Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Njem Gaa n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa

Ime Njem Gaa n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa

Otú Ndụ Dị n’Oge Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ

Ime Njem Gaa n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa

“N’echi ya, ya na Banabas gawara Dabe. Mgbe ha zisasịịrị obodo ahụ ozi ọma, meekwa ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha laghachiri na Listra, na Aịkoniọm, na Antiọk.”—ỌRỤ 14:20, 21.

IKUKU isi ụtụtụ na-ekusa otu onye njem. N’agbanyeghị na ike gwụrụ ya, o jisiri ike yiri akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji ụkwụ mee ogologo njem ọzọ taa.

Ka anwụ na-awapụta n’ụtụtụ ahụ, ọ banyere n’okporo ụzọ dị uzuzu uzuzu si n’ubi vaịn gafee, gafere ubi oliv, ma gawa n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ka ọ na-aga, o zutere ndị njem ndị ọzọ—ndị ọrụ ugbo ji ụkwụ na-aga n’ugbo ha, ndị ahịa kpụ anụmanụ bú nnukwu ngwá ahịa, na ndị na-aga ememme na Jeruselem. Onye njem ahụ na ndị ha na ya so na-agwa onye ọ bụla ha hụrụ okwu. Gịnị bụ ebumnobi ha? Ọ bụ ịrụzu ọrụ ahụ Jizọs nyere ha ịbụ ndịàmà ya ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8.

Onye njem a nwere ike ịbụ Pọl onyeozi ma ọ bụ Banabas ma ọ bụ otu n’ime ndị narị afọ mbụ nwere obi ike na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ. (Ọrụ 14:19-26; 15:22) Ha bụ ndị obi siri ike na-ejighị ozi ha egwuri egwu. Ime njem n’oge ahụ siri ike. Mgbe Pọl onyeozi na-akọwa nsogbu ndị o nwere mgbe ọ na-eme njem n’oké osimiri, o dere, sị: “Ugboro atọ ka ụgbọ m nọ na ya kpuru, otu ụbọchị, ka m nọrọ n’ogbu mmiri.” Ime njem n’elu ala akaghị mfe. Pọl kwuru na ya nọrọ “n’ihe ize ndụ n’osimiri” nọọkwa “n’ihe ize ndụ n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe n’okporo ụzọ.”—2 Ndị Kọrịnt 11:25-27.

Olee otú iso ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ mee njem gaara adị? Kilomita ole ka unu ga-aga n’ụbọchị? Olee ihe ndị ọ ga-adị mkpa ka i were, oleekwa ebe unu ga na-ehi n’ụzọ?

Njem Elu Ala Na narị afọ mbụ, ndị Rom arụọla ọtụtụ okporo ụzọ jikọtara obodo ndị a ma ama n’alaeze ukwu ahụ. A kpachapụrụ anya tụọ ụkpụrụ ụzọ ndị ahụ ma rụsie ha ike. Ọtụtụ n’ime ha dị mita anọ na ọkara n’obosara, e tee ha etee, doo okwute n’akụkụ ha abụọ, gwunyekwa nkume ndị e ji agụ maịl na ha. N’okporo ụzọ dị otú ahụ, onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, dị ka Pọl, ga-ejili ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita iri atọ na abụọ n’ụbọchị.

Ma, ihe ka ọtụtụ n’okporo ụzọ ndị e nwere na Palestaịn bụ okporo ụzọ dị uzuzu uzuzu ma dị ize ndụ, ndị na-enweghịkwa ihe kewara ha na ubi na ndagwurugwu. Onye njem nwere ike izute anụ ọhịa, ma ọ bụ ndị ohi; n’ezie, ụzọ nwere nnọọ ike imechi emechi.

Olee ihe ndị onye njem ga-eji mgbe ọ na-eme njem? Ụfọdụ ihe ndị ga-adị ya mkpa bụ mkpara ọ ga-eji chebe onwe ya (1), ute (2), akpa ego (3), akpụkpọ ụkwụ ọ ga-eji gbanwee nke o yi (4), akpa nri (5), uwe ọ ga-eji jigharịa (6), bọket akpụkpọ anụ ọ ga-eji na-esere mmiri n’olulu mmiri ndị dị n’ụzọ (7), karama mmiri (8), na nnukwu akpa akpụkpọ anụ ọ ga-eji buru ngwongwo ya (9).

Ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ ga-ezuterịrị ndị na-agba ahịa, bụ́ ndị na-aga n’ahịa dị iche iche e nwere n’obodo ndị ahụ ere ngwá ahịa ha. Ihe ndị ahịa ahụ na-eji ebu ngwá ahịa ha bụ ịnyịnya ibu ndị ụkwụ siri ike n’ala. O nweghị anụmanụ na-ama ha aka n’ụzọ ndị bụ́ ugwu ugwu na okwute okwute. A kọrọ na ịnyịnya ibu bujuru ibu ebuju ga-agali ihe ruru kilomita iri asatọ n’ụbọchị. Ụgbọ ịnyịnya ibu na nke oké ehi na-adọkpụ anaghị agasi ike otú ahụ, ha na-aga naanị ihe dị ka kilomita asatọ ruo iri abụọ. Ma, oké ehi nwere ike ibu ibu karịa ịnyịnya ibu, ọ na-akakwa mma iji ha aga njem ndị na-adịghị ogologo. Onye njem nwere ike ịgafe ìgwè kamel ma ọ bụ ịnyịnya ibu na-eme njem—bụ́ ọtụtụ anụmanụ bujuru ngwá ahịa si n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Onye ozi na-agba ịnyịnya nwere ike ikwofere onye njem ahụ; ọ na-ebu ozi na iwu ndị eze nyere ka e nye ndị agha na-eche alaeze ukwu ahụ nche.

Mgbe chi jiri, ndị njem na-ehi n’akụkụ ụzọ n’ụlọikwuu ndị ha rụrụ ọkụ ọkụ. Ụfọdụ nwere ike ihi n’ụlọ ndị njem a gbara ogige. Ebe ndị a ruru unyi, na-adịghị mma, anaghị egbochicha mmiri, oyi ma ọ bụ ndị ohi ịbata n’ebe mmadụ hiri. Mgbe ọ bụla o kwere ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ mee, ha na-ehi na nke ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe ha mgbe ha na-eme njem—Ọrụ 17:7; Ndị Rom 12:13.

Njem Osimiri Obere ụgbọ na-ebufe ndị mmadụ na ngwá ahịa n’obere osimiri nakwa n’Oké Osimiri Galili. (Jọn 6:1, 2, 16, 17, 22-24) Ọtụtụ ụgbọ ndị ka buo ibu na-agba n’Oké Osimiri Mediterenian, na-ebuga ndị mmadụ na ngwá ahịa n’ọdụ ụgbọ mmiri dị iche iche dị anya. Ụgbọ ndị a na-ebutere ndị Rom ihe oriri ma na-ebuga ndị ọrụ obodo n’ọdụ ụgbọ mmiri dị iche iche, na-ezigakwa ozi n’ebe ndị ahụ.

Ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-adabere n’ihe ndị a na-ahụ anya akwọ ụgbọ mmiri ha—n’ehihie, ha na-eji ihe nhụwa ama, n’abalị, ha ejiri kpakpando. N’ihi ya, njem ụgbọ mmiri na-aka mma naanị n’agbata ọnwa Mee na etiti Septemba. Ụgbọ na-ekpukarị.—Ọrụ 27:39-44; 2 Ndị Kọrịnt 11:25.

Ihe mere ndị mmadụ ji ahọrọ ime njem n’oké osimiri abụghị na ọ na-eru ahụ́ ala karịa njem elu ala. Ahụ́ anaghị eru nnọọ ndị njem ala n’ụgbọ mmiri na-ebu ngwá ahịa, bụ́kwanụ ihe a kacha eji eme njem n’osimiri. Ndị njem na-ebi ma na-ehi n’ala ụgbọ mmiri ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha. A na-akwakọju ngwá ahịa ndị dị oké ọnụ ahịa n’okpuru ụgbọ mmiri ahụ na-adị kọrọ kọrọ. Ndị njem na-eri nri ndị ha wetara. Ọ bụ naanị mmiri ọṅụṅụ ka a na-enye ha. Mgbe ụfọdụ, ihu ígwé na-ajọ oké njọ. Oké ifufe na ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị na-akpatara ndị nọ n’ụgbọ mmiri ọrịa, mgbe ụfọdụ ha na-arịakwa ya ruo ọtụtụ ụbọchị.

N’agbanyeghị ihe isi ike dị na njem elu ala na nke oké osimiri, ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, dị ka Pọl, gbasara ‘ozi ọma nke alaeze’ ruo n’ebe dị anya n’ụwa nke oge ahụ. (Matiu 24:14) Naanị afọ iri atọ Jizọs gwachara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbaa àmà banyere ya, Pọl dere na a na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.