Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe mere akwụkwọ Baịbụl bụ́ 1 Ndị Kọrịnt ji kwuo banyere anụ e ji chụọrọ arụsị àjà?

Pọl onyeozi dere, sị: “Na-erinụ ihe niile a na-ere n’ọdụ anụ, n’ajụghị ase ọ bụla n’ihi akọ na uche unu.” (1 Ndị Kọrịnt 10:25) Olee ebe ụdị anụ ahụ si?

Iji anụmanụ achụ àjà bụ ememme bụ́ isi a na-eme n’ụlọ arụsị ndị Gris na Rom, ma a naghị ericha anụ niile si n’anụmanụ ndị e ji chụọ àjà n’ememme ahụ. A na-ere anụ ndị e rifọrọ n’ụlọ arụsị n’ọdụ anụ. Akwụkwọ bụ́ Idol Meat in Corinth kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ arụsị . . . ndị osi ite na/ma ọ bụ ndị ogbu anụ. Ha na-esi n’òkè e kenyere ha n’ihi anụ ha gburu e ji chụọ àjà ere anụ n’ahịa.”

N’ihi ya, ọ bụghị anụ niile a na-ere n’ahịa bụ anụ e rifọrọ n’ememme okpukpe. N’ahịa anụ Pompei (Latịn, macellum), e gwupụtara ọkpụkpụ atụrụ zuru ezu. Ọkà mmụta Baịbụl bụ́ Henry J. Cadbury kwuru na nke a na-egosi na “ọ ga-abụ na a na-ere anụmanụ ndị dị ndụ na macellum ma ọ bụ gbuo ha n’ebe ahụ, na-erekwa ndị nke a bọrọla abọ ma ọ bụ ndị nke e jiri chụọ àjà n’ụlọ arụsị n’ahịa ahụ.”

Ihe okwu Pọl pụtara bụ na ọ bụ ezie na Ndị Kraịst agaghị eso efe arụsị, ma anụ e ji chụọ àjà n’ụlọ arụsị arụghị arụ n’onwe ya.

Gịnị mere iro ji dị n’etiti ndị Juu na ndị Sameria n’oge Jizọs?

Jọn 4:9 kwuru na “ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe.” Ọ dị ka iro a ò bidoro mgbe Jeroboam hiwere ofufe arụsị n’alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu. (1 Ndị Eze 12:26-30) Ndị Sameria si na Sameria, bụ́ isi obodo nke alaeze ebe ugwu ahụ. Mgbe ndị Asiria meriri ebo iri nke Izrel n’afọ 740 T.O.A. (Tupu Oge Anyị), ha kpọtara ndị mba ọzọ na-ekpere arụsị na Sameria. O doro anya na ndị Sameria na ndị a si esi bịa ịlụrịta di na nwunye mere ka ofufe ndị Sameria rụkwuo arụọ.

Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, ndị Sameria megidere mgbalị ndị Juu si ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn lọta mere iwughachi ụlọ nsọ Jehova na mgbidi obodo Jeruselem. (Ezra 4:1-23; Nehemaya 4:1-8) Esemokwu dị n’etiti okpukpe ndị Juu na nke ndị Sameria kara njọ mgbe ndị Sameria wuru ụlọ nsọ nke ha n’Ugwu Gerizim, ikekwe, na narị afọ nke anọ T.O.A.

N’oge Jizọs, aha bụ́ “onye Sameria” na-aka egosi okpukpe mmadụ karịa obodo o si, ọ bụkwa ihe a na-akpọ onye na-ekpe okpukpe wuru ewu na Sameria. Ndị Sameria ka na-efe ofufe n’Ugwu Gerizim, ndị Juu na-eledakwa ha anya ma jiri ha na-eme akaje.—Jọn 4:20-22; 8:48.

[Foto dị na peeji nke 12]

Efere nkụwa e sere ebe a na-achụ anụmanụ n’àjà, narị afọ nke isii T.O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

[Foto dị na peeji nke 12]

Jeroboam hiwere ofufe arụsị