Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eme Ihe Ọjọọ?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eme Ihe Ọjọọ?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eme Ihe Ọjọọ?

Ọ DỊ otu ihe ọtụtụ ndị ga-ekweta: Anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, n’ihi ya kwa, anyị na-emehie ihe ma na-eme ihe ndị anyị na-emecha kwaa ụta maka ha. Ma, ọ̀ bụ ya na-akpata ọtụtụ ihe ọjọọ, ma ndị ukwu ma ndị nta, anyị na-ahụ ma ọ bụ na-anụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, ma ndị anyị na-ahụ n’onwe anyị ma ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akọsa?

N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ ezughị okè, ihe ka ọtụtụ kweere na e nwere àgwà mmadụ na-ekwesịtụghị ịkpa nakwa na ụmụ mmadụ ga-ezereli omume ọjọọ. Ihe ka ọtụtụ ga-ekwetakwa na e nwere ọdịiche dị n’ikwu ihe na-abụghị eziokwu n’amaghị ama na ilezi anya kwutọọ mmadụ, n’imerụ mmadụ ahụ́ n’ihe ọghọm na ịkpachara anya gbuo mmadụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbe, ndị yiri ndị ezi mmadụ na-akpa arụ n’obodo. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Gịnị mere ndị mmadụ ji eme ihe ọjọọ?

Baịbụl mere ka nke a doo anya. O kwuru nnọọ isi ihe ndị mere ụmụ mmadụ ji eme ihe ndị ha maara bụ́ ihe ọjọọ. Ka anyị tụlee ihe ndị o kwuru.

▪ “Mmegbu pụrụ ime ka onye maara ihe na-eme ara ara.”EKLIZIASTIS 7:7.

Baịbụl kwetara na mgbe ụfọdụ ọnọdụ ụmụ mmadụ na-eme ka ha mee ihe ha na-agaraghị eme. Ụfọdụ nwedịrị ike ime mpụ n’ihi na ha chere na ọ ga-akwụsị ihe isi ike na ikpe na-ezighị ezi. Akwụkwọ bụ́ Urban Terrorism kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, isi ihe na-akpali onye na-eyi ọha egwu iyi ọha egwu bụ nkụda mmụọ ọ na-enwe n’ihi nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke mmadụ na ibe ya, na nke akụnụba bụ́ ndị yiri ihe na-enweghị ngwọta.”

Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.”1 TIMOTI 6:10.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị bụdị ezigbo mmadụ dị njikere ịrụ arụrụala na ịkpa àgwà ọjọọ ma ọ bụrụ na e nye ha ezigbo ego. Ụfọdụ ndị yiri ka hà dị nwayọọ ma dị obiọma mgbe nsogbu na-adịghị yiri ka hà na-agbanwe n’ihe metụtara ego, nwakasịwa anya ma siwe ọnwụ. Chegodị echiche banyere ọtụtụ mpụ anyaukwu na-akpata—iji iyi egwu anapụ mmadụ ihe, ịpụnara mmadụ ihe, igwu wayo, ịtọrọ mmadụ, na ọbụna igbu ọchụ.

▪ “Ọ bụ n’ihi emeghị ihe e kpere n’ikpe ngwa ngwa banyere ọrụ ọjọọ mere obi ji kaa ụmụ mmadụ nke ukwuu ime ihe ọjọọ.”EKLIZIASTIS 8:11.

Amaokwu a na-egosi na ụmụ mmadụ na-echekarị na ha nwere ike ime ihe ọ bụla n’anataghị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na ndị isi ahụghị ha. Ndị na-efe oké ọsọ n’okporo ụzọ awara awara, ndị na-aghọ aghụghọ n’ule, ndị na-eri ego ọha, na ndị na-eme ihe ndị ka ndị a njọ, na-eche otú ahụ. Mgbe a na-anaghị ata ndị dara iwu ahụhụ ma ọ bụ mgbe ọ na-enweghị onye na-atụ ụjọ na a ga-ejide ya, ndị na-erubebu isi nwere ike ịkata obi mee ihe ha na-agaraghị eme. Magazin bụ́ Arguments and Facts kwuru, sị: “O yiri ka otú o si adịrị ndị omekome mfe ịgbanahụ ntaramahụhụ ọ̀ na-akpali ndị nkịtị ịkpa arụ.”

▪ “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”JEMS 1:14, 15.

Ọ dịghị onye na-enweghị ike iche echiche ọjọọ. Kwa ụbọchị, a na-anwa anyị ọnwụnwa n’ọtụtụ ụzọ ime ihe ọjọọ. N’oge Baịbụl, a gwara Ndị Kraịst, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa bịakwasịrị unu nke na-abụghị nke na-abịara ụmụ mmadụ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:13) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ga-esi na ya pụta dabeere n’ihe mmadụ họọrọ ime—iwepụ echiche ọjọọ ahụ n’obi ya ngwa ngwa ma ọ bụ ịnọgide na-eche ya ma kwe ka o rie ya obi. Amaokwu ahụ dị n’elu nke si n’akwụkwọ ozi Jems si n’ike mmụọ nsọ dee na-adọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka ọchịchọ ọjọọ ‘tụrụ ime,’ omume ọjọọ ga-esirịrị na ya pụta.

▪ “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”ILU 13:20.

Àgwà ndị anyị na ha na-akpa nwere nnọọ ike imetụta anyị—n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. Mgbe mgbe, ndị mmadụ na-eme ihe ha na-ebutụghị n’uche ime—n’ihi ịchọ ime ihe ndị ọgbọ ha na-eme, ma ọ bụ dị ka ọtụtụ ndị na-ekwu, n’ihi enyi ọjọọ, ya akpatakwara ha ọdachi. Ndị Baịbụl kpọrọ “ndị nzuzu” abụghị ndị na-enweghị ọgụgụ isi, kama ha bụ ndị leghaara ezi ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke anya. Ma ànyị bụ nwata ma ànyị bụ okenye, ọ bụrụ na anyị ejighị amamihe họrọ ndị enyi anyị, ya bụ, isoro ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl, anyị ga-atụ anya na “ihe agaghị agaziri” anyị.

Amaokwu ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ dị na Baịbụl kọwara nnọọ ihe mere ndị mmadụ—ikekwe ndị bụ́ ezigbo ụmụ amaala n’ụzọ ndị ọzọ—ji eme ihe ọjọọ, ọbụna ihe ndị jọgburu onwe ha. Ọ bụ ezie na ọ bara uru ịghọta ihe na-akpali ndị mmadụ ime ihe ndị jọgburu onwe ha, è nwere olileanya na ihe ga-agbanwe n’ọdịnihu? Ee, n’ihi na ọ bụghị naanị na Baịbụl kọwara ihe mere ndị mmadụ ji eme ihe ọjọọ, kama o kwekwara nkwa na ihe ọjọọ ndị ahụ ga-akwụsị. Olee nkwa ndị o kwere? Ihe ọjọọ niile dị n’ụwa hà ga-akwụsị n’ezie? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị ahụ.