6 Ọ̀ Ga-enyere Anyị Aka?
Ekpere
6 Ọ̀ Ga-enyere Anyị Aka?
Ò NWERE aka ọ bụla ekpere na-enyere anyị? Ee, Baịbụl gosiri na ekpere nke ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na-enyere ha nnọọ aka. (Luk 22:40; Jems 5:13) N’ezie, ikpe ekpere nwere ike inyere anyị ezigbo aka n’ụzọ ime mmụọ, n’uche na ọbụna n’ụzọ anụ ahụ́. Olee otú o nwere ike isi mee otú ahụ?
Ọ dị mma, ka e were ya na i nwere nwa mmadụ nyere onyinye. Ị̀ ga-akụziri ya na inwe obi ụtọ maka onyinye ahụ ezuola? Ka ị̀ ga-akụziri ya iji ọnụ ya kelee onye nyere ya onyinye ahụ? Mgbe anyị kwupụtara ihe ndị dị mkpa dị anyị n’obi ekwupụta, anyị na-eme ka ha dokwuo anyị anya ma dịkwuodị anyị mkpa. Otu ihe ahụ ọ̀ na-eme mgbe a bịara n’ịgwa Chineke okwu? Ee, ọ na-eme! Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Ekpere ekele. Mgbe anyị kelere Nna anyị maka ihe ọma ndị na-emere anyị, anyị na-elekwasị anya ná ngọzi ndị anyị na-enweta. N’ihi ya, anyị nwere ike ikelewekwu Chineke, inwekwu obi ụtọ, na inwekwu nchekwube.—Ndị Filipaị 4:6.
Ihe atụ: Jizọs kelere Nna ya n’ihi otú o si na-anụ ma na-aza ekpere ya.—Jọn 11:41.
Ekpere maka mgbaghara. Mgbe anyị rịọrọ Chineke mgbaghara, anyị na-eme ka akọ na uche anyị na-arụkwu ọrụ nke ọma, mee ka nchegharị anyị sikwuo anyị n’obi, ghọtakwuokwa otú mmehie dịruru ná njọ. Obi anyị na-akwụsịkwa ịma anyị ikpe.
Ihe atụ: Devid kpere ekpere iji gosi nchegharị ya na mwute ọ na-enwe.—Abụ Ọma nke 51.
Ekpere maka nduzi na amamihe. Ịrịọ Jehova ka o duzie anyị ma ọ bụ nye anyị amamihe dị anyị mkpa iji mee ezi mkpebi nwere nnọọ ike inyere anyị aka ịdị umeala n’obi. O nwere ike ichetara anyị adịghị ike anyị ma nyere anyị aka ịtụkwasịkwu Nna anyị nke eluigwe obi.—Ilu 3:5, 6.
Ihe atụ: Sọlọmọn ji obi umeala rịọ maka nduzi na amamihe iji chịa Izrel.—1 Ndị Eze 3:5-12.
Ekpere onye nọ ná nsogbu. Ọ bụrụ na anyị awụpụrụ Chineke obi anyị dị ka mmiri mgbe anyị nọ ná nchegbu, obi ga-eru anyị ala, anyị ga-adaberekwa n’ebe Jehova nọ kama ịdabere n’onwe anyị.—Abụ Ọma 62:8.
Ihe atụ: Eze Esa kpere ekpere mgbe o chere onye iro ka ya ike ihu.—2 Ihe E Mere 14:11.
Ekpere maka ọdịmma ndị nọ ná mkpa. Ụdị ekpere ndị ahụ na-enyere anyị aka izere anyaukwu, na-enyekwara anyị aka inwekwu ọmịiko.
Ihe atụ: Jizọs kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 17:9-17.
Ekpere otuto. Mgbe anyị toro Jehova maka ọrụ ya ndị dị ebube na àgwà ya ndị magburu onwe ha, anyị ga na-akwanyekwuru ya ùgwù ma na-ekelekwu ya. Ụdị ekpere ndị ahụ nwekwara ike inyere anyị aka ịbịarukwu Chineke na Nna anyị nso.
Ihe atụ: Devid ji obi ụtọ kelee Chineke maka ihe ndị o kere eke.—Abụ Ọma nke 8.
Ngọzi ọzọ a na-enweta n’ekpere bụ “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Ndị Filipaị 4:7) Mmadụ inwe obi iru ala n’ụwa a nọ ná nsogbu bụ ngọzi dị ụkọ. Ọ badịrị uru n’ụzọ anụ ahụ́. (Ilu 14:30) Ma ànyị na-enweta ya naanị n’ihi mgbalị anyị? Ka ò nwere ihe ka mkpa na-eso eme ka anyị nweta ya?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Ekpere na-abara anyị ọtụtụ uru—n’ụzọ anụ ahụ́, n’uche, nakwa nke ka nke, n’ụzọ ime mmụọ