Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Ò Si n’Aka Chineke?
Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Ò Si n’Aka Chineke?
DEVON kwuru, sị: “O kweghị m nnọọ nghọta. Kwa izu na chọọchị m, o yiri ka ọtụtụ ndị hà na-enweta mmụọ nsọ ma na-asụ asụsụ dị iche iche n’ụzọ ọrụ ebube. Ụfọdụ n’ime ha na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ma, m na-agbalị ibi ndụ dị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, anatatụbeghị onyinye mmụọ nsọ a ọ bụ ezie na m na-ekpe ekpere ọtụtụ mgbe maka ya. Gịnị mere ọ ga-eji dị otú ahụ?”
Gabriel na-agakwa chọọchị ebe o yiri ka ndị mmadụ hà na-enweta mmụọ nsọ ma na-asụ asụsụ dị iche iche. Ọ kọwara, sị: “Ihe na-ewute m bụ na mgbe m na-ekpe ekpere, ndị ọzọ na-etichi m ntị, na-ekwu ihe ma ha ma ndị ọzọ na-anaghị aghọta. O nweghị onye na-erite uru n’ihe ha na-ekwu. Onyinye si n’aka mmụọ Chineke ò kwesịghị ịba uru?”
Ihe ahụ mere Devon na Gabriel na-eme ka anyị jụọ ajụjụ a onye ọ bụla ga-achọ ịmata azịza ya, Asụsụ dị iche iche a na-asụ na chọọchị ụfọdụ taa ò si n’aka Chineke n’ezie? Ileba anya n’onyinye iji ọrụ ebube asụ asụsụ dị iche iche nke e nyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.
Ha ‘Amalite Ikwu Okwu n’Asụsụ Dị Iche Iche’
Na Baịbụl, a kọọrọ anyị banyere ndị nwoke na ndị nwaanyị ụfọdụ e nyere ikike ịsụ asụsụ dị iche iche ha na-amụghị amụ. Oge mbụ nke a mere bụ na Pentikọst 33 O.A. (Oge Anyị), bụ́ izu ole na ole Jizọs Kraịst nwụchara. N’ụbọchị ahụ na Jeruselem, ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ “[jupụtara] na mmụọ nsọ, malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.” Ndị ọbịa si mba dị iche iche nọ “ná mgbagwoju anya, n’ihi na onye ọ bụla nụrụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.”—Ọrụ 1:15; 2:1-6.
Baịbụl kwukwara banyere ndị ọzọ soro ụzọ Jizọs n’oge gboo, bụ́ ndị nwere ikike a pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, mmụọ nsọ nyere Pọl onyeozi ikike ịsụ ọtụtụ asụsụ n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọrụ 19:6; 1 Ndị Kọrịnt 12:10, 28; 14:18) Ma, o doro anya na onyinye ọ bụla dị otú ahụ nke si n’aka mmụọ nsọ Chineke kwesịrị inwe nzube e ji nye ya. Ya mere, olee uru ịsụ asụsụ dị iche iche bara n’oge Baịbụl?
Ihe Na-egosi na Chineke Kwadoro Ha
Mgbe Pọl na-edegara Ndị Kraịst nọ n’obodo Kọrịnt, bụ́ ndị o doro anya na ụfọdụ n’ime ha na-asụ asụsụ dị iche iche, akwụkwọ ozi, ọ kọwara na “asụsụ dị iche iche bụ maka ihe ịrịba ama . . . n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ.” 1 Ndị Kọrịnt 14:22) Ya mere, ikike ịsụ asụsụ dị iche iche na ikike ịrụ ọrụ ebube ndị ọzọ gosiri ndị mmadụ na Chineke na-agọzi ma na-akwado ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ e hiwere ọhụrụ. Onyinye ọrụ ebube ndị ahụ yiri saịn bọọdụ na-egosi ndị na-achọ eziokwu ebe ha kwesịziri ịga iji chọta ndị Chineke họọrọ.
(Ọ dị mma ịmara na Baịbụl ekwughị na Jizọs ma ọ bụ ndị amụma e nwere tupu oge Ndị Kraịst sụrụ asụsụ ndị ha na-amụghị amụ n’ụzọ ọrụ ebube. N’ihi ya, o doro anya na e nwere ihe ọzọ mere e ji nye ndị na-eso ụzọ Jizọs onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche.
Ihe A Ga-eji Gbasaa Ozi Ọma
Ná mmalite ozi Jizọs, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu izi naanị ndị Juu ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 10:6; 15:24) N’ihi ya, ọ na-esi ike ndị na-eso ụzọ Jizọs ezie ozi ọma n’ebe ọtụtụ ndị Juu na-ebighị. Ma, nke ahụ ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya.
Obere oge Jizọs nwụchara n’afọ 33 O.A., o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ ka ha “mee ndị mba niile ndị na-eso ụzọ [ya].” Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na ha ga-abụ ndị àmà ya “ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Matiu 28:19; Ọrụ 1:8) Ịgbasaru ozi ọma ahụ otú ahụ ga-achọ ịsụ ọtụtụ asụsụ ndị na-abụghị Hibru.
Ma, ọtụtụ n’ime ndị mbụ ahụ soro ụzọ Jizọs bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Oleezi otú ha ga-esi nwee ike ikwusa ozi ọma n’ala ndị dị anya bụ́ ebe a na-asụ asụsụ ndị o nwere ike ịbụ na ha anụtụbeghị, ma ya fọdụzie ịma otú e si asụ ha? Mmụọ nsọ nyere ụfọdụ n’ime ndị ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma ike isi n’ụzọ ọrụ ebube kwusaa ozi ọma werewere n’asụsụ ndị ha na-amụtụghị amụ.
Ya mere, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche rụrụ ọrụ abụọ dị mkpa. Nke mbụ, ọ bụ ihe àmà gosiri na Chineke na-akwado Ndị Kraịst oge mbụ ahụ. Nke abụọ, ọ bụ ngwá ọrụ dị irè ga-enyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ịrụzu ọrụ e nyere ha nke bụ́ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma n’ọtụtụ asụsụ. Asụsụ dị iche iche a na-asụ n’ọtụtụ chọọchị taa ọ̀ na-arụzu ihe ndị a?
Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Taa —Ọ̀ Na-egosi Nkwado Chineke?
Olee ebe ị ga-egwunye saịn bọọdụ ị chọrọ ka o duzie mmadụ niile o kwere mee n’obodo? Ị̀ ga-egwunye ya n’ime ụlọ? Mbanụ! Akụkọ ihe mere n’ụbọchị Pentikọst gwara anyị na “ìgwè mmadụ” na-agafe agafe hụrụ ihe àmà nke asụsụ dị iche iche ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs sụrụ n’ụzọ ọrụ ebube. N’ihi ya, “a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ” n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’ụbọchị ahụ! (Ọrụ 2:5, 6, 41) Ọ bụrụ na ndị mmadụ taa ana-ekwu na ha na-asụ asụsụ dị iche iche ma na-asụ ya naanị n’ime chọọchị ha, olee otú ọ ga-esi ghọọrọ ìgwè ndị na-ekweghị ekwe ihe àmà?
Okwu Chineke kwuru na ịkwa iko na “ọrụ nke anụ ahụ́” ndị ọzọ na-emegide ọrụ nke mmụọ nsọ, kwuokwa na “ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galeshia 5:17-21) Ọ bụrụ na ị hụ ebe ndị na-eme omume rụrụ arụ na-asụ asụsụ dị iche iche, i nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ọ́ gaghị abụ ihe na-ekwekọghị ekwekọ—na ihe nwedịrị ike iduhie mmadụ—inye ndị nọgidere na-akpa àgwà ndị Okwu Chineke katọrọ mmụọ nsọ?’ Nke ahụ ga-adị ka igwunye saịn bọọdụ nke na-atụrụ ndị mmadụ aka n’ebe na-abụghị ebe ha na-aga.
Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Taa —Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Agbasa Ozi Ọma?
Olee maka ihe nke ọzọ ahụ mere e ji nye onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche na narị afọ mbụ? À na-eji asụsụ dị iche iche a na-asụ na chọọchị taa ekwusara ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ozi ọma? Cheta na ndị hụrụ ihe ahụ merenụ na Jeruselem na Pentikọst 33 O.A. si n’ọtụtụ ala, ha ghọtakwara nnọọ asụsụ ndị ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs sụrụ n’ụzọ ọrụ ebube.
Ma, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche taa na-asụkarị ihe ndị mmadụ na-anaghị aghọta.O doro anya na asụsụ dị iche iche a na-asụ n’oge a dị nnọọ iche n’onyinye mmụọ nsọ e nyere ndị mbụ soro ụzọ Jizọs. N’ezie, e nweghị ihe ọ bụla e ji n’aka na-egosi na ọ dị onye natara ụdị ikike ọrụ ebube ahụ kemgbe ndịozi Jizọs nwụchara. Nke a anaghị eju ndị na-agụ Baịbụl anya. Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ buru amụma banyere onyinye ọrụ ebube, nke gụnyere ịsụ asụsụ dị iche iche, sị: “Ha ga-akwụsị.” (1 Ndị Kọrịnt 13:8) Oleezi otú mmadụ nwere ike isi mata ndị nwere mmụọ nsọ taa?
Olee Ndị Na-egosi na Ha Nwere Mmụọ Nsọ?
Jizọs maara nke ọma na onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsị oge na-adịghị anya e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst. Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o kwuru banyere ihe àmà, ma ọ bụ akara, ga-adịgide adịgide a ga-eji na-amata ezi ndị na-eso ụzọ ya. O kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) N’ezie, n’otu amaokwu ahụ Okwu Chineke buru amụma na onyinye ọrụ ebube ga-emecha kwụsị, o kwuru, sị: “Ịhụnanya adịghị ada ada.”—1 Ndị Kọrịnt 13:8.
Ịhụnanya so n’ihe ndị e depụtara so ná “mkpụrụ” nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ, ihe mmụọ nsọ Chineke na-arụpụta. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ya mere, ndị nwere mmụọ Chineke n’ezie—wee bụrụ ndị Chineke na-akwado—ga na-ahụ ibe ha n’anya n’ezie. E wezụga nke ahụ, ihe nke atọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ udo. Ya mere, ndị nwere mmụọ nsọ taa ga na-agba mbọ ime udo, na-agbalịsi ike imeri isi ọnwụ, ịkpa ókè agbụrụ, na ime ihe ike.
Chetakwa amụma Jizọs nke dị n’Ọrụ 1:8. O buru amụma na ndị na-eso ụzọ ya ga-anata ike iji bụrụ ndị àmà ya “ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” Jizọs kwukwara ihe gosiri na ọrụ a ga-adịgide “ruo ọgwụgwụ ụwa.” (Matiu 28:20, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) N’ihi ya, ọrụ ikwusa ozi ọma a a na-arụ ná mba niile ga-anọgide na-abụ ihe e ji ama ndị mmụọ nsọ nyere ike n’ezie.
Olee ihe i chere? Olee ndị ị na-ahụ na-egosi na ha nwere mmụọ nsọ taa? Olee ndị nwere àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ ahụ, karịsịa ịhụnanya na udo, nke na ndị ọchịchị na-ata ha ahụhụ n’ụwa niile n’ihi na ha na-ajụ ịga agha? (Aịzaya 2:4) Olee ndị na-agba mbọ izere ọrụ nke anụ ahụ́, dị ka ịkwa iko, na-ewepụdị ndị na-eme omume ndị dị otú ahụ n’enweghị nchegharị n’etiti ha? (1 Ndị Kọrịnt 5:11-13) Olee ndị na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile na ọ bụ naanị Alaeze Chineke bụ olileanya dịịrị mmadụ niile?—Matiu 24:14.
Ndị na-ebipụta magazin a anaghị ala azụ ikwu na Ndịàmà Jehova ruru ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru e ji ama ndị nwere mmụọ nsọ. Ọ́ gaghị adị mma ka ị matakwuo ha nke ọma ma jiri aka gị kpebie ma Chineke ọ̀ na-akwado ha n’ezie?