Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Saa Anya na Mmiri Họrọ Ndị Enyi Gị

Saa Anya na Mmiri Họrọ Ndị Enyi Gị

Nke 4

Saa Anya na Mmiri Họrọ Ndị Enyi Gị

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI? “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”—Ilu 13:20.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ndị enyi anyị ga-eme ka anyị nwekwuo afọ ojuju ma ọ bụ mee ka anyị ghara inwe ya. Àgwà ha na ihe ndị ha na-ekwu ga-emetụtarịrị otú anyị si ele ndụ anya.—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị ikom iri na abụọ si iledo ala Kenan lọta. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha nọ “na-akọrọ ụmụ Izrel akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ ha ledoro.” N’agbanyeghị nke ahụ, mmadụ abụọ n’ime ha kwuru okwu ọma banyere Kenan, kpọọ ya nnọọ “ezi ala.” Ma okwu ọjọọ nke ndị nledo iri ahụ gbasara n’etiti ndị Izrel. Akụkọ ahụ kwuru, sị: “Nzukọ ahụ dum wee malite ibe ákwá, . . . Ụmụ Izrel niile wee malite ịtamu ntamu.”—Ọnụ Ọgụgụ 13:30–14:9.

Taakwa, ọtụtụ ndị bụ “ndị na-atamu ntamu, ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ.” (Jud 16) Ọ na-esi ike inwe afọ ojuju mgbe mmadụ na ndị na-enweghị afọ ojuju na-akpa.

OLEE IHE I NWERE IKE IME? Tụlee mkparịta ụka gị na ndị enyi gị. Ndị enyi gị hà na-etukarị ọnụ banyere ihe ndị ha nwere, ka hà na-emekarị mkpesa banyere ihe ndị ha na-enweghị? Oleekwa ụdị enyi ị bụụrụ ha? Ị̀ na-agba mbọ ime ka ndị enyi gị na-achọ ịdị ka gị, ka ị̀ na-agba ha ume inwe afọ ojuju n’ihe ha nwere?

Tụlee ihe nlereanya Devid, bụ́ onye na-aga ịghọ eze, na Jọnatan, bụ́ nwa Eze Sọl. Devid bi n’ọzara n’ihi na ọ na-agba ọsọ ndụ. Eze Sọl na-enwere Devid anyaụfụ n’ihi na o chere na Devid ga-anaghara ya ọkwá, ya achọọkwa igbu Devid. Ọ bụ ezie na Jọnatan gaara anọchi nna ya dị ka eze, ọ bụ ezigbo enyi Devid. Jọnatan ghọtara na ọ bụ Devid ka Chineke họpụtara ịnọchi Sọl nna ya dị ka eze, ịkwado enyi ya jukwara ya afọ.—1 Samuel 19:1, 2; 20:30-33; 23:14-18.

Ndị enyi dị ka Jọnatan dị gị mkpa, bụ́ ndị na-agba mbọ inwe afọ ojuju ma na-echere gị echiche ọma. (Ilu 17:17) N’ezie, ị chọọ inweta ụdị ndị enyi ahụ, ị ga-enwekwa ụdị àgwà ndị ahụ.—Ndị Filipaị 2:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị enyi gị hà na-eme ka i nwekwuo afọ ojuju ka hà na-eme ka ị ghara inwe ya?