga-agba onye nne na nna na-eme omume ọjọọ zụlitere ume. Mmadụ agaghị agbanweli ihe garala aga; anyị enweghị ike ịgbanwe ihe ọjọọ ndị mere anyị n’oge gara aga. Ma, ihe ọjọọ ndị ahụ mere anyị apụtaghị na anyị agaghị emeli nke ọma ná ndụ. Anyị nwere ike ịhọrọ ugbu a ụdị ndụ nke ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ n’ọdịnihu. Dị ka Hezekaya, anyị nwere ike ịhọrọ ịhụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, n’anya ma fee ya ofufe. Ụdị ndụ ahụ ga-eme ka anyị bie ndụ obi ụtọ ugbu a, meekwa ka anyị nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) Anyị kwesịrị nnọọ ikele Chineke hụrụ anyị n’anya, bụ́ onye kwanyeere onye nke ọ bụla n’ime anyị ùgwù site n’inye anyị onyinye dị ezigbo oké ọnụ ahịa—ikike ikpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Aịzaya buru amụma malite n’ihe dị ka afọ 778 T.O.A. (Tupu Oge Anyị) ruo mgbe afọ 732 T.O.A. gafere. Hezekaya malitere ịchị n’afọ 745 T.O.A., mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise.