Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

Ṅomie Okwukwe Ha

O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

SAMUEL lere ndị obodo ya anya n’ihu. Mba ahụ gbakọtara n’obodo Gilgal, bụ́ ebe nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi nke bụrụla onye amụma na onyeikpe ọtụtụ iri afọ kpọkọtara ha. O nwere ike ịbụ n’ọnwa Mee ma ọ bụ Jun na kalenda nke oge a; ọ bụ nnọọ oge ọkọchị. Ọka wit ndị dị n’ubi n’ógbè ahụ achaala maka ọghụghọ. Ebe niile dara nnọọ jụụ. Olee otú Samuel ga-esi mee ka ha chebara onwe ha echiche?

Ndị ahụ aghọtaghị otú ọnọdụ ha jọruru ná njọ. Ha siri ọnwụ ka e nye ha eze bụ́ mmadụ ga na-achị ha. Ha aghọtaghị na ha eledala nnọọ Chineke ha, bụ́ Jehova, na onye amụma ya, anya. Ihe ahụ ha mere bụ nnọọ ịsị na ha achọkwaghị ka Jehova bụrụ Eze ha! Olee otú Samuel ga-esi nwee ike ịkpali ha ichegharị?

Samuel kwuru okwu. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Mụ onwe m emewo agadi ma chaa isi awọ.” Isi awọ ya mere ka ha gekwuo ya ntị. Ọ gwadịrị ha, sị: “Mụ onwe m ejewokwa ije n’ihu unu malite mgbe m bụ nwata ruo taa.” (1 Samuel 11:14, 15; 12:2) Ọ bụ ezie na Samuel emeela agadi, o chefubeghị oge ọ bụ nwata. Ọ ka na-echeta ihe ndị mere n’oge ahụ nke ọma. Mkpebi ndị o mere n’oge ahụ, dị ka nwata nwoke na-eto eto, mere ka o bie ndụ nke gosiri na o nwere okwukwe na Chineke ya, bụ́ Jehova, na ife ya ofufe.

Ugboro ugboro, Samuel gbara mbọ iwusi okwukwe ya ike, n’agbanyeghị na ndị na-enweghị okwukwe na ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi gbara ya gburugburu. Taa, inwe okwukwe ka sikwara ike otú ahụ, n’ihi na anyị bi n’ụwa na-enweghị okwukwe na nke rụrụ arụ. Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya Samuel, malite mgbe ọ bụ nwata.

Ọ “Nọ Na-eje Ozi n’Ihu Jehova Mgbe Ọ Bụ Nwa Okoro”

Ndụ Samuel pụrụ iche mgbe ọ bụ nwata. Obere oge a napụchara ya ara, ikekwe mgbe ọ dị ihe dị ka afọ anọ, ọ malitere ije ozi n’ụlọikwuu Jehova dị nsọ dị na Shaịlo, bụ́ ebe dị ihe karịrị kilomita iri atọ site n’ụlọ ha na Rema. Nne na nna ya, bụ́ Elkena na Hana, nyefere Jehova nwa ha nwoke ka o jeere ya ozi pụrụ iche, mee ka ọ ghọọ onye Naziraịt ná ndụ ya niile. * Nke a ọ̀ pụtara na nne na nna Samuel jụrụ ya ajụ ma ghara ịhụ ya n’anya?

Mbanụ! Ha maara na a ga-elekọta nwa ha nwoke anya na Shaịlo. O doro anya na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ilaị hụrụ na e mere otú ahụ, n’ihi na ya na Samuel rụkọtara nnọọ ọrụ. E nwekwara ọtụtụ ndị inyom rụrụ ọrụ ụfọdụ metụtara ụlọikwuu ahụ, o dokwara anya na a haziri ọrụ ha nke ọma.—Ọpụpụ 38:8.

E wezụga nke ahụ, Hana na Elkena echefutụghị nwa mbụ ha ha hụrụ n’anya, bụ́ onye ọmụmụ ya bụ azịza ekpere ha. Hana rịọrọ Chineke ka o nye ya nwa nwoke, kwe nkwa na ya ga-enyefe Chineke nwata ahụ ka o jiri ndụ ya niile jeere Chineke ozi dị nsọ. Mgbe Hana gara ileta Samuel kwa afọ, ọ na-ewetara ya obere uwe elu ọhụrụ na-enweghị aka ọ kwaara ya iji na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ. Nleta ndị ahụ tọrọ nnọọ nwatakịrị ahụ ụtọ. O doro anya na obi tọrọ ya ụtọ ka nne na nna ya ji ịhụnanya na-agba ya ume ma na-eduzi ya ka ha na-akụziri ya ihe ùgwù ọ bụ ijere Jehova ozi n’ebe ahụ pụrụ iche.

Ndị nne na nna taa nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka Hana na Elkena. Ndị nne na nna na-elekwasịkarị anya n’ihe anụ ahụ́ mgbe ha na-azụ ụmụ ha ma leghara mkpa ime mmụọ ha anya. Ma nne na nna Samuel butere ihe ime mmụọ ụzọ, nke ahụ sokwa nnọọ kpebie ụdị onye nwa ha ghọrọ mgbe o tolitere.—Ilu 22:6.

Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ka nwata ahụ na-eto okorobịa ma na-aga n’ugwu ndị dị gburugburu Shaịlo. Ka ọ na-eledata anya ma hụ obodo ahụ na ndagwurugwu dị n’otu akụkụ ya, ọ ga-abụ na obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ hụrụ ụlọikwuu Jehova. Ụlọikwuu ahụ bụ ebe nsọ n’ezie. * Ụlọikwuu ahụ a gbasoro ntụziaka Mozis rụọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ anọ tupu mgbe ahụ bụ naanị ebe a na-anọ efe Jehova ofufe dị ọcha n’ụwa niile.

Obere nwa bụ́ Samuel bịara nnọọ nwee mmasị n’ụlọikwuu ahụ. N’ihe o mechara dee, o dere, sị: “Samuel nọ na-eje ozi n’ihu Jehova mgbe ọ bụ nwa okoro. Ọ na-eyi efọd e ji ákwà linin mee.” (1 Samuel 2:18) O doro anya na uwe elu ahụ na-enweghị aka Samuel na-eyi gosiri na ọ na-enyere ndị nchụàjà aka n’ụlọikwuu ahụ. Ọ bụ ezie na Samuel abụghị onye nchụàjà, ọ rụrụ ọrụ ndị gụnyere imepe ọnụ ụzọ ndị e si abanye n’èzí ụlọikwuu ahụ n’ụtụtụ na ijere Ilaị merela agadi ozi. Ma, n’agbanyeghị otú ihe ùgwù ndị ahụ o nwere si na-atọ ya ụtọ, ka oge na-aga, ọ hụwara ihe nyewere ya nsogbu n’obi n’ihi na obi ya dị ọcha. E nwere nnọọ ihe ọjọọ na-eme n’ụlọ Jehova.

Ịnọgide Na-adị Ọcha Mgbe Ndị Ọzọ Na-eme Omume Rụrụ Arụ

Mgbe Samuel dị obere, ọ hụrụ nnọọ àgwà ọjọọ na omume rụrụ arụ. Ilaị nwere ụmụ nwoke abụọ, ndị aha ha bụ Họfnaị na Finihas. Akwụkwọ Samuel kọrọ, sị: “Ụmụ Ilaị bụ ndị ikom na-abaghị n’ihe; ha amaghị Jehova.” (1 Samuel 2:12) Ihe abụọ ahụ e kwuru n’amaokwu a na-agakọ. Họfnaị na Finihas bụ “ndị ikom na-abaghị n’ihe”—nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ụmụ iberiibe”—n’ihi na ha ejighị Jehova kpọrọ ihe. O nweghị ihe ha ji ụkpụrụ ezi omume ya na iwu ya kpọrọ. Ọ bụ otu mmehie ahụ kpatara mmehie niile ọzọ ha.

Iwu Chineke kapịrị ọrụ ndị nchụàjà na ụzọ ha ga-esi na-achụ àjà n’ụlọikwuu ya ọnụ. E nwere ezi ihe kpatara nke a! Àjà ndị ahụ nọchiri anya ndokwa ndị Chineke mere iji gbaghara mmehie ka ndị mmadụ nwee ike ịdị ọcha n’anya ya, ruo eruo inweta ngọzi na nduzi ya. Ma Họfnaị na Finihas mere ka ndị nchụàjà ibe ha na-elelị nnọọ àjà a na-achụrụ Chineke. *

Were anya nke uche gị lee obere nwa bụ́ Samuel ka ọ nọ na-ele arụrụala niile a na-arụ n’ebe ahụ n’enweghị onye chọrọ ịkwụsị ya. Mmadụ ole ka ọ hụrụ—gụnyere ndị ogbenye dị umeala n’obi a na-emegbu emegbu—ka ha na-abịa n’ụlọikwuu ahụ dị nsọ, na-enwe olileanya na a ga-akasi ha obi ma wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ, ma ha ejiri obi mgbawa ma ọ bụ mmechuihu laa? Oleekwa otú obi dị ya mgbe ọ matara na Họfnaị na Finihas na-elelịkwa iwu Jehova nyere banyere mmekọahụ, n’ihi na ha na-edina ụfọdụ n’ime ndị inyom na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ? (1 Samuel 2:22) Ikekwe, ọ tụrụ anya na Ilaị ga-eme ihe banyere ya.

Ilaị nọ n’ọnọdụ kacha mma ịkwụsị nsogbu ahụ na-akawanye njọ. Dị ka nnukwu onye nchụàjà, ọ bụ ya ga-aza ajụjụ maka ihe niile a na-eme n’ụlọikwuu ahụ. Ebe ọ bụ nna, ọ bụ ọrụ ya ịgbazi ụmụ ya. A sị ka e kwuwe, ha nọ na-emejọ onwe ha, na-emejọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ná mba ahụ. Ma, Ilaị kụrụ afọ n’ala dị ka nna nakwa dị ka nnukwu onye nchụàjà. Naanị ihe o mere bụ ịbara ụmụ ya mba elu ọnụ. (1 Samuel 2:23-25) Ma ọ dị mkpa ịdọ nnọọ ụmụ ya aka ná ntị karịa otú ahụ. Ha nọ na-eme mmehie kwesịrị ọnwụ!

Nsogbu ahụ jọrọ nnọọ njọ nke na Jehova dunyere “otu onye nke Chineke,” bụ́ onye amụma a na-akpọghị aha, ka ọ gaa zie Ilaị ozi amamikpe kpụ ọkụ n’ọnụ. Jehova gwara Ilaị, sị: “I wee na-asọpụrụ ụmụ gị karịa mụ onwe m.” Chineke si otú ahụ buo amụma na ajọ ụmụ Ilaị ga-anwụ n’otu ụbọchị, nakwa na ezinụlọ Ilaị ga-ata nnukwu ahụhụ, kwụsịdị inwe ihe ùgwù nke ịbụ ndị nchụàjà. Ịdọ aka ná ntị a kpụ ọkụ n’ọnụ ò mere ka ezinụlọ ahụ gbanwee? Akụkọ ahụ ekwughị na ha gbanwere.—1 Samuel 2:27–3:1.

Olee otú omume rụrụ arụ niile a si metụta obere nwa bụ́ Samuel? Site n’oge ruo n’oge n’akụkọ ọjọọ a, anyị na-anụtụ akụkọ dị mma, ozi ọma banyere otú Samuel si na-eto ma na-eme nke ọma. Cheta na 1 Samuel 2:18 kwuru na Samuel ji ikwesị ntụkwasị obi “na-eje ozi n’ihu Jehova mgbe ọ bụ nwa okoro.” Ọbụna n’oge ahụ Samuel bụ nwata, o mere ka ndụ ya hiwe isi n’ozi ọ na-ejere Chineke. Amaokwu 21 n’isi nke 2 ahụ kwudịrị ihe na-eme obi ụtọ karị: “Nwa okoro ahụ bụ́ Samuel wee na-eto n’ebe Jehova nọ.” Ka ọ na-eto, mmekọrịta ya na Nna ya nke eluigwe chikwuru anya. Mmadụ na Jehova inwe mmekọrịta chiri anya dị otú ahụ bụ ihe e ji n’aka ga-eme ka onye ahụ ghara ime omume ọ bụla rụrụ arụ.

Ọ gaara adịrị Samuel mfe iche na ọ bụrụ na nnukwu onye nchụàjà na ụmụ ya nwere ike ime mmehie, na ya nwekwara ike ime ihe ọ bụla masịrị ya. Ma, anyị ekwesịghị ime mmehie n’ihi omume rụrụ arụ nke ndị ọzọ, gụnyere nke ndị nọ n’isi. Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-agbaso ihe nlereanya Samuel ma “na-eto n’ebe Jehova nọ”—ọbụna mgbe ụfọdụ ndị nọ ha nso na-anaghị egosi ezi ihe nlereanya.

Olee ihe ụdị ndụ ahụ rụpụtaara Samuel? Baịbụl kwuru, sị: “N’oge ahụ niile, nwa okoro ahụ bụ́ Samuel nọ na-eto, ihe ya wee na-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.” (1 Samuel 2:26) Ya mere, ihe Samuel dị nnọọ ndị mmadụ mma, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ndị na-atụ egwu Chineke. Jehova hụrụ nwata a n’anya n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ya. O doro Samuel anya na Chineke ga-eme ihe banyere ajọ omume niile a na-eme na Shaịlo, ma ikekwe ọ nọ na-ajụ n’obi ya mgbe ọ ga-abụ.

“Kwuwe, n’Ihi na Ohu Gị Na-ege Ntị”

Otu abalị, a zara ajụjụ ya. Chi abọwala, ma ọchịchịrị ka gbara; ọkụ nnukwu oriọna dị n’ụlọikwuu ahụ ka na-enwu inyoghị inyoghị. N’oge ahụ ebe niile dara jụụ, Samuel nụrụ otu olu kpọrọ aha ya. O chere na ọ bụ Ilaị, bụ́ onye merela ezigbo agadi ugbu a, fọkwa obere ka o kpuo ìsì. Samuel biliri ma “gbakwuru” agadi nwoke ahụ. Ì nwere ike iji anya nke uche gị hụ nwa okoro ahụ, ka ọ gba ụkwụ ọtọ jiri ọsọ na-aga ịhụ ihe Ilaị chọrọ? Ọ na-emetụ n’ahụ́ ịhụ na Samuel ji nkwanye ùgwù na obiọma meso Ilaị ihe. N’agbanyeghị mmehie niile Ilaị mere, ọ ka bụ nnukwu onye nchụàjà Jehova.—1 Samuel 3:2-5.

Samuel kpọtere Ilaị, sị: “Lee m, n’ihi na ị kpọrọ m.” Ma Ilaị gwara ya na ya akpọghị ya ma sị ya gaa hiwekwa ụra. Otu ihe ahụ meghachiri ugboro abụọ ọzọ! N’ikpeazụ, Ilaị ghọtara ihe na-emenụ. N’oge ahụ, Jehova anaghịzi egosikarị ndị ya ọhụụ ma ọ bụ zie ha ozi amụma, o sighịkwa ike ịhụ ihe kpatara ya. Ma Ilaị maara na Jehova amaliteghachila ịgwa ndị ya okwu—na nke ugbu a, site n’ọnụ nwa okoro a! Ilaị gwara Samuel ka ọ gaghachi dinara ala ma gwa ya otú ọ ga-esi zaa ma a kpọọ ya ọzọ. Samuel rubere isi. N’oge na-adịghị anya, ọ nụrụ olu ahụ ọzọ ka ọ na-akpọ ya, sị: “Samuel, Samuel!” Nwa okoro ahụ zara, sị: “Kwuwe, n’ihi na ohu gị na-ege ntị.”—1 Samuel 3:1, 5-10.

Jehova emechaala nweta onye na-ejere ya ozi na Shaịlo nke na-ege ya ntị. Nke ahụ ghọrọ ndụ Samuel. Ọ̀ bụ ụdị ndụ ị na-ebi? Ọ dịghị anyị mkpa ichere ka olu na-abụghị olu mmadụ gwa anyị okwu n’abalị. Taa, anyị nwere ike ịnụ olu Chineke mgbe ọ bụla. Ọ dị n’Okwu ya zuru ezu, bụ́ Baịbụl. Ka anyị na-egekwu Chineke ntị ma na-eme ihe ọ gwara anyị, otú ahụ ka okwukwe anyị ga na-esiwanye ike. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Samuel.

N’abalị ahụ na Shaịlo, ndụ Samuel gbanwere, n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ọ malitere ịmata Jehova n’ụzọ pụrụ iche, ghọọ onye amụma Chineke na ọnụ na-ekwuru ya. Na mbụ, ụjọ tụrụ nwa okoro ahụ izi Ilaị ozi Jehova, n’ihi na ọ bụ okwu amamikpe ikpeazụ na-egosi na amụma e buru banyere ezinụlọ ahụ ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ma Samuel katara obi—Ilaị jikwa obi umeala nabata ikpe Chineke. N’oge na-adịghị anya, ihe niile Jehova kwuru mezuru. Izrel gara ibuso ndị Filistia agha, e gbuokwa Họfnaị na Finihas n’otu ụbọchị. Ilaị n’onwe ya nwụrụ mgbe ọ nụrụ na e burula Igbe nsọ Jehova.—1 Samuel 3:10-18; 4:1-18.

Ma, ndị mmadụ ghọtakwuru na Samuel bụ onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi. Akụkọ ahụ kwuru na “Jehova nọnyekwaara ya,” kwuokwa na Jehova mere ka amụma niile Samuel buru mezuo.—1 Samuel 3:19.

“Samuel Wee Kpọkuo Jehova”

Ma, nke ahụ ọ̀ pụtara na ụmụ Izrel gbasoro nduzi Samuel ma bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? Mba. Ka oge na-aga, ha kpebiri na ha achọghị onye amụma nkịtị ikpe ha ikpe. Ha chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ ma nwee eze bụ́ mmadụ ga na-achị ha. Jehova gwara Samuel ka o meere ha ihe ha rịọrọ, Samuel ekweta. Ma ọ ghaghị ime ka Izrel mara otú mmehie ha jọruru ná njọ. Ọ bụghị mmadụ nkịtị ka ha jụrụ, kama, ọ bụ Jehova n’onwe ya! N’ihi ya, ọ kpọkọtara ndị Izrel na Gilgal.

Ka anyị gaghachi n’akụkọ ahụ ma hụ ihe o mere mgbe oge ruru ka ọ gwa ndị Izrel okwu ahụ dị mkpa na Gilgal. N’ebe ahụ, agadi nwoke ahụ bụ́ Samuel chetaara Izrel otú o si jee ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Akụkọ ahụ kwuziri, sị: “Samuel wee kpọkuo Jehova.” Ọ rịọrọ Jehova ka e nwee égbè eluigwe na oké mmiri ozuzo.—1 Samuel 12:17, 18.

Ànyị sịrị égbè eluigwe na oké mmiri ozuzo? N’oge ọkọchị? Ma, ụdị ihe a emetụbeghị! Ya bụrụgodị na ndị Izrel na-enwetụ obi abụọ ma ọ bụ na-akwa Samuel emo, ha emeteghị ya aka. Na mberede, ihu ígwé gbajiri. Ifufe rojiwere ọka wit ndị dị n’ubi. Égbè eluigwe malitere ịgba, na-agbachi ndị mmadụ ntị. Mmiri ezowe. Olee ihe ndị ahụ mere? “Ndị Izrel niile wee tụọ Jehova na Samuel egwu nke ukwuu.” Ha mechara hụ otú mmehie ha jọruru ná njọ.—1 Samuel 12:18, 19.

Ọ bụ Jehova Chineke mere ihe ruru ndị nnupụisi ahụ n’obi, ọ bụghị Samuel. Malite mgbe Samuel bụ nwata ruo mgbe o mere agadi, o nwere okwukwe na Chineke. Jehova gọzikwara ya. Ruo ugbu a, Jehova agbanwebeghị. Ọ ka na-akwado ndị na-eṅomi okwukwe Samuel.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ndị Naziraịt na-ekwe nkwa nke na-eme ka ha ghara ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ kpụọ isi ha. Ihe ka ọtụtụ na-eme nke ahụ ruo naanị oge a kapịrị ọnụ, ma ole na ole, dị ka Samsịn, Samuel, na Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ ndị Naziraịt ná ndụ ha niile.

^ par. 12 Ebe nsọ ahụ bụ ihe owuwu nwere akụkụ anọ. Ihe bụ́ isi e ji rụọ ya bụ osisi, jirikwa nnukwu ákwà ụlọikwuu kpuchie ya. Ma, e ji ihe ndị kasị mma e nwere n’oge ahụ rụọ ya—akpụkpọ anụ sil, ákwà ndị a kpara ihe ndị mara mma na ha, na osisi ndị dị oké ọnụ ahịa e ji ọlaọcha na ọlaedo machie. Ebe nsọ ahụ dị n’ogige nwere akụkụ anọ, o nwekwara otu nnukwu ebe ịchụàjà. O doro anya na ka oge na-aga, a rụnyere ọnụ ụlọ ndị ọzọ n’akụkụ ụlọikwuu ahụ maka ndị nchụàjà. O yiri ka Samuel ọ̀ na-ehi n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị dị otú ahụ.

^ par. 16 Akụkọ ahụ kwuru ụzọ abụọ ha si lelịa àjà a na-achụrụ Chineke. Otu bụ na Iwu ahụ kwuru kpọmkwem ebe ndị a ga-enye ndị nchụàjà n’anụ e ji chụọ àjà ka ha rie. (Diuterọnọmi 18:3) Ma, ajọ ndị nchụàjà ahụ na-eme ihe dị iche n’ụlọikwuu ahụ. Ha na-edunye ndị na-ejere ha ozi ka ha dụnye nnukwu ndụdụ n’ite mgbe a ka na-esi anụ esi, na-ewere ihe ọ bụla dị mma ndụdụ ahụ dụtara! Nke ọzọ bụ na mgbe ndị mmadụ wetara àjà ka a chụọrọ ha n’ebe ịchụàjà, ajọ ndị nchụàjà ahụ na-edunye onye na-ejere ha ozi ịmaja onye na-achụ àjà ahụ, na-esi ọnwụ ka e nye ya anụ ndụ ọbụna tupu a chụọrọ Jehova abụba ya n’àjà.—Levitikọs 3:3-5; 1 Samuel 2:13-17.

[Foto dị na peeji nke 17]

N’agbanyeghị ụjọ tụrụ Samuel, o ziri Ilaị kpọmkwem ozi ikpe ọmụma Jehova

[Foto dị na peeji nke 18]

Samuel ji okwukwe kpee ekpere, Jehova jikwa égbè eluigwe na oké mmiri ozuzo zaa ya