Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwela Ka E Duhie Gị

Ekwela Ka E Duhie Gị

Ekwela Ka E Duhie Gị

DON QUIXOTE bụ onye a ma ama a kọrọ n’akụkọ ifo n’akwụkwọ ọgụgụ onye Spen dịrị ndụ na narị afọ nke iri na isii, bụ́ Miguel de Cervantes, dere nke a na-akpọkwa Don Quixote. N’akwụkwọ ọgụgụ ahụ, Don Quixote nọ nnọọ na-ege akụkọ ifo a kọrọ banyere ndị ọchịagha yi uwe agha na-egbuke egbuke bụ́ ndị na-abịa anapụta ụmụ agbọghọ mara mma nọ ná nsogbu. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ikwere na ya bụkwa ọchịagha a na-akwanyere ùgwù. N’otu ebe a ma ama n’akụkọ ahụ, ọ lụsoro ọtụtụ ihe e ji adọpụta mmiri ikuku na-ebugharị ọgụ bụ́ ndị yiri ya ndị dike dị njọ. Ebe obi siri ya ike na ya na-alụrụ Chineke ọgụ site n’igbu ndị dike ahụ, o mechuru onwe ya ihu.

N’ezie, Don Quixote bụ naanị onye e ji kọọ akụkọ ifo, ma iduhie mmadụ abụghị ihe egwuregwu. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere onye aṅụrụma nke na-eche na ya nwere ike ịṅụ iko mmanya ole sọrọ ya, ma ya emechaa kpatara onwe ya ọrịa, tisaakwa ezinụlọ ya. Ma ọ bụ chee banyere nwata nwaanyị na-atụ ụjọ nri nke na-eche na ọ na-eri nri na-edozi ahụ́ nakwa na ahụ́ gbasiri ya ike, ma ya abụrụ nnọọ na o ji nwayọọ nwayọọ na-anwụ n’agụụ.

È nwere ike iduhie onye ọ bụla n’ime anyị? Ọ dị mwute na azịza ya bụ ee. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ike iduhie anyị niile. Nke ahụ pụtakwara na e nwere ike iduhie anyị n’ihe metụtara ozizi anyị ji kpọrọ nnọọ ihe n’okpukpe anyị—bụ́ nke nwere ike ịkpatara anyị oké ọdachi. Olee ihe mere o ji dị otú ahụ? Olee otú i nwere ike isi zere ịbụ onye e duhiere?

Ihe Ọjọọ Dị n’Ịbụ Onye E Duhiere

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na iduhie mmadụ pụtara “ime ka mmadụ kwere na ihe na-abụghị eziokwu bụ eziokwu ma ọ bụ na ihe na-adịghị mma dị mma.” Ọ pụtakwara “ime ka mmadụ kweta echiche ma ọ bụ nkwenkwe ụgha bụ́ nke nwere ike ime ka onye ahụ ghara ịma nke a na-akọ, nọrọ ná mgbagwoju anya, ma ọ bụ ghọzie onye ụwa na-atụ n’ọnụ.” Isi ihe okwu ahụ na okwu ndị ọzọ yiri ya, dị ka “ịghọgbu mmadụ” na “imegharị mmadụ anya,” pụtara bụ iji aghụghọ dufuo mmadụ. O doro anya na onye na-amaghị na e meela ka ọ “ghara ịma nke a na-akọ, nọrọ ná mgbagwoju anya, ma ọ bụ ghọzie onye ụwa na-atụ n’ọnụ” site n’ịma ụma ghaara ya ụgha nọ n’ezigbo ihe ize ndụ.

Ihe na-ewute nnọọ ewute n’okwu a bụ na ọtụtụ mgbe, onye e duhiere ma ọ bụ onye e megharịrị anya na-akpọkarị ekwe nkụ n’ihe o kweere n’agbanyeghị ezigbo ihe akaebe na-egosi na ihe ahụ o kweere ezighị ezi. Ikekwe, ọ na-etinye obi ya dum n’ihe o kweere nke na ọ naghị achọ ịhụ ma ọ bụ ịṅụ ihe akaebe ọ bụla nwere ike imegide ya.

È Nwere Ike Iduhie Anyị?

I nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ́ bụghị ikwubiga okwu ókè ịsị na e nwere ike iduhie anyị niile n’ihe metụtara nkwenkwe okpukpe anyị?’ Mba, ọ bụghị. Nke a bụ n’ihi na Setan bụ́ Ekwensu, onye Jizọs kpọrọ “nna ụgha,” fooro ntutu taa na ọ ga-eduhie ma megharịa anyị niile anya. (Jọn 8:44) Na Baịbụl, a kpọkwara Setan “chi nke usoro ihe a.” Kemgbe ụwa, o mewo ka uche ọtụtụ nde mmadụ “kpuo ìsì.” (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Ọbụna ugbu a, ọ “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9.

Setan malitere iduhie ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya e kechara mmadụ. Dị ka ihe atụ, o duhiere Iv ikwere na o kwesịghị irubere iwu Onye kere ya isi nakwa na o nwere ike ‘ịdị ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ,’ ya bụ, ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:1-5) Nke ahụ bụ nduhie mbụ gbara ọkpụrụkpụ, n’ihi na n’agbanyeghị na e nyere ụmụ mmadụ ohere ịhọrọ ihe ha chọrọ ime, e keghị ha iji aka ha kpebie ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụ naanị Chineke, bụ́ Onye Okike na Ọkaakaa, nwere ikike ahụ. (Jeremaya 10:23; Mkpughe 4:11) Ọ bụrụ na anyị echee na ikike e nyere anyị ịhọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ pụtara na anyị nwere ikike ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, e megharịala anyị nnọọ anya! Ọ dị mwute na anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-adabakarị n’ọnyà ahụ.

Ò Nwere Ike Ime Gị?

O nwere ike ịbụ na nkwenkwe okpukpe gị ndị i ji kpọrọ nnọọ ihe adịla kemgbe ọtụtụ narị afọ, ikekwe, ha si n’aka otu ọgbọ gafeere ọgbọ ọzọ. Ma, nke ahụ apụtachaghị na ha ziri ezi. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ihe e dere na Baịbụl gosiri na n’oge na-adịghị anya ndịozi Kraịst nwụchara, ndị nduhie biliri n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma kụzie “ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:29, 30) Ha ji nnọọ akọ were “arụmụka ire ụtọ” nakwa “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị” duhie ndị mmadụ.—Ndị Kọlọsi 2:4, 8.

Ụdị ihe ahụ ọ̀ kwụsịla ime taa? Mba, n’ihi na Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na ihe ga-aka njọ “n’oge ikpeazụ,” bụ́ oge anyị bi na ya ugbu a. O dere, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ, na-eduhie ndị mmadụ ma bụrụ ndị a na-eduhie.”—2 Timoti 3:1, 13.

N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe iji ịdọ aka ná ntị a Pọl onyeozi nyere kpọrọ ihe: “Ya mere, ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrịnt 10:12) O doro anya na Pọl na-ekwu banyere mmekọrịta mmadụ na Chineke. N’ezie, iche na Setan emekataghị duhie gị bụ imegharị nnọọ onwe gị anya. Ọ dịtụghị onye “atụmatụ aghụghọ” Setan na-enweghị ike imetụta. (Ndị Efesọs 6:11) Ọ bụ ya mere onyeozi ahụ ji kwuo na egwu na-atụ ya na “e nwere ike merụọ obi” Ndị Kraịst ibe ya, “o wee ghara izi ezi, gharakwa ịdị ọcha dị ka o kwesịrị Kraịst, dị ka agwọ ahụ ji aghụghọ ya rafuo Iv.”—2 Ndị Kọrịnt 11:3.

Olee Otú I Nwere Ike Isi Zere Ịbụ Onye E Duhiere?

N’ihi ya, olee otú i nwere ike isi zere ịbụ onye Setan duhiere? Olee otú ị ga-esi jide n’aka na ị ‘na-efe Chineke ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu’? (Jọn 4:24) Jiri ihe ndị Jehova Chineke nyere gị rụọ ọrụ. Nke mbụ bụ na o nyere gị “ikike inwe nghọta” ka i nwee ike ịmata ihe dị iche n’eziokwu na ụgha. (1 Jọn 5:20) O meekwala ka i nwee ike ịmata atụmatụ Setan. (2 Ndị Kọrịnt 2:11) N’eziokwu, o nyela gị ihe niile dị gị mkpa iji guzogide mbọ Setan na-agba iduhie gị.—Ilu 3:1-6; Ndị Efesọs 6:10-18.

Nke kacha mkpa bụ na Chineke enyela gị ihe ị ga-atụkwasị obi ga-enyere gị aka ichebe onwe gị. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ otu ihe ahụ Pọl onyeozi gbara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti ume ka ọ dabere na ya n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Mgbe Pọl onyeozi dọchara Timoti aka ná ntị banyere “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie,” ọ gwara ya ka o guzogide ha site n’ime ka ihe niile o kweere dabere ‘n’ihe odide ndị dị nsọ’—ya bụ, Okwu Chineke dị nsọ, bụ́ Baịbụl.—2 Timoti 3:15.

Ụfọdụ nwere ike ikwu na e duhiela onye ọ bụla kweere na Chineke ma kweta na Baịbụl bụ Okwu Ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Ma, ndị e duhiere n’ezie bụ ndị kpọrọ ekwe nkụ jụ ikweta ihe akaebe niile e nwere na-egosi na e nwere Onye Okike nakwa na Baịbụl bụ n’ezie Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. *Ndị Rom 1:18-25; 2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:19-21.

Kama ikwe ka e jiri ihe “a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha” duhie gị, jiri Okwu Chineke mee ka eziokwu doo anya. (1 Timoti 6:20, 21) Dịrị ka ndị ikom na ndị inyom nwere ezi obi bụ́ ndị Pọl onyeozi kwusaara ozi ọma na Beria. Ha “ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke.” Ọ bụghị naanị na ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwere ihe Pọl onyeozi kụziiri ha, kamakwa ha “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ 17:11.

Isi otú a enyocha ihe ndị i kweere ekwesịtụghị ịtụ gị ụjọ. N’eziokwu, Baịbụl na-agba gị ume ka ị ‘na-achọpụta ihe niile’ tupu gị ekwere na ha bụ eziokwu. (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ná ngwụcha narị afọ mbụ Oge Anyị, Jọn onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu dum si n’aka mmụọ, kama nwaleenụ okwu si n’aka mmụọ, ka unu wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke.” (1 Jọn 4:1) Ya bụrụgodị na e nwere ozizi okpukpe yiri ka ò “si n’aka mmụọ”—ma ọ bụ n’aka Chineke—ọ ka bụ ihe amamihe dị na ya inyocha Akwụkwọ Nsọ iji jide n’aka na o si n’aka Chineke tupu gị ekwere na ọ bụ eziokwu.—Jọn 8:31, 32.

Mee Ihe Ị Mụtara Eme

Ma, a ka nwere ihe ọzọ a chọrọ gị n’aka. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ, ndị ji echiche ụgha na-aghọgbu onwe ha.” (Jems 1:22) Ịmata ihe Baịbụl na-akụzi ezughị. I kwesịrị ime ha eme. Olee otú ị ga-esi eme nke a? Site n’ime ihe Chineke nyere gị iwu ka ị na-eme ma ghara ime ihe ọ machibidoro iwu.

Dị ka ihe atụ, legodị otú omume rụrụ arụ si ju ebe niile. Ọ́ naghị egosi gị otú Setan si nwee ihe ịga nke ọma n’imegharị ndị mmadụ anya iche na ha nwere ike imebi iwu Chineke nyere banyere omume n’anataghị ntaramahụhụ? N’ihi nke ahụ, Pọl onyeozi nyere Ndị Kraịst ịdọ aka ná ntị a a kapịrị ọnụ: “Unu ekwela ka e duhie unu: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.”— Ndị Galeshia 6:7.

Adịla ka “nwoke nzuzu” ahụ Jizọs kọwara dị ka onye “na-anụ” okwu ya ma ọ “dịghị eme ha.” Dị ka obi Don Quixote ahụ Cervantes kọrọ n’akụkọ ghọgburu ya, a ghọgburu nwoke ahụ n’ihi na o chere na ya nwere ike ịrụ ụlọ siri ike n’elu ájá nkịtị na-esighị ike nke mmiri nwere ike iburu. Kama nke ahụ, dịrị ka nwoke ahụ nke “wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” Jizọs kpọrọ nwoke a onye “nwere uche” n’ihi na ọ nụrụ okwu Jizọs “ma na-eme ha.”—Matiu 7:24-27.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Iji hụ ebe a kọwakwuru ya, gụọ broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? na Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Niile bụ́ ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ị̀ Na-ahụ Ihe Otú Ọ Dị n’Ezie?

Tupu afọ 1940, onye Swidin na-ese ihe, bụ́ Oscar Reutersvärd, sere ma wepụtara ọha na eze ihe osise dị iche iche e mechara kpọwa ihe osise ndị na-agbagwoju anya. Ihe atụ ya e nwere n’oge a dị n’aka ekpe. I lee ihe osise ndị a anya elu elu, o yiri ka hà na-eme ka mmadụ kweta ihe na-eyitụghị ihe ga-eme eme. Ma, ọ bụrụ na mmadụ eleruo ha anya, o nwere ike ịhụ na ha bụ ihe osise omenkà leziri anya see iji megharịa onye na-ele ha anya anya.

Ọ bụghị naanị ihe osise ndị na-agbagwoju anya na-eyi nnọọ ihe ha na-abụghị. Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Baịbụl dọrọ aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

Ihe so mee ka ịdọ aka ná ntị a dị mkpa bụ na ọ dị mgbe e duhiere onye dere ya. Ebe ọ bụ na ọ gụrụ akwụkwọ n’ụkwụ otu n’ime ndị nkụzi okpukpe a kacha mara amara n’oge ya, ya na ndị nọ n’ọkwá dị elu abụrụkwa enyi, o yitụghị onye a ga-eduhie eduhie.—Ọrụ 22:3.

E mere ka nwoke a, bụ́ Sọl nke Tasọs, kweta na onye ọ bụla nke na-ekweghị n’omenala na ọdịnala okpukpe ya kwesịrị ọnwụ. Ebe ndị ndú okpukpe ndị Juu nyere ya ikike, o lere ịkpụpụ Onye Kraịst jụrụ ịhapụ okwukwe ya n’ụlọikpe anya dị ka ọrụ Chineke nyere ya. Ọ kwadodịrị ogbugbu e gburu otu onye obodo ya bụ́ onye e boro ebubo ụgha na o kwuluru Chineke.—Ọrụ 22:4, 5, 20.

Ka oge na-aga, e nyeere Sọl aka ịghọta ọdịiche dị n’ihe ọma na ihe ọjọọ, ihe dị Chineke mma na ihe na-adịghị Ya mma. Ozugbo Sọl ghọtara na ihe ọ na-eme jọrọ njọ, nwoke a na-anụ ọkụ n’obi gbanwere ụzọ ya, a marazie ya dị ka Pọl, onyeozi Jizọs Kraịst. Ebe anya meghere Pọl, ọ chọtara ezi ụzọ e si efe Chineke ofufe.—Ọrụ 22:6-16; Ndị Rom 1:1.

Dị ka ọ dị Pọl, e nwere mgbe e ji ozizi ndị yiri ihe osise ndị na-agbagwoju anya, bụ́ nkwenkwe ndị yiri ka hà bụ eziokwu ma ha esighị n’Okwu Chineke, duhie ọtụtụ ndị obi ha dị ọcha. (Ilu 14:12; Ndị Rom 10:2, 3) E nyeziiri ha aka ịhụ na ihe ndị ha kweere na mkpụrụ okpukpe ha na-amịpụta ezighị nnọọ ezi. (Matiu 7:15-20) Ka ha na-amụtakwu Baịbụl nke ọma, ha gbanwere ihe ndị ha kweere na otú ha si ebi ndụ iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ.

Ọ̀ ga-amasị gị iso ihe nlereanya Pọl onyeozi ma jiri Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, nyochaa ihe ndị i kweere? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 10]

Ọ bụ Doré tụrụ ihe ndị a