Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Ike Ịhụ Ndị Bụ́ Mmụọ Anya?

È Nwere Ike Ịhụ Ndị Bụ́ Mmụọ Anya?

È Nwere Ike Ịhụ Ndị Bụ́ Mmụọ Anya?

Ọ SỌKWA gị lewe anya n’eluigwe site taa ruo echi, ọ dịghị mmụọ ị ga-ahụ. Geekwa ntị, ọ dịghị nke ị ga-anụ olu ya. Ma, o nwere ike ịbụ na o doro gị anya na ndị bụ́ mmụọ dị adị. Ha maara nnọọ ihe ma dị ike, onye nke ọ bụla n’ime ha nwekwara aha na àgwà nke ya. Ụfọdụ n’ime ha na-emere anyị ihe ọma; ndị nke ọzọ na-achọ ime anyị ihe ọjọọ. Ha niile chọrọ ịbịa anyị nso.

Ezi Chineke n’onwe ya bụ Mmụọ. (Jọn 4:24) O nwere aha pụrụ iche nke mere ka ọ dị iche n’ọtụtụ chi ụgha ndị e nwere. Aha ya bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Otu ọbụ abụ dere, sị: “Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya. E kwesịrị ịtụ ya egwu karịa chi niile ọzọ. N’ihi na chi niile nke ndị dị iche iche bụ chi na-abaghị uru; ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe. Ebube na ịma mma dị n’ihu ya; ike na ịma mma dị n’ebe nsọ ya.”—Abụ Ọma 96:4-6

Ọhụụ nke Ezi Chineke

Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Anyị enweghị ike ịghọta ọdịdị ya na ịma mma ya, otú ahụ onye kpuru ìsì site n’afọ nne ya na-enweghị ike ịghọta otú ihe dị iche iche na-acha. Ma, n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, Chineke ji ihe ndị anyị nwere ike ịhụ anya kọwaara anyị ihe ndị anyị na-enweghị ike ịhụ anya, dị nnọọ ka ezigbo onye nkụzi na-eji okwu ụmụ akwụkwọ ga-aghọta akọwara ha ihe ndị siri ike. Jehova ji ọhụụ ndị o ji mmụọ nsọ ya gosi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie enyere anyị aka ịghọta otú ebe obibi ya n’eluigwe dị na ihe jikọrọ anyị na ndị bi n’ebe ahụ.

Dị ka ihe atụ, e ji ọkụ, ìhè, nkume safaya, na eke na egwurugwu kọwaa ebube Jehova n’otu ọhụụ e gosiri Ezikiel. N’ọhụụ ọzọ, Jọn onyeozi hụrụ ka Jehova nọ n’ocheeze ya ma kwuo na Chineke “na-egbuke dị ka nkume jaspa na nkume dị oké ọnụ ahịa nke na-acha ọbara ọbara,” kwuokwa na “eke na egwurugwu nke na-egbuke dị ka emerad gbakwara ocheeze ahụ gburugburu.” Nkọwa ndị dị otú ahụ na-eme ka anyị mara na ebe Jehova nọ mara ezigbo mma, na-egbuke egbuke ma dị jụụ.—Mkpughe 4:2, 3; Ezikiel 1:26-28.

Daniel onye amụma hụkwara ọhụụ banyere Jehova. N’ọhụụ ahụ, ọ hụrụ “iri puku kwuru iri puku ndị [mmụọ ozi] guzo n’ihu [Jehova].” (Daniel 7:10) Ọ ga-abụrịrị na nke ahụ tụrụ ya n’anya! Ịhụ otu mmụọ ozi, ya bụrụgodị n’ọhụụ, dị ịtụnanya, ma ya fọdụzie ịhụ iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi zuru okè!

A kpọrọ ndị mmụọ ozi aha ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị ugboro anọ na Baịbụl, ndị seraf na ndị cherọb sokwa n’ime ha. Okwu Grik na okwu Hibru a sụgharịrị “mmụọ ozi” na Baịbụl pụtachara “onye ozi.” N’ihi ya, ndị mmụọ ozi na ibe ha na-ekwurịta okwu, ha na ụmụ mmadụ kwurịtakwara okwu n’oge ndị gara aga. Ndị mmụọ ozi abụghị ụmụ mmadụ dịburu ndụ n’ụwa. Jehova kere ndị mmụọ ozi a ogologo oge gara aga tupu ya ekee mmadụ.—Job 38:4-7.

N’ọhụụ ahụ Daniel hụrụ, ìgwè ndị mmụọ ozi zukọrọ ikiri otu ihe pụrụ iche merenụ. Daniel hụziri “onye yiri nwa nke mmadụ” ka ọ na-abịa ocheeze Jehova nso ka e nye ya “ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.” (Daniel 7:13, 14) “Nwa nke mmadụ” ahụ, bụ́ onye na-arụ ọrụ dị mkpa n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, bụ Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ onye e nyere ikike ịchị ụwa niile. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị ya ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ niile ma mee ka ọrịa, iru uju, mmegbu, ịda ogbenye, na ọbụna ọnwụ kwụsị.—Daniel 2:44.

O doro anya na eze e chiri Jizọs mere ìgwè ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-echere ụmụ mmadụ echiche ọma, oké obi ụtọ. Ma, ọ dị mwute na ọ bụghị ndị mmụọ niile ka obi dị mma.

Ndị Iro nke Chineke na Mmadụ

N’oge na-adịghị anya e kechara ụmụ mmadụ, otu n’ime ndị mmụọ ozi, nke chọsiri ike ka e fee ya ofufe, gbara Jehova mgba okpuru ma mee onwe ya Setan, nke pụtara “Onye mmegide.” Onye bụ́ onyeisi ihe ọjọọ, bụ́ Setan, na-emegide nnọọ Jehova, onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya. Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sooro Setan nupụ isi. Baịbụl kpọrọ ha ndị mmụọ ọjọọ. Dị ka Setan, ndị mmụọ ọjọọ ahụ ghọrọ ndị iro obi tara mmiri nke ụmụ mmadụ. Ọ bụ ha kpatara ọtụtụ ahụhụ dị n’ụwa, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, ịda ogbenye, na agha.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ chọọchị Krisendọm anakwaghị ekwucha banyere Setan, akwụkwọ Baịbụl bụ́ Job mere ka anyị ghọta onye mmụọ ozi a nupụrụ isi bụ na ihe bụ́ ebumnobi ya. O kwuru, sị: “O ruru otu ụbọchị, ụmụ ezi Chineke bịara guzo n’ihu Jehova, ọbụna Setan batara kpọmkwem n’etiti ha.” N’ụka Setan na Chineke kparịtaziri, Setan ji ịka anya kwuo na ihe mere Job ji efe Chineke bụ naanị n’ihi ihe ndị ọ na-enweta n’aka Jehova. Iji gosi na ebubo ya ziri ezi, Setan kpataara Job oké nsogbu, gbuo anụ ụlọ ya niile na ụmụ iri ọ mụrụ. Mgbe o mechara nke ahụ, o mere ka etuto ọjọọ too Job n’ahụ́ ya niile. Ihe niile a Setan mere emeghị ka ebubo ya bụrụ eziokwu.—Job 1:6-19; 2:7.

E nwere ezigbo ihe mere Jehova ji kwe ka Setan nọrọ kemgbe, ma ọ gaghị ekwe ka ọ nọgide ruo ebighị ebi. N’oge na-adịghị anya, a ga-ewepụ Ekwensu. E meelarị ihe mbụ gosiri na nke a bụ eziokwu, a kọwakwara ya n’akwụkwọ Mkpughe, bụ́ ebe e mere ka anyị mara ihe ọzọ dị mkpa merenụ n’eluigwe bụ́ nke anyị na-agaraghị ama ma a sị na a kọwaraghị anyị ya. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel [Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ] na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ [Setan] agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, ohere adịghịrị ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya.”—Mkpughe 12:7-9

Ị̀ hụrụ na e kwuru na Setan “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” Ọ na-eduhie ndị mmadụ site n’ime ka a na-ezi ozizi ụgha n’okpukpe dị iche iche iji mee ka ha jụ Jehova na Okwu ya. Otu ụgha ọ na-agha bụ na onye ọ bụla nwụrụnụ na-agafe n’ebe ndị mmụọ bi. E nwere ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si kwere nke a. Dị ka ihe atụ, n’Afrịka na n’Eshia, ọtụtụ ndị kweere na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-aga n’ala mmụọ, bụ́ ebe ndị nna nna ya hà bi. Ozizi pọgatrị na ọkụ ala mmụọ gbakwasịkwara ụkwụ n’ozizi bụ́ na mmadụ na-anọgide ndụ mgbe ọ nwụchara.

Mmadụ Nwụọ Ọ̀ Na-aga Eluigwe?

Oleekwanụ maka ihe ahụ ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa kweere, nke bụ́ na ndị ọma niile na-aga eluigwe? Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị ọma na-aga eluigwe, ma ọnụ ọgụgụ ha dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ ijeri mmadụ nwụrụla anwụ. Baịbụl gosiri na ọ bụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ka ‘a ga-esi n’ụwa zụta,’ nakwa na ha ga-abụ “ndị nchụàjà,” na ha “ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3) Ha na Nwa nke mmadụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-abụ ndị ọchịchị nke ọchịchị eluigwe ahụ, ya bụ, Alaeze Chineke. Ọchịchị ahụ ga-ewepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. A ga-eme ka ihe ka ọtụtụ ná ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ n’ọdịnihu, ha enweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ụwa.—Luk 23:43.

Iji chịkọta ihe niile anyị kwurula, e nwere ọtụtụ ndị bụ́ mmụọ. Onye kacha n’ime ha bụ Jehova Chineke, Onye kere ihe niile dị ndụ. Iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ, bụ́ ndị Setan na-edu, gbakụtara Jehova azụ ma na-arụ ọrụ iji duhie ụmụ mmadụ. E wezụga ha, e nwere ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ dị nta ‘a zụtara’ ma ọ bụ a họọrọ n’ụwa na-aga eluigwe ịrụ ọrụ pụrụ iche. Buru nke a n’uche ka anyị tụlee onye e nwere ike ịgwa okwu n’etiti ndị bụ́ mmụọ na otú anyị kwesịrị isi na-agwa ya okwu.