Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú I Nwere Ike Isi Lụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma Ọgụ?

Olee Otú I Nwere Ike Isi Lụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma Ọgụ?

Olee Otú I Nwere Ike Isi Lụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma Ọgụ?

ÒNWERE mgbe gị na echiche na-adịghị mma na-alụ? Ò nwekwaranụ onye ọ na-emetụbeghị? Ihe isi ike, ime ihe ike na ikpe na-ezighị ezi juru ebe niile n’oge anyị a. Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị na-enwe oké mwute, na-ata onwe ha ụta gabiga ókè, ma na-eche na ha abaghị uru.

Ụdị echiche ndị ahụ adịghị mma. Ha nwere ike ime ka obi daa anyị mbà, ka anyị ghara iche echiche nke ọma, napụkwa anyị ọṅụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) Ike na ume anyị dị anyị mkpa iji na-adị ndụ n’ụwa a nsogbu juru. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịchịkwa echiche na-adịghị mma. *

Baịbụl kwuru ụfọdụ ihe dị mkpa ga-enyere anyị aka ịlụso echiche ndị na-adịghị mma ọgụ. Jehova Chineke, Onye kere ihe niile na Onye ji ihe niile ndụ, achọghị ka anyị daa mbà n’obi n’ihi obi nkoropụ na enweghị olileanya. (Abụ Ọma 36:9) N’ihi ya, ka anyị tụlee ụzọ atọ Okwu ya nwere ike isi nyere anyị aka imeri echiche ndị na-adịghị mma.

Mara na Chineke Nwere Mmasị n’Ebe Ị Nọ

Ụfọdụ ndị chere na Chineke ji nnọọ ọrụ n’aka nke na o nweghị efe ịma otú obi dị anyị. Ị̀ na-eche otú ahụ? N’ezie, Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Onye Okike anyị na-achọ ịma otú obi dị anyị. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi ịmara na Ọkaakaa pụrụ ime ihe niile nọ anyị nso mgbe obi na-erughị anyị ala!

Chineke abụghị onye obi ọjọọ nke na-enweghị mmasị n’ebe anyị nọ. Baịbụl kwuru na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụkwa ya n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel na-agba ohu n’Ijipt ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, ọ sịrị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe. M na-agbada ịga napụta ha.”—Ọpụpụ 3:7, 8.

Chineke maara nnọọ otú obi na-adị anyị mgbe anyị nọ ná nsogbu. A sị e kwuwe, “ọ bụ ya kere anyị, ọ bụghị anyị kere onwe anyị.” (Abụ Ọma 100:3) Ya mere, ọbụna mgbe anyị chere na ụmụ mmadụ ibe anyị aghọtaghị anyị, anyị nwere ike ijide n’aka na Chineke ghọtara anyị. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ, n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Chineke na-ahụdị ihe dị anyị n’ala ala obi.

N’ezie, Jehova makwaara mmehie na njehie anyị. Ma obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ na Onye Okike anyị hụrụ anyị n’anya na-agbaghara mmehie. Devid, onye so ná ndị Chineke nyere mmụọ nsọ ide Baịbụl, kwuru, sị: “Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:13, 14) Chineke na-ahụ anyị karịa otú anyị na-ahụ onwe anyị. Ọ na-achọ ebe ndị anyị na-emezi emezi ma na-eleghara ebe ndị anyị na-emejọ, ma ọ bụrụhaala na anyị echegharịa ná mmehie anyị.—Abụ Ọma 139:1-3, 23, 24.

N’ihi ya, mgbe ọ bụla obi anyị gwawara anyị na anyị abaghị uru, ọ dị mkpa ka anyị kpebisie ike iwepụ ụdị echiche ahụ n’obi anyị. Anyị aghaghị icheta otú Chineke si ele anyị anya!—1 Jọn 3:20.

Mee Ka Gị na Chineke Bụrụ Ezigbo Enyi

Olee uru anyị ịhụ onwe anyị otú Chineke si ahụ anyị na-abara anyị? Ọ ga-adịkwuru anyị mfe ime ihe ọzọ ọ dị anyị mkpa ime iji merie echiche ndị na-adịghị mma—ịghọ ezigbo enyi Chineke. Nke ahụ ọ̀ ga-ekwe nnọọ omume?

Dị ka Nna hụrụ anyị n’anya, ọ na-agụ Jehova Chineke agụụ inyere anyị aka ịghọ ezi ndị enyi ya. Baịbụl na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Otu eziokwu na-atụ n’anya anyị kwesịrị iburu n’uche bụ: N’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie na-adịghị ike, anyị nwere ike ịghọ ezi ndị enyi Ọkaakaa eluigwe na ụwa.

Chineke ejirila Baịbụl kọwaa onwe ya ka anyị nwee ike ịmara onye ọ bụ. Ọ bụrụ na anyị na-agụchi Baịbụl anya, anyị nwere ike ịmata àgwà Chineke ndị magburu onwe ha. * Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị ahụ anyị matara, anyị ga na-abịarukwu Jehova nso. Anyị ga na-aghọtakwu ụdị onye ọ bụ n’ezie—Nna nwere obi ebere nke hụrụ anyị n’anya.

Ichemi echiche echemi banyere ihe ndị anyị gụtara na Baịbụl nwere uru ọzọ ọ na-abara anyị. Anyị na-abịarukwu Nna anyị nke eluigwe nso site n’ime ka echiche ya bamie n’uche na n’obi anyị, kwe ka ha gbazie anyị, kasie anyị obi ma duzie anyị. Ọ dị anyị mkpa karịchaa ime nke ahụ mgbe anyị na echiche ndị na-adịghị mma na-alụ. Otu ọbụ abụ si otú a kwuo ya: “Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.” (Abụ Ọma 94:19) Okwu Chineke nwere nnọọ ike ịkasi anyị obi. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala nabata eziokwu ya, anyị nwere ike ịchọpụta na nkasi obi na obi iru ala nke naanị Chineke nwere ike inye ga-eji nwayọọ nwayọọ nọchie echiche ndị na-adịghị mma anyị na-eche. Jehova na-esi otú ahụ agụgụ anyị otú nna hụrụ nwa ya n’anya nwere ike isi gụgụọ ya mgbe ọ na-ebe ákwá ma ọ bụ mgbe obi na-adịghị ya mma.

Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọ ndị enyi Chineke bụ ịgwa ya okwu mgbe niile. Baịbụl mesiri anyị obi ike na “ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ [Chineke] dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) N’agbanyeghị ụjọ ma ọ bụ nchegbu anyị nwere ike inwe, anyị nwere ike ikpegara Chineke ekpere ma rịọ ya ka o nyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị agwa Chineke obi anyị, obi ga-eru anyị ala. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ka ị na-agụchi Baịbụl anya, na-atụgharị uche na ya, na-ekpekwa ekpere, o doro anya na ị na-eme ka mmekọrịta gị na Nna gị nke eluigwe sikwuo ike. Mmekọrịta ahụ bụ ihe dị mkpa ga-enyere anyị aka imeri echiche ndị na-adịghị mma. Olee ihe ọzọ nwere ike inyere anyị aka?

Lekwasị Anya n’Olileanya E Ji n’Aka Maka Ọdịnihu

Ọbụna mgbe anyị nọ n’oké ihe isi ike, anyị nwere ike ịnọgide na-eche ihe ndị dị mma. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Chineke mere ka anyị nwee olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. Pita onyeozi si otú a chịkọta olileanya ahụ magburu onwe ya: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Olee ihe nke ahụ pụtara?

Okwu bụ́ “eluigwe ọhụrụ” pụtara nnọọ ọchịchị—Alaeze eluigwe Chineke nke dị n’aka Jizọs Kraịst. “Ụwa ọhụrụ” pụtara òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ bi n’ụwa bụ́ ndị ihe ha dị Chineke mma. N’oge ọchịchị “eluigwe ọhụrụ” ahụ, òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ ahụ agakwaghị enwe ihe ọ bụla ga-eme ka ha na-eche echiche ndị na-adịghị mma. Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-adị ndụ mgbe ahụ, o mesiri anyị obi ike na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

O doro anya na ị ga-ekweta na okwu ndị ahụ na-eme obi ụtọ ma na-agba ume. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ olileanya Chineke mere ka ezi Ndị Kraịst nwee “olileanya ahụ nke na-enye obi ụtọ.” (Taịtọs 2:13) Ọ bụrụ na anyị emee ka uche anyị dịrị ná nkwa ndị Chineke kwere ụmụ mmadụ maka ọdịnihu—nakwa ihe ndị mere nkwa ndị ahụ ji bụrụ ihe e ji n’aka na ihe ga-eme eme—anyị ga-ewepụ echiche ndị na-adịghị mma n’obi anyị.—Ndị Filipaị 4:8.

Baịbụl ji olileanya nzọpụta anyị tụnyere okpu agha. (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) N’oge ochie, onye agha agaghị anwa anwa gaa agha n’ekpughị okpu agha ya. Ọ maara na ọ ga-eme ka ọtụtụ ihe a kụrụ ya n’isi ghara ịfụ ya oké ụfụ ma kụpụ ọtụtụ akụ́ ụta a gbara ya ka ha ghara imerụ ya ahụ́. Dị nnọọ ka okpu agha na-echebe isi mmadụ, otú ahụ ka olileanya na-echebe obi anyị. Iche ihe ndị ga-eme ka anyị nwee olileanya nwere ike ime ka anyị ghara ichewe echiche ndị na-adịghị mma, bụ́ ndị na-eme ka ụjọ na-atụ anyị ma na-akụda anyị obi.

Ya mere, mmadụ nwere ike ịlụso echiche ndị na-adịghị mma ọgụ. I nwere ike ime ya! Na-atụgharị uche banyere otú Chineke si ele gị anya, na-abịarukwu ya nso, ma lekwasị anya n’olileanya i nwere maka ọdịnihu. I mee otú ahụ, i nwere ike ijide n’aka na ị ga-ahụ mgbe echiche ndị na-adịghị mma ga-akwụsị kpamkpam!—Abụ Ọma 37:29.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 O nwere ike ịdị mkpa ka ndị na-enwe oké ịda mbà n’obi ruo ogologo oge gaa kpọtụrụ dọkịta ma nke a na-akọ.—Matiu 9:12.

^ par. 14 Ụlọ Nche August 1, 2009, nwere usoro ọgụgụ Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịgụ Baịbụl.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

“M maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.”​—ỌPỤPỤ 3:7, 8

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

“Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.”​—ABỤ ỌMA 94:19

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

“Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.”​—NDỊ FILIPAỊ 4:7

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20, 21]

Amaokwu Ndị Na-akasi Obi Kwuru Banyere Jehova Chineke

“Jehova, Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.”—ỌPỤPỤ 34:6.

“Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 IHE E MERE 16:9.

“Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—ABỤ ỌMA 34:18.

“Gị onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.”—ABỤ ỌMA 86:5.

“Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ, ebere ya na-erutekwa ọrụ ya niile.”—ABỤ ỌMA 145:9.

“Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—AỊZAYA 41:13.

“Ka . . . Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile bụrụ onye a gọziri agọzi.”—2 NDỊ KỌRỊNT 1:3.

“Anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike n’ihu ya banyere ihe ọ bụla obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe na ya, n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.”—1 JỌN 3:19, 20.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ha Na-emeri n’Ọgụ Ha Na-alụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma

“Nna m bụ onye aṅụrụma, ọ kpatakwarala m ọtụtụ ahụhụ. Kemgbe m maara ihe, m na-ele onwe m anya dị ka onye na-abaghị uru. Ma, mgbe m kwetara ka Onyeàmà Jehova mụwara m Baịbụl, m mụtara banyere nkwa ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Olileanya a mere ka ọṅụ ju m obi. M malitere ịgụchi Baịbụl anya. Baịbụl na-anọ m nso mgbe niile. Mgbe echiche ndị na-adịghị mma batara m n’obi, m na-ewere ya gụọ amaokwu ndị na-akasi obi. Ịgụ banyere àgwà ndị magburu onwe ha Chineke nwere na-eme ka obi sie m ike na m dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Kátia, nwaanyị dị afọ iri atọ na atọ. *

“Ịṅụ mmanya na-aba n’anya, wii wii, koken a na-ekuru n’imi na nke a na-aṅụ aṅụ, na ụdị ọgwụ ike ndị ọzọ, riri m ahụ́. Mgbe ihe niile m nwere gwụrụ, m ghọrọ onye arịrịọ. Ma, mgbe m kwere ka Ndịàmà Jehova mụwara m Baịbụl, m gbanwere ndụ m kpamkpam. Mụ na Chineke bịara dị n’ezigbo mma. N’agbanyeghị na obi m ka na-ama m ikpe, mụ ana-echekwa na abaghị m uru, m mụtala ịtụkwasị obi ebere na ịhụnanya Chineke obi. Eji m n’aka na Chineke ga-anọgide na-enye m ike imeri echiche ndị na-adịghị mma. Ịmụta eziokwu Baịbụl bụ ihe kacha mma metụụrụla m.”—Renato, nwoke dị afọ iri atọ na asaa.

“Malite mgbe m dị obere, m na-eji onwe m atụnyere deede m. M na-eche mgbe niile na ọ ka m mma. Onwe m ejuwebeghị m afọ, obi esibeghịkwa m ike na o nwere ihe m ga-emeli n’onwe m. Ma, ekpebisiela m ike imeri nsogbu a. M kpegarala Jehova ekpere n’esepụghị aka, o meekwala ka m kwụsị ile onwe m anya ka onye na-abaghị uru. Ọ na-enye m obi ụtọ ịmara na Chineke hụrụ m n’anya n’ezie ma na-eche banyere m!”—Roberta, nwaanyị dị afọ iri anọ na ise.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 45 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.